Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA!

Ihe Atọ Ego Na-agaghị Azụtali

Ihe Atọ Ego Na-agaghị Azụtali

ỌTỤTỤ ndị na-agbalịsi ike ịzụta ihe ọ bụla ha nwere ike, ya sọkwa ya ya bụrụ na ha ma na a ga-achụ ha n’ọrụ ma ọ bụkwanụ na a ga-achụpụ ha n’ụlọ ha bi. Ha nwekwara ike chọọ ịzụ ihe ọ bụla aka ha ruru n’agbanyeghị na ha nụrụ na a ga-akwụsị ịkwụ ha ụgwọ ezumike nká.

Ọ bụ ụdị ndị ahụ ka ọnyà ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-amatakarị. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa ma na tiivi ma na redio na-ekwu na mmadụ kwesịrị ịrụ ụlọ ọgbara ọhụrụ, zụọ ụgbọala ọhụrụ, na uwe ndị pụtara ọhụrụ. Ọ bụrụgodị na i nweghị ego, ha na-agwa gị ka ị gaa biri ego zụọ ha. Otú ọtụtụ ndị si ele ya anya bụ: Ọ bụrụhaala na ha dị ka ndị ọzọ, ya sọkwa ya ya bụrụ na ha ji ụgwọ, nsogbu adịghị.

Ma ọ naghị egbu oge, ya efo ha n’anya. Otu akwụkwọ kwuru na mmadụ ibiri ego zụọ ihe maka na ibe ya na-azụ dị ka ebe mmadụ gara na-aṅụ igbó ka o wee chefuo ihe mere ya. Obi nwere ike ịdị onye ahụ mma mgbe ahụ, ma e mechaa anya ga-edo ya. Obi na-adịkwa mmadụ mma ma o biri ego gaa zụọ ihe aka ya na-erughị. Ma, mgbe o ruru n’ịkwụ ụgwọ ahụ, obi agaghị adị ya mma.

Baịbụl kwuru na “oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” abaghị uru. (1 Jọn 2:16) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ebe uche anyị dị bụ naanị n’ihe ego ga-azụtali, ọ ga-eme ka uche anyị ghara ịna-adị n’ihe ego na-agaghị azụtali. Ihe ndị ahụ bụkwanụ ihe ndị kacha mkpa ná ndụ. Ka anyị tụlee atọ n’ime ha.

1. EZINỤLỌ ỊDỊ N’OTU

Otu nwa agbọghọ bi n’Amerika aha ya bụ Sandra * kwuru na ihe na-adị papa ya mkpa mgbe niile bụ ọrụ ya na ego ọ na-akpata. O kwuru, sị: “E nweghị ihe anyị na-enweghị n’ụlọ anyị, ma anyị anaghị ahụ papa anyị anya. Mgbe niile, ọ nọ n’ụzọ. Ama m na ọ bụ ọrụ ya mere na ọ naghị enwe efe, ma anyị na ya kwesịrị ịna-anọ.”

Jụọ onwe gị, sị: Olee ihe ọ ga-abụ papa Sandra cheta echi ya akwaa mmakwaara? Otú ahụ mkpa ya niile bụ ego, ò na-enwe oge ya na nwa ya nwaanyị ji anọrị? Gịnị ka ndị ezinụlọ ya chọrọ ka ọ na-emere ha nke ego na-agaghị azụtali?

Amaokwu Baịbụl ndị ị ga-echebara echiche:

  • “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, e duhiewo ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.”—1 Timoti 6:10.

  • “Nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.”—Ilu 15:17.

Nke Bụ́ Eziokwu Bụ: Ego agaghị emeli ka ezinụlọ dịrị n’otu. Naanị ihe ga-eme ka ezinụlọ dịrị n’otu bụ nne na nna na ụmụ ha ịna-anọrị, nne na nna ana-emere ụmụ ha ihe na-egosi na ha hụrụ ha n’anya. —Ndị Kọlọsi 3:18-21.

2. OBI IRU ALA

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Sera kwuru na ihe mama ya na-agwakarị ya bụ ka ọ lụta di nwere ego, mụọkwa ezigbo ọrụ ka ọ ga-abụ a chọọ di ya a hụghị ya, ya enwee ihe ga-eme ka obi ruo ya ala. O kwuru na naanị ihe mama ya na-eche bụ ebe ọ ga-esi na-enweta ego.

Jụọ onwe gị, sị: Ebe ọ bụ na iche banyere echi adịghị njọ, olee ihe ndị ị na-eche banyere ọdịnihu? Olee otú ị ga-echeru banyere ọdịnihu ya abụrụ na ichegbuwela onwe gị? Olee otú mama Sera kwesịrị isi na-ele ego anya?

Amaokwu Baịbụl ndị ị ga-echebara echiche:

  • “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa, ebe nla na nchara na-erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-awabakwa zuo ohi.”—Matiu 6:19.

  • “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.”—Jems 4:14.

Nke Bụ́ Eziokwu Bụ: Ọ bụghị ịkpakọba ego ga-eme ka obi ruo mmadụ ala. A si ka e kwuwe, e nwere ike izuru ego mmadụ nwere. Ego anaghịkwa eme ka onye nwere ya ghara ịrịa ọrịa ma ọ bụ mee ka ọ ghara ịnwụ. (Ekliziastis 7:12) Baịbụl kwuru na ihe ga-eme ka obi ruo mmadụ ala bụ onye ahụ ịma banyere Chineke na nzube ya.—Jọn 17:3.

3. AFỌ OJUJU

Otu nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ na anọ aha ya bụ Chioma kwuru na nne na nna ya kuziiri ha na ihe ọ bụla ha nwere kwesịrị iju ha afọ. O kwukwara na mgbe ha na-eto, obi na-adị ya na ejima ya ụtọ n’agbanyeghị na e nweghị oké ihe ha nwere.

Jụọ onwe gị, sị: Gịnị mere na afọ anaghị eju ụfọdụ ndị ma ọ bụrụ na ha enweghị ihe niile ndị ọzọ nwere? A jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụkwanụ ụmụ gị otú i si ele ego anya, gịnị ka ha ga-ekwu?

Amaokwu Baịbụl ndị ị ga-echebara echiche:

  • “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:8.

  • “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Nke Bụ́ Eziokwu Bụ: Ego abụghị ihe niile. E nwere ihe ka ego na ihe e ji ya azụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Mmadụ ga-enwe afọ ajụjụ ná ndụ ma ọ chọta azịza ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa?

  • Olee ihe ọdịnihu ga-abụ?

  • Olee otú mụ na Chineke ga-esi adị ná mma?

Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ a. Obi ga-adị ha ụtọ inyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị ahụ.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.