Gaa n'Isiokwu

Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?

Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba. Baịbụl ekwughị na ego bụ ihe ọjọọ, o kwughịkwanụ na ọ bụ ego mere e ji nwee ọtụtụ ihe ọjọọ juru n’ụwa. Ndị mmadụ na-ekwukarị na “ego bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ niile,” ma nke a abụghị otú Baịbụl si kwuo ya, ọ na-emekwa ka a ghọtahie ihe Baịbụl kwuru. N’eziokwu, ihe Baịbụl kwuru bụ na ‘ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ niile.’ a​—⁠1 Timoti 6:​10, Bible Nsọ nke Union Version.

 Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ego?

 Baịbụl kwuru na ego na-egbo mkpa ma e jiri ya mee ihe bara uru. O nwedịrị ike ịbụ “ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ihe ọzọ bụ na Baịbụl jara ndị na-emesapụ aka mma, ego nwekwara ike iso n’ihe e ji emesapụ aka.​—⁠Ilu 11:⁠25

 N’otu oge ahụ, Baịbụl dọkwara aka nà ntị gbasara mmadụ iwere ịchụ ego ka ihe kacha mkpa ná ndụ. O kwuru, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.” (Ndị Hibru 13:⁠5) Ihe anyị mụtara ebe a bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ego bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, ma ọ bụ chọwa ịba ọgaranya. Kama nke ahụ, anyị ga-agbalị ka ihe ndị dị anyị mkpa anyị na-enweta ju anyị afọ, dị ka nri, uwe na ebe obibi.​—⁠1 Timoti 6:⁠8.

 Gịnị mere Baịbụl ji dọọ aka ná ntị gbasara ịhụ ego n’anya?

 Ndị anyaukwu agaghị enweta ndụ ebighị ebi. (Ndị Efesọs 5:⁠5) Otu ihe kpatara ya bụ na anyaukwu dị ka mmadụ ikpere arụsị. (Ndị Kọlọsi 3:⁠5) Ihe ọzọ bụ na, ka ndị anyaukwu na-agbalị inweta ihe ndị ha chọrọ, ha anaghị eme ihe ndị ha maara dị mma. Ilu 28:20 kwuru na “onye ọ dị ngwa ngwa ịba ọgaranya agaghị abụ onye aka ya dị ọcha.” Ha nwedịrị ike ime ihe ọjọọ ndị dị ka igwu mmadụ wayo, ịpụnara mmadụ ihe, ịtọrọ mmadụ, ma ọ bụ igbu mmadụ.

 Ọ bụrụgodị na ịhụ ego n’anya emeghị ka mmadụ kpawa àgwà ọjọọ, o nwere ike inwe nsogbu ndị ọzọ ọ ga-akpata. Baịbụl kwuru na “ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́.”​—⁠1 Timoti 6:⁠9.

 Olee otú ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara ego ga-esi baara anyị uru?

 Ọ bụrụ na anyị ejighị n’ihi ego kwụsị ime ihe ndị anyị ma na ọ dị mma nakwa ihe ndị na-atọ chineke ụtọ, anyị ga-enwe ùgwù, Chineke ga-elekwa anyị anya ọma ma na-akwado anyị. Chineke kwere ndị na-agbalịsi ike ime ihe ndị dị ya mma nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:​5, 6) O kwekwara anyị nkwa na “onye na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzi.”​—⁠Ilu 28:⁠20..

a Na Baịbụl ụfọdụ, otú e si sụgharịa amaokwu a bụ: “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.”