Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Jehova Echefubeghị M”

“Jehova Echefubeghị M”
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1922

  • ABỤ M ONYE: SPEN

  • NDỤ M BIRI: ABỤ M KATKIST

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo Bilbao, nke dị n’ebe ugwu Spen. Abụ m nwa nke abụọ n’ime ụmụ anọ nne na nna m mụrụ. Anyị niile bụ ezigbo ndị Katọlik, ana m ejekwa mas kwa ụbọchị. Mgbe m dị afọ iri abụọ na atọ, aghọrọ m onye nkụzi. Ọrụ nkụzi na-atọ m ụtọ, arụkwara m ya ruo afọ iri anọ. N’ime ihe niile m na-akụzi, nke kacha atọ m ụtọ bụ ịkụziri ụmụ akwụkwọ nkụzi chọọchị Katọlik. Ebe m bụ katkist, ihe m na-eme ná mgbede bụ ịkụziri ụmụ agbọghọbịa chọrọ ibido iri oriri nsọ gbasara oriri nsọ.

Emechara m lụọ di. Ma, mgbe mụ na ya biri afọ iri na abụọ, ọ nwụrụ, hapụrụ m ụmụ anọ ka m zụwa naanị m. Adị m afọ iri atọ na atọ mgbe ahụ. Agbalịrị m ka m jiri ihe m na-amụta na chọọchị anyị kasie onwe m obi, ma e nwere ọtụtụ ihe nọ na-enye m nsogbu n’obi. Ụfọdụ n’ime ha bụ: ‘Gịnị mere mmadụ ji anwụ anwụ ebe ọ bụ na Kraịst anwụọla n’ihi anyị? Gịnị mere anyị ji ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa ma ọ bụrụ na ndị ezi omume na-aga eluigwe?’ Ma, nke kacha enye m nsogbu bụ: ‘Ọ bụrụ na Chineke na-ekpe mmadụ ikpe mgbe onye ahụ nwụrụ, gịnị mere onye ahụ ga-eji esi n’eluigwe, pọgatrị ma ọ bụ ọkụ mmụọ gawa ebe a ga-ekpe ya ikpe ikpeazụ?’

Ajụrụ m ụfọdụ ndị ụkọchukwu anyị ajụjụ ndị ahụ. Otu onye n’ime ha sịrị m: “Amaghị m. Gaa jụọ bishọp anyị. Gịnị medịrị i ji ajụ ajụjụ niile a? Ọ̀ kwa i kweere na Chineke? I kwesịghị inye onwe gị nsogbu.” Ihe ndị ahụ o kwuru emeghị ka m kwụsị ịchọ otú m ga-esi mata nke bụ́ eziokwu. Amalitere m ịga ụka dị iche iche, ma nke ndị kwere na Chineke ma nke ndị na-ekweghị na Chineke. Ma, o nweghị nke zara m ajụjụ ndị ahụ nke ọma.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Mgbe m dị ihe karịrị afọ iri isii, otu nwa akwụkwọ dị afọ asaa gwara m ka m bịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ihe m nụrụ na ihe m hụrụ mgbe m gara, mere m obi ụtọ. Ma, ebe ọ bụ na anaghị m enwe ohere, mụ na Ndịàmà Jehova ahụkwaghị ọzọ. Mgbe afọ abụọ gachara, otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ m. Aha nke nwoke bụ Juan, nwunye ya abụrụ Maite. Bido mgbe ahụ gawa, ọ na-abụ m jụọ ha ajụjụ, ha ejiri Baịbụl zaa m ya. Ma, mgbe ọnwa atọ gachara, ha malitere ịmụrụ m Baịbụl.

 Ọ na-abụ ụbọchị ọ bụla anyị ga-amụ Baịbụl ruwe, obi na-atọ m ụtọ. Ana m ejikwa ụzọ Baịbụl atọ ka m mara ma ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu. N’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na e kpuchiri m aka n’anya kemgbe m na-aga ụka. O wutere m mgbe m chọpụtara na ihe m na-amụta na Baịbụl dị ezigbo iche n’ihe a kụziiri m na chọọchị. Ihe niile a gwụrụ m ike, o nyeghịkwa m ọnụ okwu.

Ama m na amụtala m eziokwu

Nwoke nke abụọ m mechara lụọ rịara ezigbo ọrịa ma nwụọ. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka m lara ezumike nká. M hapụkwara obodo Bilbao gaa bitụ ebe ọzọ. Juan na Maite kwagakwara ebe ọzọ. N’oge ahụ, emere m ihe m na-ekwesịghị ime. Akwụsịrị m ịmụ Baịbụl. Ma n’ime obi m, ama m na amụtala m eziokwu. Ọ pụghịkwa m n’obi.

Mgbe ihe dị ka afọ iri abụọ gachara, ya bụ, mgbe m dị afọ iri asatọ na abụọ, Juan na Maite lọghachiri n’obodo Bilbao ma bịa n’ụlọ m otu ụbọchị. Obi dị m ụtọ mgbe m hụrụ ha. M ghọtara ozugbo na Jehova echefubeghị m. Ha bidoghachiri ịkụziri m Baịbụl. Juan na Maite nweere m ndidi n’ihi na mgbe ụfọdụ, m na-ajụghachi ha ajụjụ ha zarala m ọtụtụ ugboro. Ihe ahụ́ m chọrọ bụ ka a na-agwa m ihe Baịbụl kwuru ugboro ugboro ka obi m pụọ n’ihe a kụziiri m na chọọchị. Ihe ọzọ bụkwa na m chọrọ ka ihe niile doo m anya ka m nwee ike ịkọwara ndị enyi m na ndị ezinụlọ m ihe Baịbụl kwuru.

Ụbọchị obi kacha tọọ m ụtọ ná ndụ bụ ụbọchị e mere m baptizim ná mgbakọ Ndịàmà Jehova. Adị m afọ iri asatọ na asaa mgbe ahụ. Tupu e mee mụ na ndị ọzọ baptizim n’ụbọchị ahụ, otu okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova si na Baịbụl gwa anyị okwu. Ndị niile bịara mgbakọ ahụ nọkwa na-ege ntị. Otú o si kwuo okwu ahụ mere ka anya mmiri gbaa m. Ọ dị m ka Jehova ò si n’ọnụ ya na-agwa m okwu. Mgbe e mechara m baptizim, ọtụtụ Ndịàmà Jehova bịara kelee m n’agbanyeghị na ọ bụghị ha niile ka m ma.

URU NDỊ M RITERELA:

Kemgbe ụwa m, ama m na Jizọs Kraịst bụ “ụzọ.” (Jọn 14:6) Ma, ịmụ Baịbụl emeela ka m mata Jehova, onye Jizọs du anyị na-agakwuru. Ugbu a, m kpewezie ekpere, ama m na ọ bụ ezigbo Nna m na ezigbo Enyi m ka m na-agwa okwu. N’eziokwu, ndụ m gbanwere mgbe m gụrụ akwụkwọ isiokwu ya bụ Bịaruo Jehova Nso. * Oge mbụ m gụrụ ya, m gụchara ya n’otu abalị. Ihe akwụkwọ ahụ kwuru gbasara otú Jehova si eme ebere ruru m n’obi.

M cheta mbọ niile m gbara ka m mata okpukpe nke na-akụzi eziokwu, ihe na-agbata m n’obi bụ ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu.” (Matiu 7:7) Ebe ọ bụ na a zaala m ajụjụ niile na-agbagwoju m anya, obi na-atọ m ezigbo ụtọ ịkụzikwara ndị ọzọ ihe m mụtara.

Adị m afọ iri itoolu ugbu a, ma m ka nwere ọtụtụ ihe m ga-amụta gbasara Jehova. Mgbe ọ bụla m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ọ na-adị m ka m̀ gara oriri pụrụ iche n’ihi ọtụtụ ihe ọma m na-amụta nakwa ezigbo ụmụnna m m na-ahụ n’ebe ahụ. M na-atụsi anya ike mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs ka m bidokwa kụziwe nkụzi. (Mkpughe 21:3, 4) Ihe m kacha atụsi anya ya ike bụ mgbe ndị m hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ n’ihi na m ga-eso kụziere ha Okwu Chineke. (Ọrụ Ndịozi 24:15) N’oge ahụ, m ga-agwa ha ihe ọma Jehova meere m mgbe m karala nká.

^ para. 15 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.