Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Achọghị M Ịnwụ

Achọghị M Ịnwụ
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1964

  • ABỤ M ONYE: ỊNGLAND

  • NDỤ M BIRI: ATỤỤRỤ M IME ỌKWÀ, BIEKWA NDỤ ỌJỌỌ MGBE M KA NA-ETO ETO

NDỤ M BIRI NA MBỤ

A mụrụ m na Padintin, dị na Lọndọn, Ịngland. Mụ na ụmụnne m ndị nwaanyị atọ tọrọ m na mama anyị bi. Papa m bụ onye aṅụrụma, ọ naghị anọta n’ụlọ.

Mgbe m dị obere, mama m kụziiri m ịna-ekpe ekpere n’abalị ọ bụla. Enwere m obere Baịbụl nwere naanị akwụkwọ Abụ Ọma. M bịara na-abụ ya ka abụ. N’otu abalị, echetara m otu ihe m gụtara n’otu akwụkwọ nke mere ka m chee ezigbo echiche. Ihe e dere n’akwụkwọ ahụ bụ: “Otu ụbọchị anyị ga-anwụ.” Ihe a mere ka ụra pụọ m n’anya ebe m na-eche banyere ihe echi ga-abụ. M sịrị na ‘a ga-enwerịrị ihe mere anyị ji dị ndụ.’ M bịara jụwa onwe m sị: ‘Gịnị mere e ji kee m?’ Achọghị m ịnwụ.

M bidoro nwewe mmasị n’anwansi. M chọwara otú m ga-esi soro ndị nwụrụ anwụ kwuo okwu. M sooro ụmụ akwụkwọ ibe m gaa n’ebe a na-eli mmadụ, leekwa fim ndị na-atụ ezigbo ụjọ. Ime ihe ndị a na-atọ anyị ụtọ ma na-atụkwa anyị ụjọ.

M bidoro ịkpa àgwà ọjọọ mgbe m dị afọ iri. M bidoro ịṅụ sịga, o teghịkwa aka ya erie m ahụ́. M mechakwara ṅụwa ìgbó. Mgbe m na-erule afọ iri na otu, aṅụwala m mmanya na-aba n’anya. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị atọ m ụtọ, otú o si egbu m ma m ṅụọ ya na-adị m mma. Ịgụ egwú na ịgba egwú na-adịkwa m mma. Mgbe ụfọdụ, m na-amịpụ gaa ebe a na-eme oriri na nkwari n’abalị. M na-ezorokwa ezoro bata tupu chi abọọ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ chi bọọ ike agwụ m, mụ ahapụ ịga akwụkwọ. Ụbọchị m ga-agakwanụ aga, m na-eme, a mụtụ ihe, mụ agaa ṅụrụtụ mmanya.

N’ule ikpeazụ anyị lere n’ụlọ akwụkwọ, adabara m afọ. Ezigbo iwe were mama m maka ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ matara na àgwà m eretọọla. Mụ na ya sere ezigbo okwu, mụ esi n’ụlọ gbapụ, gaa mụ na otu enyi m nwoke aha ya bụ Tony ebiri. Ọ bụ onye Rasta, bụrụkwa onye ohi. Ọ na-ere ọgwụ ike, a makwa ya ama ka onye ike. O teghị aka, ya atụwa m ime. Mgbe m dị naanị afọ iri na isii, amụrụ m nwa anyị nwoke.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

Mgbe mbụ m hụrụ Ndịàmà Jehova bụ mgbe m bi n’ebe gọọmentị rụrụ maka ụmụ agbọghọ tụụrụ ime ọkwà na ụmụ ha. E nyere m otu ọnụ ulọ n’ebe ahụ. E nwere ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova na-abịakarị ebe ahụ akụziri ụfọdụ ụmụ agbọghọ tụkwaara ime ọkwà, Baịbụl. Otu ụbọchị, m kpebiri iso ha mụọ ihe. Ihe m bu n’obi soro ha bụ ka m gosi Ndịàmà Jehova ahụ na ihe ha na-akụzi abụghị eziokwu. Ma, ha si na Baịbụl zaa m ajụjụ niile m jụrụ ha, ya edoo m anya. Ha nwere obioma. Otú ha si kpaso m àgwà mere ka m kweta ka ha mụwakwara m Baịbụl.

Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka ndụ m gbanwee. Kemgbe m bụ nwata, m na-atụ ụjọ ọnwụ. Ma, m bịara mụta na Jizọs kwuru na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) M mụtakwara na ihe banyere m na-emetụ Chineke n’obi. (1 Pita 5:7) Ihe e dere na Jeremaya 29:11 metụrụ m n’ahụ́. Ebe ahụ sịrị: “‘N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma ihe m na-echere unu,’ ka Jehova kwuru, ‘echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi, ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya.’” M bịara kweta na m nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ụwa.—Abụ Ọma 37:29.

Ndịàmà Jehova gosiri m na ha hụrụ m n’anya. Mgbe mbụ m gara ọmụmụ ihe ha, obi tọrọ m ụtọ n’ihi otú onye ọ bụla si nabata m ma mee ka ahụ́ ruo m ala. (Jọn 13:34, 35) Ndị chọọchị m na-agabu anaghị eme m otú a. Ndịàmà Jehova nabatara m. Ha akpapụghị m iche ka onye ọjọọ. Ha na-abịa eleta m n’ebe m bi, na-ewetakwara m ihe ndị dị m mkpa. Obi bịara ruo m ala, ya adịzie m ka ànyị bụ otu ezinụlọ hụrụ ibe ha n’anya.

Ka m na-amụ Baịbụl, m chọpụtara na m kwesịrị ịgbanwe otú m si ebi ndụ ma biwe ndụ otú Chineke chọrọ. O siiri m ike ịkwụsị ịṅụ sịga. M chọpụtakwara na egwú ụfọdụ m na-ege na-eme ka ịṅụ ìgbó na-agụsi m ike. Ọ bụ ya mere m ji gbanwee ụdị egwú ndị m na-ege. Ebe ọ bụ na m chọrọ ịkwụsị ịṅụ mmanya, m kwụsịrị ịga oriri na nkwari n’abalị n’ihi na ọ ga-eme ka ịṅụ mmanya gụwa m. M hapụkwara ndị mụ na ha na-akpabu, mụ na ndị na-efe Chineke ana-akpazi, ka ha nyere m aka ịna-ebi ndụ dị mma.—Ilu 13:20.

Tony na Ndịàmà Jehova nọkwa na-amụ Baịbụl mgbe ahụ. Ha ji Baịbụl zaa ya ajụjụ niile ọ jụrụ ha, ya edookwa ya anya na ihe ọ na-amụ bụ eziokwu. Ọ kwụsịrị ndụ ọjọọ ọ na-ebibu. Ya na ndị ike ibe ya kwụsịrị ịkpa, ya akwụsịkwa ime mpụ na ịṅụ ìgbó. Ebe anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, anyị kpebiri ịkwụsị àgwà ọjọọ anyị ma bikọta ọnụ ka anyị nwee ike ịgbakọ aka zụọ nwa anyị nwoke. Ọ bụ ya mere anyị ji lụọ n’afọ 1982.

“Anaghịzi m echegbu onwe m n’abalị banyere ihe echi ga-abụ ma ọ bụ na-atụ ụjọ ọnwụ”

M chọrọ n’Ụlọ Nche na Teta! * ebe a kọrọ gbasara ndị birila ụdị ndụ ọjọọ m na-ebi ma mechaa gbanwee. Otú ha si gbaa mbọ kwụsị àgwà ndị ahụ nyeere m aka. Ha mere ka m na-agbasi mbọ ike ịkwụsị ndụ ọjọọ m. M nọgidere na-arịọ Jehova ka ọ ghara ịkwụsị inyere m aka. N’ọnwa Julaị afọ 1982, e mere mụ na Tony baptizim, anyị aghọọ Ndịàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA

Mbọ m gbara ka mụ na Jehova Chineke bụrụ enyi zọrọ m ndụ. Jehova enyekwarala anyị aka n’oge ihe siiri anyị ike. Anyị amụtala ịtụkwasị ya obi mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị. E nwebeghị mgbe ọ hapụrụ anyị.—Abụ Ọma 55:22.

Obi dịkwa m ụtọ na enyerela m nwa anyị nwoke na nwa anyị nwaanyị aka ha amata Jehova ka mụnwa. Obi na-atọkwa m ụtọ ugbu a ka m na-ahụ ụmụ nke hanwa ka ha na-amatakwa Chineke.

Anaghịzi m echegbu onwe m n’abalị banyere ihe echi ga-abụ ma ọ bụ na-atụ ụjọ ọnwụ. N’izu ọ bụla, mụ na Tony na-aga n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-agba ha ume ka okwukwe ha sikwuo ike. Anyị na-eso ha na-akụziri ndị ọzọ na ọ bụrụ na ha enwee okwukwe na Jizọs, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi.

^ para. 17 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.