Ọrụ Ndịozi 24:1-27

  • Ebubo ndị e boro Pọl (1-9)

  • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu Feliks (10-21)

  • E yigharịrị ikpe Pọl ruo afọ abụọ (22-27)

24  Mgbe abalị ise gara, Ananayas bụ́ nnukwu onye nchụàjà+ bịara Sizaria, ya na ndị okenye ụfọdụ na otu onye ma otú e si ekwu okwu n’ihu ọha,* onye a na-akpọ Tetọlọs. Ha bịara ịgwa Gọvanọ Feliks ihe ha sị na Pọl mere.+  Mgbe a gwara Tetọlọs ka o kwuo okwu, ọ malitere ibo Pọl ebubo n’ihu gọvanọ, sị: “Feliks Onye Ukwu, i meela ka udo dịrị n’obodo anyị. Otú dị mma i si achị emeekwala ka anyị na-enwe ọganihu.  Anyị na-ekele gị mgbe niile n’ebe niile maka ihe ndị a ị na-eme.  Ma, ka m ghara igbukwu gị oge, biko, nwee ndidi ma gee anyị ntị ka anyị gbuo okwu anyị nkenke.  Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye ọjọọ.*+ Ọ na-eme ka ndị Juu niile nọ n’ụwa na-emegide ndị ọchịchị.+ Ọ bụkwa onye ndú òtù a na-akpọ ‘ndị Nazaret.’+  Ọ nwakwara imerụ ụlọ nsọ, anyị ejide ya.+ 7 * ——  Ị gbaa ya ajụjụ, ị ga-achọpụta na ihe a niile anyị na-ekwu bụ eziokwu.”  Ndị Juu sokwa na-ekwusi ike na ihe ndị a bụ eziokwu. 10  Mgbe gọvanọ ahụ kweere Pọl n’isi ka o kwuo okwu, ọ sịrị: “Ama m nke ọma na ị na-ekpere mba a ikpe kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ bụ ya mere obi ji dị m ụtọ ugbu a ịzara ọnụ m n’ihu gị.+ 11  Ọ karịbeghị abalị iri na abụọ m gara Jeruselem ka m fee Chineke. Ị chọọ, i nwere ike ịchọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu.+ 12  O nweghị mgbe ha hụrụ m ka mụ na onye ọ bụla na-arụ ụka n’ụlọ nsọ ma ọ bụ ka m na-eme ka ndị mmadụ na-akpa aghara n’ụlọ nzukọ ọ bụla ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ na Jeruselem. 13  Ha agaghịkwa egosili gị otú ebubo ndị a ha na-ebo m si bụrụ eziokwu. 14  Ma, ekwetara m na m na-eso ụzọ ahụ ha na-akpọ òtù. Ọ bụ otú m si efe Chineke nna nna m hà,+ n’ihi na m kweere ihe niile Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru.+ 15  Enwekwara m olileanya otú ndị a nwere, na Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.+ 16  Ọ bụ ya mere m ji agbasi mbọ ike mgbe niile ka akọnuche m ghara ịma m ikpe, ka m ghara imebi iwu Chineke ma ọ bụ iwu mmadụ.+ 17  Mgbe ọtụtụ afọ gachara, agara m Jeruselem ka m nye onyinye a ga-eji nyere ndị obodo m aka,+ nyekwa ihe ndị a ga-eji chụọrọ Chineke àjà. 18  Ka m nọ na-eme ihe ndị a, ha hụrụ m n’ụlọ nsọ mgbe m sacharala onwe m otú iwu kwuru,+ ma ndị mmadụ agbakọtaghị, akpataghịkwa m ọgba aghara. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Juu si ná mpaghara Eshia bịa nọ ebe ahụ. 19  A sịkwa na o nwere ihe ọjọọ ha hụrụ m mere, ha gaara abịa n’ihu gị ugbu a kwuo ya.+ 20  Ma ọ bụkwanụ, ka ndị nọ ebe a kwuo ihe ọjọọ ndị Sanhedrin chọpụtara m mere mgbe ha na-ekpe m ikpe. 21  Naanị ihe ha ga-asị na m mere bụ na m kwuru, sị: ‘A na-ekpe m ikpe taa maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’”+ 22  Ma, ebe Feliks ma nke bụ́ eziokwu gbasara Ụzọ Onyenwe anyị,+ o yigharịrị ikpe ha wee sị: “M ga-ekpebi okwu a mgbe ọ bụla ọchịagha Laịsias bịara.” 23  Ọ gwakwara onyeisi ndị agha ahụ ka ọ kpọchie Pọl, ma, ka ọ hapụ ya ka ọ na-eme ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime, nakwa ka o kwe ka ndị enyi ya na-abịa enyere ya aka. 24  Mgbe abalị ole na ole gara, Feliks na Drusila nwunye ya, bụ́ onye Juu, bịara. O zikwara ka a kpọọ Pọl. Mgbe o rutere, o gere ya ntị ka ọ na-agwa ya gbasara mmadụ ikwere na Kraịst Jizọs.+ 25  Ma, ka ọ na-ekwu gbasara mmadụ ime ezi omume na ijide onwe ya nakwa ikpe a ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu,+ Feliks tụwara ụjọ ma sị ya: “Ka gawagodị. M ga-ezi ozi ka a kpọọ gị ọzọ ma m nweta ohere.” 26  Ma, ọ nọkwa na-atụ anya ka Pọl nye ya ego. N’ihi ya, ọ kpọrọ ya ugboro ugboro, ya na ya ana-akparịta ụka. 27  Ma, mgbe afọ abụọ gachara, Pọshiọs Festọs nọchiri Feliks. Ma, Feliks hapụrụ Pọl n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ chọrọ ịzụrụ ụtọ ndị Juu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “otu ọkàiwu.”
Ma ọ bụ “onye okwu na ụka.”
Gụọ A3.