Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-emetere Anyị Ebere?

Chineke Ọ̀ Na-emetere Anyị Ebere?

IHE IHE NDỊ CHINEKE KERE NA-AKỤZIRI ANYỊ

Ihe e ji ama onye na-emetere ndị ọzọ ebere bụ na “ihe na-eme ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi, na-ewutekwa ya nke ukwuu. Onye ahụ na-adị eche otú ọ ga-adị ma ọ bụrụ ya ka ihe mere onye ọzọ mere.” Otu dọkịta aha ya bụ Rick Hanson kwuru na “imetere ndị ọzọ ebere dị anyị n’ọbara.”

CHEGODỊ IHE A: Gịnị mere mmadụ ji emetere ibe ya ebere karịa otú ihe ndị ọzọ e kere eke si emetere ibe ha? Baịbụl kwuru na Chineke kere ụmụ mmadụ n’oyiyi ya. (Jenesis 1:26) Ihe ọ pụtara bụ na e kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-akpa àgwà ọma ka Chineke. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị meere ndị ọzọ ihe ọma n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi, anyị na-eṅomi Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke.—Ilu 14:31.

BAỊBỤL NA-AKỤZI NA CHINEKE NA-EMETERE ANYỊ EBERE

Chineke na-emetere anyị ebere, ọ na-ewutekwa ya ma ọ hụ ka anyị na-ata ahụhụ. Ndị Izrel oge ochie tara ezigbo ahụhụ mgbe ha na-agba ohu n’Ijipt, taakwa ezigbo ahụhụ n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ. Baịbụl kwuru gbasara ha, sị: “N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.” (Aịzaya 63:9) Ị̀ hụrụ na ọ bụghị naanị na Chineke hụrụ ahụhụ ha na-ata? O wutekwara ya. Chineke sịrị: “M maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.” (Ọpụpụ 3:7) O kwukwara, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.” (Zekaraya 2:8) Ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-emegbu anyị, ọ na-ewute Jehova.

Ọ bụrụgodị na obi ana-ama anyị ikpe, anyị echeekwa na anyị erughị eru ka Chineke metere anyị ebere, Baịbụl mesiri anyị obi ike na “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (1 Jọn 3:19, 20) Chineke ma anyị karịa ka anyị ma onwe anyị. Ọ ma ọnọdụ anyị niile, echiche anyị, na otú obi dị anyị. Ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.

Anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere anyị aka, nye anyị amamihe, meekwa ka obi ruo anyị ala ebe anyị ma na ọ na-agbatara ndị nọ ná nsogbu ọsọ enyemaka

Baịbụl kwuru, sị:

  • “Ị ga-akpọku Jehova, ya aza; ị ga-eti mkpu enyemaka, ya asịkwa, ‘lee m!’”—AỊZAYA 58:9.

  • “‘N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma ihe m na-echere unu,’ ka Jehova kwuru, ‘echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi, ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya. Unu ga-akpọku m, bịakwa kpekuo m ekpere, m ga-egekwa unu ntị.’”—JEREMAYA 29:11, 12.

  • “Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị. Ọ̀ bụ na ọ dịghị n’akwụkwọ gị?”—ABỤ ỌMA 56:8.

CHINEKE MA NA ANYỊ NỌ, Ọ NA-AGHỌTA ANYỊ, Ọ NA-EMETEKWARA ANYỊ EBERE

Ịmata na Chineke na-emetere anyị ebere ò nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu anyị? Legodị ihe mere otu nwaanyị aha ya bụ Maria:

Ọ sịrị: “Mgbe ọrịa kansa gburu nwa m nwoke dị afọ iri na asatọ, o wutere m. M hụrụ na ụwa a siri ezigbo ike, jupụtakwa n’ahụhụ. M nọkwa na-ewere Jehova iwe maka na o meghị ka nwa m nwoke gbakee.

“Ka afọ isii gachara, otu ezigbo enyi m mụ na ya so efe Jehova gere m ntị ka m nọ na-akọrọ ya na Jehova ahụghị m n’anya. O gere m ntị awa abụọ n’ekwughị ihe ọ bụla. Mgbe m kwuchara, ọ gụụrụ m amaokwu Baịbụl ruru m n’obi. Ọ gụrụ 1 Jọn 3:19, 20. Ebe ahụ sịrị: ‘Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.’ Ọ gwara m na Jehova na-aghọta ọnọdụ anyị nọ na ya.

“N’agbanyeghị ya, o siiri m ike ịkwụsị iwe ahụ ji m. M gụrụ Abụ Ọma 94:19. Ebe ahụ kwuru, sị: ‘Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m. Nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.’ Ọ bịara dị m nnọọ ka ọ bụ mụnwa ka e deere amaokwu ndị ahụ. M chọpụtaziri na ịkọrọ Jehova nsogbu m na-eme ka obi ruo m ala ebe m ma na ọ na-anụ olu m, na-aghọtakwa ọnọdụ m.”

Ịmara na Chineke na-aghọta anyị nakwa na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi na-eme ka obi ruo anyị ala. Ma, gịnị mekwaranụ ahụhụ ji ju ebe niile? Chineke ò ji ha na-ata anyị ahụhụ maka ihe ndị anyị metere? Chineke ọ̀ ga-akwụsị ahụhụ niile anyị na-ata? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.