Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi

Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi

IHE MERE O JI ESI IKE

  • Nwa gị nwoke na-akpa àgwà gosiri na ọ dị mpako n’agbanyeghị na ọ ka dị naanị afọ iri.

  • Ọ chọrọ ka onye ọ bụla na-akwanyere ya ùgwù.

‘I nwere ike ị na-asị, oleedị ihe na-eme nwa a? M chọrọ ka obi na-adị ya mma, ma, ọ bụghị ka o chewe na ya ka ndị ọzọ mma.’

Ma, è nwere ike ịkụziri nwata ịdị umeala n’obi n’emeghị ka o chewe na o nweghị ihe ya dị mma ya?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

N’oge ndị na-adịchabeghị anya, a gbara ndị nne na nna ume ka ha na-emere ụmụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ ma na-aja ha mma mgbe niile, ọ bụrụgodị na o nweghị ihe ha mere e kwesịrị iji jaa ha mma. A gwakwara ha ka ha ghara inye ụmụ ha ntaramahụhụ ma ọ bụ dọọ ha aka ná ntị. Ha kwuru na ọ bụrụ na a na-apa ụmụaka apa otú ahụ, ọ ga-eme ka ha too bụrụ ndị obi na-adị ụtọ mgbe niile. Ma, olee ihe ụdị ọzụzụ a kpatarala? Akwụkwọ aha ya bụ Generation Me kwuru, sị: “Kama ime ka obi na-adị ụmụaka mma, ụdị ọzụzụ a emeela ka isi na-ebu ha, ha abụrụkwa ndị na-eche naanị gbasara onwe ha.”

Ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị ahụ a na-ajakarị mma n’enweghị isi na ọdụ, na-etolite ghọọ ndị ọ na-esiri ike ịma ihe ha ga-eme ma ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya, ma ọ bụkwanụ ma a katọọ ha. Ebe ọ bụ na a kụziiri ha ịna-achọ naanị ọdịmma nke onwe ha, ọ na-esiri ha ike ha na ndị ọzọ ịnọgide na-adị ná mma. Nke a akpatarala ọtụtụ n’ime ha nchekasị na ịda mba n’obi.

Ihe na-eme ka ụmụaka bụrụ ndị obi na-adị mma ma ha too abụghị ịna-eto ha mgbe niile, kama ọ bụ hanwa ime ihe ndị bara uru. Ịbụ onye onwe ya juru afọ naanị ezughị. Ha kwesịrị ileru anya ala mụọ ihe ha chọrọ ime ma jiri aka ha na-eme ya ruo mgbe ha mụtara ya nke ọma. (Ilu 22:29) Ha kwesịkwara ịna-achọ ọdịmma ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Iji melie ihe ndị a, ha kwesịrị ịdị umeala n’obi.

IHE I NWERE IKE IME

Jaa ha mma mgbe o kwesịrị ka a jaa ha mma. Ọ bụrụ na nwa gị nwaanyị e mee nke ọma n’ule, jaa ya mma. Ọ daa n’ule, a sịla na ọ bụ onye nkụzi ya kpatara ya. Kama ime otú ahụ, nyere ya aka ka o mee nke ọma n’oge ọzọ. Jaa ya mma naanị mgbe o mere ihe dị mma. Ọ ga-eme ka ọ mụta ịdị umeala n’obi.

Dọọ nwa gị aka ná ntị mgbe o kwesịrị. Nke a apụtaghị na ị ga na-aba mba n’ihe ọ bụla nwa gị mejọrọ. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ma, baara ya mba ma ọ kpaa àgwà ọjọọ. Ma i meghị otú ahụ́, àgwà ọjọọ ga-amara ya ahụ́.

Ọ̀ bụrụkwanụ na ị chọpụta na nwa gị nwoke na-etukarị ọnụ? Ị gba ya nkịtị nwere ike ime ka ọ dịrị mpako, meekwa ka ndị mmadụ na-eze ya eze. N’ihi ya, mee ka ọ mata na itu ọnụ abụghị ezigbo àgwà nakwa na o nwere ike ime ka a kparịwa ya. (Ilu 27:2) Meekwa ka ọ mara na onye maara ihe anaghị eji ihe ndị ọ ga-emeli na-etu ọnụ. I si otú a jiri ịhụnanya na-agbazi nwa gị, ọ ga-eme ka o jiri obi ụtọ mụta ịdị umeala n’obi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 23:12.

Kwadebe nwa gị maka ihe isi ike ndị dị ná ndụ a. Imere nwatakịrị ihe ọ bụla ọ chọrọ nwere ike ime ka o chee na ọ bụ ihe ruuru ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị chọrọ ka ị zụtara ya ihe ị na-agaghị azụtali, mee ka ọ mata uru ọ bara mmadụ ikowe akpa ya ebe aka ya ga-eru. Ọ bụrụ na e nwere ihe mere iji kagbuo mkpapụ unu chọrọ ime maka ntụrụndụ, i nwere ike ime ka ọ mata na ọ bụghị mgbe niile ka ihe na-agacha otú a tụrụ anya ya. Kọwakwara ya ihe ndị ị na-eme ma ihe dawa ájá ájá otú ahụ. Kama ị na-apa ụmụ gị apa, i kwesịrị ịkwadebe ha maka ihe isi ike ndị ha ga-ezute ma ha too.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 29:21.

Kụziere nwa gị ịna-emesapụ aka. Mee ka nwa gị ghọta na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Olee otú ị ga-esi eme ya? Gị na nwa gị nwere ike ide aha ndị chọrọ ka e nyere ha aka gaa ahịa, buga ha ebe ha na-aga, ma ọ bụ rụziere ihe. Gị na ya soro ma ị gawa imere ha ihe ndị ahụ. Mee ka nwa gị hụ na ọ na-atọ gị ụtọ inyere ndị ọzọ aka. Ihe a bụ otú kacha mma ị ga-esi kụziere nwa gị ịdị umeala n’obi, ya bụ, ịna-eme ya eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 6:38.