Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | NDỤ GỊ Ọ̀ DỊ OTÚ Ị CHỌRỌ KA Ọ DỊRỊ?

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Ị Gaghị Agbanweli Ihe Ụfọdụ

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Ị Gaghị Agbanweli Ihe Ụfọdụ

E NWERE ihe ndị nwere ike ime mmadụ, ha aghasaara ya ihe ọ chọrọ ime ná ndụ. Mmadụ nwere ike ịna-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala, di na nwunye nwere ike ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye mmadụ hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ bụrụ na ihe mmadụ na-agaghị agbanweli emee, o nwere ike ịnọ na-ele n’anya n’anya. Ma, gịnị ga-enyere anyị aka ka nsogbu ọ bụla bịaara anyị ghara ịnyịgbu anyị?

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA PỌL

Pọl onyeozi gara ebe dị iche iche kwusaa ozi ọma. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ na-anụ ọkụ n’obi. Ma, ọ kwụsịrị ịga ebe dị iche iche ruo afọ abụọ n’ihi na ndị agha bịara na-eche ya nche ka ọ ghara ịpụ apụ n’agbanyeghị na o nweghị ihe o mere. Kama ịnọ kwawa ụwa ya, o mere ihe o nwere ike ime. Ihe ọ na-eme bụ ịkasi ndị ọ bụla bịara ịhụ ya obi ma jiri Akwụkwọ Nsọ na-akụziri ha gbasara Chineke. Ọ nọkwa otu ebe ahụ dee akwụkwọ ozi ụfọdụ anyị na-agụ na Baịbụl taa.—Ọrụ Ndịozi 28:30, 31.

OTÚ ANJA SI ENYERE ONWE YA AKA

Anyị chetara na ọrịa Anja anaghị ekwe ya pụta èzí. Anja kwuru, sị: “Ndụ m gbanwere mgbe a gwara m na m na-arịa kansa. Akwụsịrị m ọrụ na ihe ndị ọzọ m na-emebu ka m ghara ịtụkwasị ọrịa ọzọ n’elu nke m na-arịa.” Gịnị na-enyere Anja aka idi nsogbu ya? O kwuru, sị: “Ihe m mụtara bụ ịna-eme ihe kwere m omume. Ahaziri m ihe ndị dị m mkpa ma jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ha. Otú a m si hazie onwe m emeela ka m na-emere onwe m ihe ụfọdụ.”

“Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya.” —Ndị Filipaị 4:11

IHE I NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na e nwere ihe ụfọdụ bịaara gị nke ị na-agaghị agbanweli, i nwere ike ime ihe ndị a:

  • Na-eme ihe ndị ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, ị gaghị ekwuli otú ahụ́ ga-adị gị echi, ma ị ka nwere ike ịna-emega ahụ́, na-eri ezigbo nri, na-ezukwa ike nke ọma.

  • Kpebie ihe ndị ị ga-achọ ime ná ndụ, chọpụtakwa otú i nwere ike isi jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ha. N’ụbọchị ọ bụla, gbalịa mee ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ime ihe i kpebiri.

  • Họrọ ụmụ obere ihe ị ga na-eme. I nwere ike ịna-ehicha ihe ụfọdụ na kichin, na-asakwa efere. Gbalịakwa na-eji ejiji dị mma. Ihe ndị a bụ obere ihe. Ma, ime ha ga na-eme gị obi ụtọ na o nwere ihe ị ga-emeli. N’ụtụtụ ọ bụla, buru ụzọ mee ihe ndị kacha dị gị mkpa.

  • N’agbanyeghị ụdị ọnọdụ ị nọ, e nwere ihe ụfọdụ i nwere ike ịmụta na ya. Dị ka ihe atụ, ọnọdụ ị nọ nwere ike inyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi na-edi nsogbu ndị i nwere. I nwekwara ike iji ihe ị mụtara kụziere ndị ọzọ otú ha ga-esi na-edi nsogbu nke ha.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ihe niile bịaara gị ka ị ga-agbanweli, ma ị ga-ekpebili ihe ị ga-eme n’ọnọdụ ọ bụla ị nọ na ya.