Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | NDỤ GỊ Ọ̀ DỊ OTÚ Ị CHỌRỌ KA Ọ DỊRỊ?

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Obi Nwere Ike Ịna-ajọ Mmadụ Njọ

Ihe Mere O Ji Ara Ahụ́: Obi Nwere Ike Ịna-ajọ Mmadụ Njọ

Ọ̀ NA-EME ị nọrọ mgbe ụfọdụ, obi ana-ajọ gị njọ ma ọ bụ ezigbo iwe ana-ewe gị n’ihi ihe ụfọdụ merenụ? Ị gaghị enweli ike ime ihe ndị dị gị mkpa ma ọ bụrụ na i kwe ka obi na-ajọkarị gị njọ. Gịnị ka i nwere ike ime gbasara ya? *

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA DEVID

Ihe ụfọdụ mere Eze Devid mere ka obi koro ya n’elu, e nwekwara ihe ndị mere ka obi gbawaa ya. Ma, gịnị nyeere ya aka ka ọ ghara ịda mbà? Ọ hapụụrụ Chineke nsogbu ya niile. (1 Samuel 24:12, 15) O dekwara otú obi dị ya ede. O jighịkwa ekpere egwu egwu n’ihi na o nwere okwukwe na Chineke. *

OTÚ GREGORY SI ENYERE ONWE YA AKA

Anyị kwuburu na nsogbu Gregory bụ na obi na-ekoro ya n’elu mgbe niile. O kwuru, sị: “Ana m echegbukarị onwe m, ọ rakwara m ahụ́ nkwụsị.” Gịnị nyeere ya aka? O kwuru, sị: “Nwunye m na ndị enyi m nyeere m aka inweta onwe m. Agakwara m hụ dọkịta, ya akọwakwuoro m banyere nsogbu m. Mgbe m gbanwere ihe ụfọdụ ná ndụ m, nsogbu m belatara. Ọ bụ eziokwu na nsogbu m akwụsịchabeghị, ma amarala m ihe na-akpatakarị ya na ihe m ga na-eme ka m nweta onwe m.”

“Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.”—Ilu 17:22

IHE I NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na ị na-echegbukarị onwe gị ma ọ bụ na obi na-ajọkarị gị njọ, i nwere ike ime ihe ndị a:

  • Dee otú obi na-adị gị n’akwụkwọ.

  • Kọọrọ onye ezinụlọ unu ma ọ bụ enyi gị otú obi dị gị.

  • Ewerela ya na o nweghị ihe ị ga-emeli gbasara nsogbu gị. I nwere ike ịjụ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ikwu na ọ bụ ya mere obi ji adị m otú a ọ na-adị m?’

  • Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka i chegbuwe onwe gị. Adịkwala na-ewete iwe aka. Kama, na-eme ihe ndị ọzọ bara uru. *

Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe na-akpatakarị obi ịjọ mmadụ njọ abụghị ọnọdụ onye ahụ nọ na ya, kama ọ bụ otú o si ele ọnọdụ ya anya.

^ para. 3 Ọrịa ụfọdụ nwere ike ịna-eme ka obi na-ajọ mmadụ njọ, ọ ga-adịkwa mma ka onye ahụ gaa hụ dọkịta. Teta! anaghị ekwu otú ka mma mmadụ nwere ike isi gwọọ ụdị ọrịa ndị ahụ. Onye ọ bụla kwesịrị ịsa anya ná mmiri tupu ya ekpebie otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya.

^ para. 5 Ọtụtụ ihe dị n’Abụ Ọma bụ ekpere Devid kpere.

^ para. 13 Gụọ Ụlọ Nche Julaị 1, 2015, ka ị mụtakwuo otú ị ga-esi ghara ịna-echegbu onwe gị. Isiokwu ya bụ “Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịna-echegbu Onwe Gị?