Gaa n'Isiokwu

Chineke Ọ̀ Ga-enyere M Aka Ma M Kpee Ekpere?

Chineke Ọ̀ Ga-enyere M Aka Ma M Kpee Ekpere?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee, Chineke na-enyere ndị ji obi ha niile rịọ ya arịrịọ aka ma ọ bụrụ na ha rịọrọ ya ihe ndị dabara n’uche ya. Ọ bụrụgodị na i kpetụbeghị ekpere, obi ga-esi gị ike ikpe ekpere ma ị gụọ Baịbụl hụ na e nwere ndị rịọrọ Chineke n’ekpere ka o nyere ha aka. Lee ụfọdụ n’ime ekpere ndị ahụ:

  •   ““Jehova Chineke m, biko, nyere m aka; zọpụta m dị ka obiọma gị si dị.”—Abụ Ọma 109:26.

  •   “Anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye. Chineke, biko, nyere m aka.”—Abụ Ọma 70:5.

 N’eziokwu, onye dere ihe ndị a n’akwụkwọ Abụ Ọma nwere ezigbo okwukwe na Chineke. Ma, Chineke na-ege ndị niile ji obi ha dum bịakwute ya ntị, dị ka “ndị obi ha tiwara etiwa” na “ndị e gburu mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

 Echela na Chineke nọ n’ebe dị ezigbo anya nke na nsogbu gị anaghị emetụ ya n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị elu, ma ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi; ma ọ na-anọ onye na-ebuli onwe ya elu n’ebe dị anya.” (Abụ Ọma 138:6) O nwedịrị mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ.” (Matiu 10:30) E nwere ọtụtụ ihe Chineke ma banyere gị bụ́ ndị gịnwa na-amadịghị. Ebe ọ dị otú ahụ, o doro anya na ọ ga-anụ ekpere gị ma ị kọọrọ ya ihe na-enye gị nsogbu n’obi.—1 Pita 5:7.