Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

panitan/stock.adobe.com

ỊKPỌ NDỊ MMADỤ KA HA BỊA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

Jizọs Ga-akwụsị Ịda Ogbenye

Jizọs Ga-akwụsị Ịda Ogbenye

 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu, karịchaa ndị dara ogbenye na ndị na-ata ahụhụ. (Matiu 9:36) O jidị ndụ ya chụọ àjà maka ndị ọzọ. (Matiu 20:28; Jọn 15:13) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-egosi ụmụ mmadụ ọzọ na ọ hụrụ ha n’anya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ iji ike ya ka Eze nke Alaeze Chineke kwụsị ịda ogbenye n’ebe niile n’ụwa.

 Ihe Baịbụl kwuru na Jizọs ga-eme magburu onwe ya. Ọ sịrị:

  •   “Ka o kpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ime ndị gị.Ka ọ zọpụta ụmụ ndị ogbenye.”​—Abụ Ọma 72:4.

 Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs meere anyị nakwa ihe ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu? Na Luk 22:19, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya. Ọ bụ ihe ahụ o kwuru mere Ndịàmà Jehova ji ezukọta kwa afọ iji cheta ọnwụ Jizọs. Anyị na-akpọ gị ka i soro anyị cheta ọnwụ Jizọs na Sọnde, Mach 24, 2024.

Gosi M Ebe A Ga-anọ Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs