Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Military equipment: Anton Petrus/Moment via Getty Images; money: Wara1982/iStock via Getty Images Plus

NA-ECHENỤ NCHE!

E Mefuola Ọtụtụ Puku Ijeri Dọla n’Agha​—Olee Ihe Agha Na-efu n’Eziokwu?

E Mefuola Ọtụtụ Puku Ijeri Dọla n’Agha​—Olee Ihe Agha Na-efu n’Eziokwu?

 Ihe agha na-efu abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

  •   N’abalị 13 n’ọnwa Febụwarị afọ 2024, akwụkwọ bụ́ The Washington Post sịrị, “N’afọ gara aga, ndị ọchịchị n’ụwa niile mefuru puku ijeri dọla abụọ na narị ijeri dọla abụọ ($2,200,000,000,000) n’agha dị iche iche. Ihe a bụ nke mbụ ha na-emefu ego ha otú a n’agha n’ime otu afọ.”

 Ọ bụghị naanị ego ka agha na-efu. Agha a na-alụ na Yukren gosiri na ihe a bụ eziokwu.

  •   Ndị amị. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị puku ndị amị ise (500,000) anwụọla ma ọ bụkwanụ merụọ ahụ́ kemgbe agha ahụ bidoro afọ abụọ gara aga.

  •   Ndị nkịtị. Òtù Mba Ụwa kwuru na ihe karịrị puku ndị nkịtị iri abụọ na asatọ (28,000) anwụọla ma ọ bụ merụọ ahụ́. Ma, otu onye ọkwá ya gbagotere n’Òtù Mba Ụwa kwuru, sị: “A gaghị amatachali mmadụ ole agha a kpara mkpamkpa ghasasịrịla ndụ ha.” a

 Ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi agha a na-alụ ebe dị iche iche n’ụwa abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

  •   Otu narị nde mmadụ na nde iri na anọ (114,000,000). Na Septemba 2023, ihe a bụ mmadụ ole sirila n’ụlọ ha gbapụ n’ụwa niile n’ihi agha na tigbuo zọgbuo.

  •   Narị nde mmadụ asaa na nde iri asatọ na atọ (783,000,000) bụ mmadụ ole agụụ na-anyụ ịkpakwụ. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihe Oriri kwuru, sị: “Agha ka bụ ihe kacha eme ka agụụ na-agụgbu ndị mmadụ. E kee ndị agụụ na-akpa aka ọjọọ ụzọ iri, ụzọ asaa n’ime ha bi n’ebe ndị a na-alụ agha ma ọ bụ na-eme tigbuo zọgbuo.”

 È nwere mgbe agha ga-emecha kwụsị? Obi ọ̀ ga-esili anyị ike na udo ga-emecha dị? È nwere mgbe a ga-emecha jiri ọtụtụ ihe ụwa a na-emepụta mee ka agụụ na ịda ogbenye kwụsị? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Oge agha

 Baịbụl kwuru na a ga na-alụ agha ebe niile n’ụwa otú a na-alụ ya taa. O ji onye na-agba ịnyịnya kọwaa ya.

  •   “Ịnyịnya ọzọ nke na-acha uhie uhie wee pụta. E nyekwara onye na-agba ya nnukwu mma agha nakwa ikike iwepụ udo n’ụwa ka ndị bi na ya gburịtawa ibe ha.”​—Mkpughe 6:4.

 Ndị abụọ ọzọ na-agba ịnyịnya sochiri onye nke mbụ ahụ nọchiri anya agha. Otu nọchiri anya ụkọ nri, nke ọzọ anọchie anya ọnwụ, ma nke ọrịa ọjọọ ma nke ihe ndị ọzọ kpatara. (Mkpughe 6:5-8) Ị chọọ ịmatakwu gbasara amụma a na ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ọ na-emezu n’oge anyị a, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Udo ga-adị n’ọdịnihu

 N’oge na-adịghị anya, a gaghịzi na-eji ihe ndị dị n’ụwa a alụ agha. Ma, ọ bụghị ụmụ mmadụ ga-eme ya. Baịbụl kwuru, sị:

  •   Chineke “na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”​—Abụ Ọma 46:9.

  •   Chineke ga-emezi ihe ndị agha mebiri.“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”​—Mkpughe 21:4.

  •   Chineke ga-eme ka onye ọ bụla biri n’udo. “Udo ga-adị ebe ndị m ga-ebi. Obi ga-erukwa ha ala ebe ahụ. Ebe ha ga na-ezu ike ga-adakwa jii.”​—Aịzaya 32:18.

 Amụma ndị dị na Baịbụl na-egosi na agha na ihe ndị ọzọ anyị na-ahụ n’ụwa taa na-egosi na oge ahụ udo ga-adị n’ụwa eruola eruo.

 Olee otú Chineke ga-esi mee ka udo dị n’ụwa n’ọdịnihu? Ọ ga-eji ọchịchị ma ọ bụ Alaeze ya dị n’eluigwe mee ya. (Matiu 6:10) Ị chọọ ịmata ihe Alaeze a bụ na otú ọ ga-esi baara gị uru, lee obere vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

a Onye kwuru ihe a bụ Miroslav Jenca, bụ́ osote odeakwụkwọ ukwu mba ndị dị na Yurop. O kwuru ya na Disemba 6, 2023.