Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Mkpughe 21:4—“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya”

Mkpughe 21:4—“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya”

 “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”​—Mkpughe 21:4, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ọ ga-ehichapu kwa anya-miri niile ọ bula n’anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4, Bible Nsọ nke Union Version

Ihe Mkpughe 21:4 Pụtara

 Chineke kwere nkwa iwepụ ihe mgbu na ahụhụ na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala taa, nakwa iwepụ ihe kpatara nsogbu ndị ahụ.

 “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya.” Ihe a akwụkwọ Mkpughe kwuru mesikwuru nkwa Jehova a kwere ike, nke Aịzaya onye amụma dere. Ọ sịrị na “Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri dị n’ihu mmadụ niile.” (Aịzaya 25:8; Mkpughe 7:17) Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi na ọ na-emetụ Chineke n’obi ma ndị mmadụ bewe ákwá maka na onye ha hụrụ n’anya nwụrụ ma ọ bụ maka ihe ọ bụla ọzọ mere ha ji ata ahụhụ.

 “Ọnwụ agaghịzi adị.” Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na “ọnwụ ga-akwụsị” ma ọ bụ na “a gaghịzi na-anwụ anwụ.” Chineke kwere nkwa ịkwụsị ọnwụ nakwa ahụhụ ọ na-akpata. Ihe ọzọ ọ ga-emekwa bụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22) N’ihi ya, “a ga-emeri” ọnwụ.​—1 Ndị Kọrịnt 15:26.

 “Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.” Nkwa a Chineke kwere apụtaghị na mmadụ agaghịzi ama na ihe na-afụ ụfụ, dị ka ihe ndị nwere ike ịfụ anyị ụfụ iji mee ka anyị kpachara anya ka anyị ghara imerụ ahụ́. Kama, nkwa a pụtara na ahụ́ ụfụ niile mmehie b na ezughị okè kpatara agaghịzi adị​—Ndị Rom 8:21, 22.

 “Ihe mbụ niile agafeela.” Ihe ikpeazụ a amaokwu ahụ kwuru chịkọtara ihe ọma niile ga-emere ụmụ mmadụ. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-ebiwezi ụdị ndụ ọhụrụ. Ha agaghịzi na-ebi ụdị ndụ ochie, nke ọnwụ, iru uju, ibe ákwá na ahụ́ ụfụ nọ na-akpa ha aka.” Ụmụ mmadụ ga-ebiwezi ndụ otú Chineke bubu n’obi, ya bụ, ha ga na-enwe ezigbo obi ụtọ ma dịrị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu ọ bụla.​—Jenesis 1:27, 28.

Ihe Ndị Gbara Mkpughe 21:4 Gburugburu

 Ná mmalite isi 21, Jọn onyeozi kwuru ihe ọ hụrụ n’ọhụụ. Ọ sịrị: “Ahụkwara m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (Mkpughe 21:1) O ji okwu nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha kọwaa otú ihe ga-esi gbanwee kpamkpam otú e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị ọzọ. (Aịzaya 65:17; 66:22; 2 Pita 3:13) Ọchịchị Chineke nke dị n’eluigwe ma ọ bụ “eluigwe ọhụrụ” ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ niile. Ọ ga-achị “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume ndị ga-ebi n’ụwa.​—Aịzaya 65:21-23.

 Gịnị gosiri na ọhụụ ahụ na-ekwu banyere ndị ga-ebi n’ụwa? Ihe nke mbụ bụ na okwu Chineke ji malite nkwa ahụ bụ: “Ụlọikwuu nke Chineke dị ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Mkpughe 21:3) N’ihi ya, ọ bụghị ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe ka e kwere nkwa ahụ, kama ọ bụ ụmụ mmadụ bi n’ụwa. Nke abụọ bụ na ọhụụ ahụ na-ekwu banyere ụwa mgbe ‘ọnwụ na-agaghịzi adị.’ (Mkpughe 21:4) Ọnwụ adịtụbeghị n’eluigwe, ọ bụ naanị ụmụ mmadụ bi n’ụwa ka ọnwụ na-egbu. (Ndị Rom 5:14) N’ihi ya, ọ dabara adaba ikwu na amaokwu a na-ekwu banyere ihe ndị ga-eme n’ụwa n’ọdịnihu.

 Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Mkpughe na-ekwu.

a Aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?

b Na Baịbụl, mmehie bụ ihe ọ bụla mmadụ mere ma ọ bụ ihe ọ bụla mmadụ chere n’obi ya nke megidere iwu Chineke. Ihe mmadụ kwesịrị ime ọ na-emeghị bụkwa mmehie. (1 Jọn 3:4) Gụọ isiokwu bụ “Gịnị Bụ Mmehie?