Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ò nwere Ike Inyere Gị Aka Ịkwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?

Baịbụl Ò nwere Ike Inyere Gị Aka Ịkwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?

 Kwa afọ, ịṅụ ahịhịa na ọgwụ ọjọọ dị iche iche na-egbu ọtụtụ nde mmadụ ma ọ bụkwanụ kpata ihe na-egbu ha. Nsogbu a bịara ka njọ n’oge ọrịa koronavaịrọs nọ na-arịa ọtụtụ ndị. Ihe Baịbụl kwuru enyerela ọtụtụ ndị aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-esiri gị ike, ihe Baịbụl kwuru ga-enyekwara gịnwa aka. a

Ihe dị n’isiokwu a

 Olee ihe mere anyị ji kwesị ịga na Baịbụl ka o nyere anyị aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ?

 Ndị ọkachamara achọpụtala na ndị na-aṅụgide ọgwụ ọjọọ, ya erie ha ahụ́ bụ ndị owu na-ama, ndị ike ụwa gwụrụ, ndị na-echegbu onwe ha, na ndị na-amaghịzi ihe ha ga-eme eme ná ndụ. Baịbụl nwere ike ịkụziri gị ihe ga-enyere gị aka imeri nsogbu ọ bụla ga-eme ka ị malite ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị na Chineke nwere ike isi dịrị ná mma. (Abụ Ọma 25:14) Ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu yiri ndị ị na-agaghị emerili.​—Mak 11:22-24.

 Ụzọ ihe anọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ

  1.  1. Mara Jehova Chineke. b (Jọn 17:3) Ọ bụ ya kere anyị, e nweghịkwa onye dị ike ka ya. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụ Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya. Ọ chọrọ ka gị na ya dịrị ná mma, chọọkwa iji ike ya nyere gị aka. (Aịzaya 40:​29-31; Jems 4:8) E nwere ọtụtụ ihe ọma ọ ga-emere gị n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na ị nabata ịhụnanya ya.​—Jeremaya 29:11; Jọn 3:16.

  2.  2. Na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka. Na-arịọ Chineke n’ekpere ka o nyere gị aka ka ị kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ị kwụsị ya ị ‘ga-adị nsọ [ma ọ bụ ọcha], dịkwa Chineke mma.’ (Ndị Rom 12:1) Ọ ga-eji ike ya, ya bụ mmụọ nsọ, mee ka i nweta ike “karịrị ike mmadụ.” (2 Ndị Kọrịnt 4:7; Luk 11:13) Ike a ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma kpawa “àgwà ọhụrụ” nke na-amasị Chineke.​—Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

  3.  3. Na-eche echiche otú Chineke si eche. (Aịzaya 55:9) Chineke ga-enyere gị aka mee ka ‘otú i si eche echiche dị ọhụrụ.’ Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-enyere gị aka ka ị gbanwee otú i si eche echiche. Ihe a ga-enyeziri gị aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. (Ndị Efesọs 4:23) Chineke mere ka e dee echiche ya na Baịbụl. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka ị na-agụ ya mgbe niile. (Abụ Ọma 1:1-3) Ọtụtụ ndị ahapụla àgwà na-adịghị mma ha na-akpa mgbe e nyeere ha aka ha aghọta ihe Baịbụl na-agwa anyị. (Ọrụ Ndịozi 8:30, 31) Ndịàmà Jehova na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Anyị na-agbakwa gị ume ka ị bịa ọmụmụ ihe anyị. N’ebe ahụ, anyị na-amụ Baịbụl, na-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi na-eme ihe anyị na-amụta.

  4.  4. Mete ndị ezigbo mmadụ enyi. Ka ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ndị enyi gị nwere ike inyere gị aka ma ọ bụkwanụ mee ka ịkwụsị ya siere gị ike. (Ilu 13:20) Ị ga-enweta ezigbo ndị enyi ná ndị na-efe Chineke. Ọ chọkwara ka ha nyere gị aka. (Abụ Ọma 119:63; Ndị Rom 1:12) Kpachara anya n’ụdị ihe ndị i ji eme onwe gị obi ụtọ mgbe ị na-ezu ike maka na e nwere ike ikwu na gị na ndị mere fim ị na-ele, ndị tiri egwú ị na-ege, nakwa ndị dere akwụkwọ ị na-agụ na-akpa. Zere ihe ọ bụla ga-eme ka ọ na-esiri gị ike ime ihe dị mma i kpebiri na ị ga na-eme.​—Abụ Ọma 101:3; Emọs 5:14.

  Amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ

 Abụ Ọma 27:10: “Ọ bụrụgodị na nne m na nna m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.”

 “Amaghị m onye nna m bụ. Ihe a mere ka ike ụwa na-agwụ m. Ma, ozugbo m matara na Jehova Chineke bụ onye dị adị nke hụrụ m n’anya n’eziokwu, ndụ malitere tọwa m ụtọ. Ihe a nyeere m aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ.”​—Wilby, onye Heiti.

 Abụ Ọma 50:15: “Kpọkuo m n’oge nsogbu. M ga-anapụta gị.”

 “Amaokwu a gbara m ume ọtụtụ oge mgbe m na-agba mbọ ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ma mgbe ọ na-emenahụ, mụ aṅụọ ya. Jehova meere m ihe a o kwere ná nkwa.”​—Serhiy, onye Yukren.

 Ilu 3:​5, 6: “Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi. N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya, ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.”

 “Amaokwu abụọ a nyeere m aka ịtụkwasị Jehova obi, kama ịtụkwasị onwe m obi. Jehova nyere m ike m ji gbanwee ndụ m kpamkpam.”​—Michele, onye Ịtali.

 Aịzaya 41:10: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka. M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.”

 “M na-echegbu onwe m mgbe m kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ma, amaokwu Baịbụl a mere ka obi sie m ike na Chineke ga-enyere m aka ka m kwụsị ichegbu onwe m. O nyekwaara m aka.”​—Andy, onye Saụt Afrịka.

 1 Ndị Kọrịnt 15:33: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”

 “Ọ bụ ndị ọjọọ mụ na ha na-akpa kụziiri m ịṅụ ọgwụ ọjọọ nke mechara rie m ahụ́. Mgbe m kwụsịrị ịṅụ ya bụ mgbe mụ na ha kwụsịrị ịkpa mụ na ndị na-akpa ezigbo àgwà ma na-ebi ndụ otú ka mma abụrụ enyi.”​—Isaac, onye Kenya.

 2 Ndị Kọrịnt 7:1: “Ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ ahụ́ anyị na obi anyị.”

 “Ihe amaokwu Baịbụl a kwuru mere ka m nọgide na-agba mbọ ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ ka ahụ́ m wee dị ọcha mụ akwụsịkwa ihe ga-emerụ m ahụ́.”​—Rosa, onye Kolombia.

 Ndị Filipaị 4:13: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”

 “Ama m na agaghị m ejili aka m kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọ bụ ya mere m ji rịọ Chineke n’ekpere ka o nyere m aka. O nyekwara m ike m ji kwụsị ya.”​—Patrizia, onye Ịtali.

 Ndị ọzọ Baịbụl nyeere aka ha akwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ

 Joseph Ehrenbogen toro ebe e ji tigbuo zọgbuo mara. Ọ bịara na-aṅụ oké mmanya, na-ese ma anwụrụ ma ìgbó ma ahịhịa ọjọọ ndị ọzọ. E nwere ọtụtụ oge ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ n’ihi isebiga ahịhịa ndị ahụ ókè. O nwere otu ebe na Baịbụl mere ka o kweta na ya nwere ike ịgbanwe. Gụọ akụkọ ya n’isiokwu bụ́ “M Na-akwanyeziri Onwe M na Ụmụ Nwaanyị Ùgwù.”

 Dmitry Korshunov na-eme, ya gakata ihu ya alawa azụ n’oge ọ na-agbalị ka ọ kwụsị ịṅụ oké mmanya. Lee vidio bụ́ ‘Ndụ M Na-ebi Gwụrụ M Ike’ ka ịhụ ihe nyeere ya aka ịkwụsị aṅụrụma.

Baịbụl ò kwuru na e kwesịghị iji ọgwụ agwọ onye ịṅụ ọgwụ ọjọọ ririla ahụ́?

 Mba. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.” (Matiu 9:12) Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe ndị gbasara ịṅụ ọgwụ ọjọọ n’Amerịka kwuru, sị: “Ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ́ abụghị obere ọrịa. Na onye ahụ kpebiri na ya ga-akwụsị ya ma ọ bụ na ya ga na-ejide onwe ya abụghị ebe okwu biri.” Nke bụ́ eziokwu bụ na aka Chineke na-enyere onye ọ bụla nke nwere nsogbu a karịrị onye ahụ ikpebi na ya ga-akwụsị ya ma ọ bụ na ya ga na-ejide onwe ya. Ma, ọtụtụ ndị Baịbụl nyeere aka ha akwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ mechakwara gakwuru ndị dọkịta ka a gwọ ha. c Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Allen kwuru, sị: “Mgbe m kwụsịrị ịṅụ oké mmanya, ahụ́ niile malitere na-egbu m mgbu. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ bịara doo m anya na m ga-agakwuru dọkịta ka ọ gwọ m n’agbanyeghị na Baịbụl enyerela m aka mụ akwụsị ịṅụ oké mmanya.”

 Baịbụl ò kwuru na onye ahụ́ na-adịghị ekwesịghị ịṅụ ọgwụ?

 Mba. N’eziokwu, Baịbụl kwuru ka e jiri mmanya na-agwọ ọrịa. O kwukwara ka e nye onye nọ n’ọnụ ọnwụ mmanya ka ọ ghara ịnụ ụfụ ọnwụ. (Ilu 31:6; 1 Timoti 5:23) Ma, otú ahụ mmanya e ji agwọ ọrịa nwere ike iri mmadụ ahụ́ ka ọgwụ e ji agwọ ọrịa nwekwara ike iri mmadụ ahụ́. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ṅụọ ọgwụ otú dọkịta gwara anyị ka anyị si ṅụọ ya maka na ịṅụ ọgwụ nwere ike iri anyị ahụ́ ma ọ bụrụ na anyị na-aṅụbiga ya ókè.​—Ilu 22:3.

a Ihe e kwuru okwu ya n’isiokwu a bụ gbasara otú mmadụ ga-esị kwụsị ịna-aṅụ ọgwụ ọjọọ. Ma ihe dị na Baịbụl isiokwu a chetaara anyị ga-enyere ndị ha na ịkwụsị ihe ndị ọzọ na-alụ aka, ndị dị ka ndị aṅụrụma, ndị na-ese ụtaba, ndị na-eri oké nri, ndị na-agba chacha, ndị na-ele ndị gba ọtọ, ma ọ bụ ndị na-atọ n’Ịntanet.

b Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?

c Ọtụtụ ụlọ ọgwụ na ebe a na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ha nwee ike ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ nwere ike inye aka. Onye ọ bụla ga-asa anya ná mmiri leruo nke ọ bụla n’ime ha anya ma kpebie otú kacha mma ọ chọrọ ka e si gwọ ya.​—Ilu 14:15.