Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-ekpe Ekpere n’Aha Jizọs?

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-ekpe Ekpere n’Aha Jizọs?

Ihe Baịbụl kwuru

 Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere n’aha Jizọs n’ihi na ọ bụ naanị otú ahụ ka Chineke chọrọ ka anyị si na-ekpegara ya ekpere. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Jizọs gwakwara ndịozi ya, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.”—Jọn 16:23.

Ihe ndị ọzọ mere anyị ji kwesị ikpe ekpere n’aha Jizọs

  •   Anyị na-asọpụrụ Jizọs na Nna ya bụ́ Jehova Chineke.—Ndị Filipaị 2:9-11.

  •   Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na Chineke wepụtara Jizọs ka ọ nwụọ ka e wee zọpụta anyị.—Matiu 20:28; Ọrụ 4:12.

  •   Anyị ghọtara na ọ bụ Jizọs na-arịọchitere anyị arịrịọ.—Ndị Hibru 7:25.

  •   Anyị na-akwanyere Jizọs ùgwù ebe ọ bụ Nnukwu Onyeisi Nchụàjà nke ga-enyere anyị aka ka anyị na Chineke dịrị ná mma.—Ndị Hibru 4:14-16.