Gịnị Ka Ịmụ Mmadụ Ọzọ Pụtara?
Ihe Baịbụl kwuru
Okwu bú “ịmụ ọzọ” pụtara na onye a mụrụ ọzọ na Chineke ga-amalite inwe mmekọrịta ọhụrụ. (Jọn 3:3, 7) Chineke weere ndị a mụrụ ọzọ ka ụmụ ya. (Ndị Rom 8:15, 16; Ndị Galeshia 4:5; 1 Jọn 3:1) Ọ bụrụ na mmadụ kpọta nwa na-abụghị nke ya ma were ya mere nwa, nwa ahụ na-esozi ná ndị ezinụlọ ya. Ọ bụ otú ahụ ka ndị a mụrụ ọzọ si soro ná ndị ezinụlọ Chineke.—2 Ndị Kọrịnt 6:18.
Gịnị mere e ji amụ mmadụ ọzọ?
Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Ihe a pụtara na ịmụ mmadụ ọzọ ga-eme ka onye ahụ soro ná ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ndị a ‘mụrụ ọzọ’ nwere ihe nketa ‘e debeere ha n’eluigwe.’ (1 Pita 1:3, 4) A na-emekwa ka o doo ha anya na ha na Kraịst ‘ga-achị achị dị ka ndị eze.’—2 Timoti 2:12; 2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22.
Olee otú e si amụ mmadụ ọzọ?
Mgbe Jizọs na-ekwu banyere ịmụ mmadụ ọzọ, o kwuru na ọ bụ “mmiri na mmụọ nsọ” ka a ga-eji mmụọ mmadụ ọzọ. (Jọn 3:5) Ihe okwu ya pụtara bụ na e jiri mmiri mechaa onye ahụ baptizim, e jirikwa mmụọ nsọ mee ya baptizim.—Ọrụ Ndịozi 1:5; 2:1-4.
Ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ a mụrụ ọzọ. Mgbe e mechara ya baptizim n’Osimiri Jọdan, Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ (ma ọ bụ mee ya baptizim). A mụziri Jizọs ọzọ, ya enweekwa olileanya ịlaghachi n’eluigwe. (Mak 1:9-11) Chineke mere ka ọ laghachi n’eluigwe mgbe ọ kpọlitere ya n’ọnwụ, ya abụrụzie mmụọ n’eluigwe.—Ọrụ Ndịozi 13:33.
E jikwa mmiri mee ndị ọzọ a mụrụ ọzọ baptizim tupu ha anata mmụọ nsọ. a (Ọrụ Ndịozi 2:38, 41) O meziri ka ha nwee olileanya siri ike na ha ga-aga eluigwe mgbe Chineke ga-akpọlite ha n’ọnwụ.—1 Ndị Kọrịnt 15:42-49.
Ihe ndị na-abụghị eziokwu ụfọdụ chere banyere ịmụ mmadụ ọzọ
Ụgha: A ga-amụrịrị mmadụ ọzọ ka e wee zọpụta onye ahụ ma ọ bụ tupu onye ahụ abụrụ Onye Kraịst.
Eziokwu: Àjà Kraịst chụrụ bụ maka ịzọpụta ndị a mụrụ ọzọ ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe nakwa ịzọpụta ndị Alaeze Chineke ga-achị n’ụwa. (1 Jọn 2:1, 2; Mkpughe 5:9, 10) Ndị ahụ Alaeze Chineke ga-achị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs.—Abụ Ọma 37:29; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:1-5.
Ụgha: Mmadụ nwere ike iji aka ya họpụta onwe ya ka a mụọ ya ọzọ.
Eziokwu: Chineke na-enye mmadụ niile ohere ka ha na ya dị ná mma, ka e wee zọpụta ha. (1 Timoti 2:3, 4; Jems 4:8) Ma, ọ bụ Chineke ji aka ya ahọrọ ndị a ga-amụ ọzọ, ya bụ, ndị ọ ga-eji mmụọ nsọ tee mmanụ. Baịbụl kwuru na ịmụ mmadụ ọzọ adabereghị “n’onye na-achọ ma ọ bụ n’onye na-agba ọsọ,” kama ọ dabeere na Chineke. (Ndị Rom 9:16) Okwu bụ́ “ịmụ ọzọ” nwekwara ike ịpụta “isi n’elu mụọ mmadụ.” Nke a gosiri na ọ bụ Chineke na-ahọrọ ndị a ga-amụ ọzọ.
a Ọ bụ naanị Kọnịliọs na ndị gbakọtara n’ụlọ ya ka e bu ụzọ jiri mmụọ nsọ tee mmanụ tupu e jiri mmiri mee ha baptizim.—Ọrụ Ndịozi 10:44-48.