Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Nzọpụta?

Gịnị Bụ Nzọpụta?

Ihe Baịbụl kwuru

 Na Baịbụl, “zopụta” na “nzọpụta” pụtara inyere mmadụ aka ịpụta ná nsogbu ma ọ bụ n’ihe nwere ike ịla onye ahụ n’iyi. (Ọpụpụ 14:13, 14; Ọrụ Ndịozi 27:20) Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-apụtakarị ịnapụta mmadụ ná mmehie. (Matiu 1:​21) Ebe ọ bụ mmehie na-akpata ọnwụ, ndị a zọpụtara ná mmehie nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—Jọn 3:​16, 17. a

Gịnị ka ị ga-eme ka a zọpụta gị?

 Ihe ị ga-eme ka a zọpụta gị bụ inwe okwukwe na Jizọs na ịna-erube isi n’iwu ya.​—Ọrụ Ndịozi 4:​10, 12; Ndị Rom 10:​9, 10; Ndị Hibru 5:9.

 Baịbụl gosiri na okwukwe gị kwesịrị inwe ọrụ, ya bụ, na i kwesịrị ịna-eme ihe ga-egosi na i nwere okwukwe. (Jems 2:​24, 26) Ma, ọ pụtaghị na nzọpụta bụ ihe ị ga-ejili aka gị rụta. Kama, nzọpụta bụ “onyinye Chineke” nke si ‘n’obiọma na-erughịrị mmadụ,’ ma ọ bụ “amara” Chineke.​—Ndị Efesọs 2:​8, 9; Bible Nsọ nke Union Version.

È nwere ike imecha ghara ịzọpụta Onye Kraịst?

 Ee. A gụpụta onye mmiri na-eri, o nwere ike ịdabakwa ná mmiri. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a zọpụta mmadụ ná mmehie. Ọ bụrụ na onye ahụ akwụsị ime ihe gosiri na o nwere okwukwe, e nwere ike imecha ghara ịzọpụta ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gbaa Ndị Kraịst a zọpụtarala ume ka ‘ha lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ.’ (Jud 3) Ọ dọkwara ndị a zọpụtarala aka ná ntị, sị: “Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.”​—Ndị Filipaị 2:​12.

Ọ̀ bụ Chineke bụ Onye Nzọpụta ka ọ̀ bụ Jizọs?

 Baịbụl kpọrọ Chineke “Onye Nzọpụta” ọtụtụ ugboro iji gosi na ọ bụ ya ka nzọpụta si n’aka. (1 Samuel 10:19; Aịzaya 43:11; Taịtọs 2:​10; Jud 25) Chineke jikwa ụfọdụ ụmụ nwoke zọpụta ndị Izrel n’oge ochie. Baịbụl kpọkwara ndị ahụ “ndị nzọpụta.” (Nehemaya 9:​27; Ndị Ikpe 3:​9, 15; 2 Ndị Eze 13:5) b Baịbụl kpọkwara Jizọs Kraịst “Onye Nzọpụta” n’ihi na Chineke ji àjà Jizọs chụrụ napụta anyị n’aka mmehie.​—Ọrụ Ndịozi 5:​31; Taịtọs 1:4. c

Ọ̀ bụ onye ọ bụla ka a ga-azọpụta?

 Mba, a gaghị azọpụta ụfọdụ ndị. (2 Ndị Tesalonaịka 1:9) Mgbe otu nwoke jụrụ Jizọs, sị, “Ndị a ga-azọpụta hà dị ole na ole?” Ọ zara, sị: “Gbalịsienụ ike ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye, n’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike.”​—Luk 13:23, 24.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ụfọdụ chere banyere nzọpụta

 Ụgha: Ndị Kọrịnt nke Mbụ 15:22 kwuru na a ga-azọpụta mmadụ niile mgbe ọ sịrị na “a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.”

 Eziokwu: Ọ bụ mbilite n’ọnwụ ka a na-ekwu gbasara ya n’ebe a. (1 Ndị Kọrịnt 15:12, 13, 20, 21, 35) N’ihi ya, mgbe e kwuru na “a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst,” ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ àjà Jizọs Kraịst chụrụ ga-eme ka a kpọlite ha n’ọnwụ.​—Jọn 11:25.

 Ụgha: Taịtọs 2:​11 kwuru na a ga-azọpụta mmadụ niile n’ihi na ọ sịrị na Chineke “na-ewetara mmadụ niile nzọpụta.”​—Bible Nsọ nke Union Version.

 Eziokwu: Okwu Grik e si sụgharịta “niile” n’amaokwu a nwekwara ike ịpụta “ụdị dị iche iche.” d N’ihi ya, otú e kwesịrị isi ghọta ihe Taịtọs 2:​11 kwuru bụ na Chineke na-eme ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ma ndị “si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile.”​—Mkpughe 7:​9, 10.

 Ụgha: Pita nke Abụọ 3:9 na-akụzi na a ga-azọpụta mmadụ niile maka na ọ siri na Chineke ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla.’

 Eziokwu: Chineke chọrọ ka a zọpụta ndị mmadụ, ma ọ naghị amanye ha amanye ka a zọpụta ha. ‘N’ụbọchị ikpe’ ya, ọ ga-ebibi “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”​—2 Pita 3:7.

a Baịbụl na-ekwu na azọpụtala mmadụ n’agbanyeghị na mgbe a ga-anapụta onye ahụ kpamkpam n’aka mmehie na ọnwụ ka bụ n’ọdịnihu.​—Ndị Efesọs 2:5; Ndị Rom 13:11.

b N’ụfọdụ nsụgharị Baịbụl Bekee, kama ide “onye nzọpụta” n’amaokwu ndị ahụ, ha dere “onye mmeri,” “dike,” “onye ndú,” ma ọ bụdị “otu onye.” Ma n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl, ọ bụ otu okwu ahụ ka e dere mgbe a na-ekwu maka ụmụ mmadụ ndị zọpụtara ndị ọzọ nakwa mgbe a na-ekwu na Jehova Chineke bụ Onye nzọpụta.​—Abụ Ọma 7:​10.

c Ebe e si nweta aha ahụ bụ́ Jizọs bụ n’okwu Hibru bụ́ Yehoh·shuʹaʽ, nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”

d Gụọ akwụkwọ bụ́ Vine’s Complete Expository Dictionary of Old and New Testament Words. Otu okwu Grik ahụ dị na Matiu 5:​11, bụ́ ebe Jizọs kwuru na ndị mmadụ ga-ekwu “ụdị ihe” ọjọọ niile megide ndị na-eso ụzọ ya.​—International Standard Version.