Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mmadụ Ghara Igwusa M Egwuregwu Iberiibe?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mmadụ Ghara Igwusa M Egwuregwu Iberiibe?

Ihe Baịbụl kwuru

 Lee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka:

  1.   Abụla onye oké egwuregwu. Abụla ihu atọ ọchị, na-akwanyekwara ndị gị na ha na-arụ ọrụ ùgwù. Ma, zere ime ihe ga-eme ka ọ dị ha ka ị̀ chọrọ ka ha na-egwusa gị egwuregwu iberiibe.​—Matiu 10:16; Ndị Kọlọsi 4:6.

  2.   Na-eji ejiji dị mma. Iyi efe na-enyo enyo, efe na-atapara n’ahụ́, na efe dị mkpụmkpụ ga-eme ka ndị mmadụ chewe na ihe iberiibe na-adị gị mma. Baịbụl sịrị ka anyị ‘jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe anyị mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.’​—1 Timoti 2:9.

  3.   Saa anya ná mmiri họrọ ndị gị na ha ga na-akpa. Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-anọrị bụ ndị na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma ọ bụkwanụ ndị chọrọ ka a na-achụ ha, ọ ga-eme ka a na-egwusa gị egwuregwu iberiibe.​—Ilu 13:20.

  4.   Anọla ebe e ji ihe iberiibe ama njakịrị. Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-akparịta ụka ekwuwe “okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ, bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị,” si ebe ahụ pụọ.​—Ndị Efesọs 5:4.

  5.   Anọla ebe ga-etinye gị ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, mmadụ gwa gị nọtukwuo n’ụlọ ọrụ ma a gbasaa ọrụ n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya, chee echiche nke ọma mara ihe ị ga-eme.​—Ilu 22:3.

  6.   Ọnụ sie gị ike. Ọ bụrụ na mmadụ egwusa gị egwuregwu iberiibe, gwa onye ahụ hoo haa na ị chọghị ụdị egwuregwu ahụ. (1 Ndị Kọrịnt 14:9) Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ya, sị: “Otú i si emesa m aka adịghị mụ mma. Ọ bụrụ egwuregwu, kwụsị ya. Achọghị m ya.” I nwere ike degara ya akwụkwọ ozi kọwaara ya ihe o mere, otú ihe ahụ o mere dị gị nakwa na ị chọghị ka ụdị ihe ahụ mee ọzọ. Mee ka o doo ya anya na ị kpọrọ ụdị ihe ahụ asị nakwa na Akwụkwọ Nsọ kagburu ya.​—1 Ndị Tesalonaịka 4:​3-5.

  7.   Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Ọ bụrụ na onye ahụ anọgide na-egwusa gị egwuregwu iberiibe, kọọrọ ya ezigbo enyi gị, onye ezinụlọ gị, ma ọ bụ onye ọrụ ibe gị, ma ọ bụkwanụ onye ọzọ ị maara ga-enyeliri gị aka. (Ilu 27:9) Ikpe ekpere na-enyere ọtụtụ ndị a na-egwusa egwuregwu iberiibe aka ka ha ghara ịda mbà. Ọ bụrụgodị na i kpetụbeghị ekpere, echela na o nweghị ezigbo aka Jehova, bụ́ “Chineke nke nkasi obi niile,” ga-enyere gị.​—2 Ndị Kọrịnt 1:3.

 Egwuregwu iberiibe a na-egwusa ọtụtụ nde mmadụ emeela ka ahụ́ ghara iru ha ala n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ma Baịbụl nwere ike inyere ndị ọ dị otú ahụ aka.