Gaa n'Isiokwu

Olee Ndị E Dere Aha Ha ‘n’Akwụkwọ nke Ndụ’?

Olee Ndị E Dere Aha Ha ‘n’Akwụkwọ nke Ndụ’?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ndị e dere aha ha ‘n’akwụkwọ nke ndụ,’ bụ ndị nwere olileanya inweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Aha ọzọ a na-akpọ akwụkwọ nke ndụ bụ “akwụkwọ mpịakọta nke ndụ” ma ọ bụ “akwụkwọ ncheta.” (Mkpughe 3:5; 20:12; Malakaị 3:16) Ihe Chineke na-ele anya amara onye aha ya ga-adị n’akwụkwọ nke ndụ bụ otú onye ahụ si erubere ya isi.​—Jọn 3:16; 1 Jọn 5:3.

 Kemgbe ụwa, Chineke na-echeta onye ọ bụla jeere ya ozi, dị ka à ga-asị na o dere aha onye ahụ n’akwụkwọ. (Mkpughe 17:8) Ọ ga-abụ nwoke ezi omume aha ya bụ Ebel bụ onye mbụ e dere aha ya n’akwụkwọ a. (Ndị Hibru 11:4) Na e nwere akwụkwọ dị otú a na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ “makwaara ndị bụ́ ndị ya.”​—2 Timoti 2:19; 1 Jọn 4:8.

È nwere ike ihichapụ aha mmadụ ‘n’akwụkwọ nke ndụ’?

 Ee. Chineke kwuru gbasara ndị Izrel nọ na-enupụrụ ya isi n’oge ochie, sị: “Ọ bụ onye ọ bụla mehiere m ka m ga-ehichapụ aha ya n’akwụkwọ m.” (Ọpụpụ 32:33) Mana, ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Chineke na-achọ, a gaghị ehichapụ aha anyị ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.’​—Mkpughe 20:12.