Gaa n'Isiokwu

Ndị “Kwadebere nke Ọma Ime Ihe Ọ Bụla Dị Mma”

E Wepụtala Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ E Degharịrị Edegharị

Ndị “Kwadebere nke Ọma Ime Ihe Ọ Bụla Dị Mma”

N’abalị anọ n’ọnwa Eprel afọ 2021, Nwanna Kenneth Cook, Jr., onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, wepụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e degharịrị edegharị n’asụsụ Igbo. Ndị gere okwu e ji wepụta Baịbụl a dị puku mmadụ iri anọ na asaa na narị mmadụ anọ na iri itoolu na itoolu (47,499).

Ọ bụ n’afọ 2007 ka e wepụtaara Ndịàmà Jehova na-asụ asụsụ Igbo Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik. * Kemgbe ahụ, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ niile e birila n’asụsụ Igbo dị ihe dị ka narị puku anọ, puku iri asatọ na puku ise (485,000). Ndịàmà Jehova Baịbụl a baarala uru n’ụwa niile, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Igbo, dị ihe dị ka puku mmadụ iri ise (50,000). Ma, gịnị mere e ji degharịa Baịbụl a? Ole ndị wepụtara ya? Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na a sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a e degharịrị edegharị nke ọma? Olee ihe ọhụrụ ndị dị na Baịbụl a ga-enyere gị aka ka i “ruo eruo n’ụzọ niile, bụrụ onye kwadebere nke ọma ime ihe ọ bụla dị mma”?​—2 Timoti 3:​16, 17.

Gịnị mere e ji degharịa Baịbụl a?

Ka oge na-aga, asụsụ na-agbanwe. N’ihi ya, e kwesịrị idegharị Baịbụl ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịghọta ya. Ọ bụrụ na asụsụ e ji dee Baịbụl ekweghị ndị mmadụ nghọta, e nweghị ezigbo uru Baịbụl ga-abara ha.

N’oge a na-ede Baịbụl, Jehova Chineke mere ka e dee akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla n’asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ, ya bụ, n’asụsụ ndị mmadụ na-aghọta. Ọ bụ ya mere Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji degharịa Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Bekee ma wepụta ya n’ọnwa Ọktoba afọ 2013. Ihe e dere n’okwu mmalite Baịbụl ahụ sịrị: “Ọ bụ ya mere anyị ji saa anya ná mmiri sụgharịa Baịbụl a ka ya na Baịbụl mbụ e si n’ike mmụọ nsọ dee na-ekwu otu ihe, ka ọ dị mfe nghọta ma dị mfe ọgụgụ.”

Ọ bụ Baịbụl Bekee a na-akpọ New World Translation of the Holy Scriptures​—With References, nke e wepụtara n’afọ 1984, ka e si na ya sụgharịa Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke mbụ n’asụsụ Igbo. Ma, e degharịala ọtụtụ ihe na Baịbụl Bekee ahụ. E degharịakwala ihe ndị ahụ na Baịbụl nke Igbo a aha ya bụ Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ọ kakwa mfe ọgụgụ.

Ihe ọzọ bụ na kemgbe e wepụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mbụ nke Bekee, ndị ọkachamara aghọtakwuola ọtụtụ ihe gbasara asụsụ ndị e ji dee Baịbụl n’oge a na-ede Baịbụl, ya bụ, Hibru, Arameik, na Grik. A chọtakwala akwụkwọ Baịbụl ochie dị iche iche ndị na-adịbughị n’oge e wepụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Akwụkwọ ochie ndị a na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka ịghọta ihe ndị e ji asụsụ Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik dee na Baịbụl pụtara.

N’ihi ya, a gbanwere okwu ụfọdụ ka ha daba n’ihe ndị ọkachamara kwetara na ha dị n’Akwụkwọ Nsọ n’oge e dere ya. Dị ka ihe atụ, ihe e dere na Matiu 7:​13 n’ụfọdụ Baịbụl Grik ndị e ji aka dee bụ: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye, n’ihi na ọnụ ụzọ ámá sara mbara na okporo ụzọ dị obosara na-eduba ná mbibi.” Na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke mbụ, e denyeghị “ọnụ ụzọ ámá” ugboro abụọ n’amaokwu a. Ma, mgbe e lerukwuru ihe dị na Baịbụl Grik ndị e ji aka dee anya, a chọpụtara na “ọnụ ụzọ ámá” gbara ugboro abụọ n’amaokwu ahụ. N’ihi ya, e denyere ya na Baịbụl nke a e degharịrị edegharị. E nwekwara ọtụtụ okwu ndị ọzọ e degharịrị ka ha ka mma. Ma, ha abụchaghị oké ihe, e nweghịkwa nke mere ka ihe e kwuru n’Okwu Chineke gbanwee.

Nchọpụta ọhụrụ ndị e mere gosikwara na e nwere ebe isii ọzọ aha Jehova kwesịrị ịdị n’ime Baịbụl. Ebe ndị ahụ bụ Ndị Ikpe 19:18 nakwa 1 Samuel 2:​25; 6:3; 10:26; 23:​14, 16. Aha Jehova gbakwara ugboro narị abụọ na iri atọ na asaa (237) n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ihi ya, ugboro ole aha Jehova gbara na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dịzi puku asaa, narị abụọ na iri na isii (7,216).

Olee ihe ụfọdụ a gbanwere na Baịbụl Igbo?

Otu n’ime ihe ndị pụrụ iche a gbanwere na Baịbụl Igbo a e degharịrị edegharị bụ otú e si dee ọnụ ọgụgụ dị iche iche na ya. Ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka e mee mgbanwe a bụ na tupu ọtụtụ ndị aghọta ụfọdụ ọnụ ọgụgụ Igbo, ha na-ebu ụzọ meere ya mgbakọ na mwepụ. Ihe a na-esiri ọtụtụ ndị Igbo ike. N’ihi ya, na Baịbụl a e degharịrị edegharị, e dere ọnụ ọgụgụ ọ bụla dị otu narị gbagowe ná mkpụrụ akwụkwọ Igbo, deekwa ya otú e si ede nọmba na Bekee.​—1 Ihe E Mere 5:21.

E ji okwu ndị mmadụ na-aghọta nke ọma n’oge a gbanwee okwu ụfọdụ ndị mmadụ nwere ike ịghọtahie. Dị ka ihe atụ, mmadụ nụ “ogologo ntachi obi,” o nwere ike ichewe otú mmadụ ga-atachiru obi tupu ya abụrụ na o nweela “ogologo ntachi obi.” Ma ihe e bu n’obi bụ mmadụ ịma ụma jide onwe ya. N’ihi ya, e deziri ya “ndidi.” (Ndị Galeshia 5:22) A gbanwere “ndị ikom” na “ndị inyom” ka ha bụrụzie “ụmụ nwoke” na “ụmụ nwaanyị” n’ihi na ọtụtụ ndị anaghịzi ekwu ha otú ahụ. (Ọpụpụ 35:22) Ọ bụkwa otu ihe ahụ mere e ji gbanwee “àjà ihe ọṅụṅụ” ka ọ bụrụ “àjà mmanya.”​—Ọnụ Ọgụgụ 15:5; Ndị Filipaị 2:17.

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ, a sụgharịrị okwu Hibru ụfọdụ otú ga-egosi na ihe a na-ekwu emechaala ma ọ bụ na ọ ka na-eme eme. Dị ka ihe atụ, e dere okwu bụ́ “wee gaa n’ihu” iji gosi na ihe a na-ekwu ka na-eme eme. E ji okwu bụ́ “aghaghị” gosi na okwu Hibru a sụgharịrị na-egosi na ihe a na-ekwu emeela emee ma ọ bụ na ọ ga-emerịrị. N’ihi ya, okwu bụ́ “wee gaa n’ihu” na “aghaghị” gbara ọtụtụ ugboro na Baịbụl ahụ. Na Baịbụl a e degharịrị edegharị, a sụgharịrị okwu Hibru ndị ahụ otú ga-aka mfe nghọta n’ebe ndị e kwesịrị igosi na ihe a na-ekwu ka na-eme eme ma ọ bụ na ọ na-emebu eme. (Jenesis 3:9; 15:5; 34:1; Ilu 2:4) Ma n’ebe ụfọdụ, e wepụrụ ha ka o wee dịrị onye na-agụ Baịbụl mfe ọgụgụ, ma ọ bụrụhaala na ime otú ahụ emeghị ka ihe Baịbụl na-ekwu gbanwee.

Ole ndị wepụtara Baịbụl a?

Ọ bụ Watch Tower Bible and Tract Society wepụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ọ bụ ya bụ ụlọ ọrụ iwu kwadoro Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ha. Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, Ndịàmà Jehova na-enye ndị mmadụ Baịbụl n’ebe niile n’ụwa. Ọ bụ n’agbata afọ 1950 na 1960 ka Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ wepụtara Baịbụl Bekee nke mbụ ya. Ndị so na kọmitii ahụ achọghị ka a na-anụ aha ha. N’ihi ya, ha kwuru ka a ghara ime ka ndị mmadụ mara na ha so sụgharịa Baịbụl ahụ, ọ bụrụgodị ma ha nwụọ.​—1 Ndị Kọrịnt 10:31.

N’afọ 2008, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova họpụtara ụmụnna ọzọ ka ha soro na Kọmitii Ga-asụgharị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Kọmitii ahụ malitere idegharị Baịbụl Bekee ahụ ozugbo. Mgbe ha na-arụ ọrụ a, otu ihe ha chebaara echiche bụ otú asụsụ Bekee sirila gbanwee kemgbe e wepụtara Baịbụl Bekee a nke mbụ ya. Ihe ọzọ ha lerukwara anya bụ ihe karịrị ajụjụ pụku iri asaa (70,000) a zara ndị nsụgharị sụgharịrịla Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri abụọ (120).

Olee otú e si sụgharịa Baịbụl a n’asụsụ Igbo?

Ihe mbụ e mere bụ ịhọpụta ụmụnna ndị ga-eso sụgharịa Baịbụl a. A chọpụtala na ọ bụrụ na ndị nsụgharị arụkọọ ọrụ ọnụ, kama ịrụ iche iche, ọrụ ha na-aka mma. (Ilu 11:14) Ọ na-abụkarị ndị bụ aka ochie n’ịsụgharị akwụkwọ Ndịàmà Jehova ka a na-ahọpụta ka ha soro rụọ ọrụ a. A na-akụziri ndị ahụ ihe ndị ga-enyere ha aka ịsụgharị Baịbụl nke ọma, kụziekwara ha otú ha ga-esi eji ihe ndị pụrụ iche e tinyere na kọmputa rụọ ọrụ a.

Ndị nsụgharị na-eji ngwá ọrụ kọmputa ndị na-enyere ha aka ịghọta okwu ndị dị na Baịbụl arụ ọrụ a. E nwekwara otu ngalaba dị na Niu Yọk, n’Amerịka, na-enyere ha aka. A na-akpọ ya Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-esi n’aka Kọmitii Ide Ihe elebara otú e si asụgharị Baịbụl anya. Ma, oleekwanụ otú ndị nsụgharị si arụ ọrụ a?

A na-agwa ndị nsụgharị ka ha hụ (1) na ihe ha ga-asụgharịrị na Baịbụl ga-abụ eziokwu, dịkwara ndị na-agụghị oké akwụkwọ mfe nghọta, (2) na ọ bụ ihe ha dere otu ihe n’otu ebe ka ha ga-ede ya n’ebe ndị ọzọ, nakwa (3) ka ha hụ na ha sụgharịrị okwu Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik otú e si dee ha, ma ọ bụrụhaala na ọ dabara n’asụsụ ha na-asụgharị. Olee otú ha ga-esi eme ihe ndị a? Ka anyị jiri Baịbụl ọhụrụ a e wepụtara kọwaa ya. Ndị niile so sụgharịa ya bu ụzọ leba anya n’okwu Igbo ndị e dere na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke mbụ. Ha ji ngwá ọrụ a na-akpọ Watchtower Translation System e tinyere na kọmputa ha chọta okwu niile gbara na Baịbụl nakwa okwu ndị ha na ha yiri na okwu ndị ha na ha pụtara otu ihe. Ha jikwa ngwá ọrụ ahụ chọpụta otú e si dee okwu ndị ahụ na Grik ma ọ bụ na Hibru ka ha nwee ike ịhụ otú e si sụgharịa ha n’ebe ndị ọzọ. Ihe ndị a nyeere ha aka ileba anya n’okwu Igbo ndị e dere na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke mbụ. Ndị nsụgharị ahụ gbaziri mbọ jiri okwu ndị dị mfe nghọta sụgharịa amaokwu nke ọ bụla otú ndị Igbo si ekwu okwu.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọrụ nsụgharị abụghị naanị iji otu okwu dochie okwu ọzọ. A gbalịsiri ike chọta okwu Igbo ndị kacha daba n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu n’amaokwu nke ọ bụla. Ka ị na-agụ Baịbụl a, ị ga-achọpụta na a sara anya ná mmiri rụọ ọrụ a. A sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Igbo a ka ya na Baịbụl mbụ e si n’ike mmụọ nsọ dee na-ekwu otu ihe, ka ọ dị mfe nghọta ma dị mfe ọgụgụ.

Anyị na-agba gị ume ka ị gbalịa gụọ Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’onwe gị. I nwere ike ịgụ ya n’Ịntanet ma ọ bụ na JW Library ma ọ bụkwanụ gị agwa Ndịàmà Jehova bi gị nso ka ha nye gị nke e biri ebi. Ka ị na-agụ Baịbụl a, ka obi sie gị ike na ọ bụ okwu Chineke a sụgharịrị nke ọma n’asụsụ gị.

Ihe ndị ị ga-ahụ na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e degharịrị edegharị

Ihe Baịbụl Na-ekwu: O nwere amaokwu Baịbụl dị iche iche zara ajụjụ iri abụọ gbasara ihe Baịbụl na-akụzi

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A: Ọ dị ná mmalite akwụkwọ Baịbụl ọ bụla. E ji ya tụpenye onye na-agụ Baịbụl a azụ̀ ihe akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla na-ekwu. Ọ ga-enyere gị aka ịchọta ihe ị na-achọ na Baịbụl. E ji ya dochie ihe ndị e dere n’elu elu Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke mbụ

Ihe Ndị E Dere n’Etiti Baịbụl: Ọ bụ naanị amaokwu Baịbụl ndị ga-akacha enyere mmadụ aka n’ozi ọma ka e denyere na ya

Ihe Ndị E Dere n’Ala Ala Peeji: Ihe e dere na ha bụ otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu ụfọdụ, otú e si dee okwu ụfọdụ n’asụsụ Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik, nakwa ihe ụfọdụ a kọwara gbasara okwu ụfọdụ

Okwu Ndị Dị na Baịbụl: Ọ bụzi naanị amaokwu Baịbụl ndị ga-akacha enyere mmadụ aka n’ozi ọma ka e denyere na ya

Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl: A kọwara ọtụtụ okwu ndị dị na Baịbụl na ya

Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara​—Nke A: E kwuru ihe ụfọdụ e degharịrị na Baịbụl a na ya, dị ka okwu ụfọdụ a gbanwere na otú e si sụgharịa aha Chineke

Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara​—Nke B: E nwere isiokwu iri na ise e sere ọmarịcha map na ihe ndị ọzọ na ya

^ Ọ bụ n’afọ 2001 ka e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik n’asụsụ Igbo.