Gaa n'Isiokwu

Olee Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi?

Olee Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi?

 Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ mmadụ ole na ole na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa niile. Ha bụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ n’ọgbakọ Chineke. Ọrụ ha na-arụ dị ụzọ abụọ. Ha bụ:

 Òtù Na-achị Isi na-eṅomi ihe nlereanya “ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem” n’oge ochie. Ọ bụ ndịozi na ndị okenye ahụ mere mkpebi ndị dị mkpa maka ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere n’oge ahụ. (Ọrụ Ndịozi 15:2) Ma, ha abụghị ndị isi ọgbakọ Ndị Kraịst. Otú ahụ ka ọ dịkwa Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ihe ọ bụla ha na-eme na-esi na Baịbụl n’ihi na ha ma na ọ bụ Jizọs Kraịst ka Jehova họpụtara ka ọ bụrụ onyeisi ọgbakọ ndị Chineke.​—1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 5:​23.

Olee aha ndị so n’Òtù Na-achị Isi?

 Na Jenụwarị afọ 2018, ndị só na ya bụ Kenneth Cook, Jr., Samuel Herd, Geoffrey Jackson, Stephen Lett, Gerrit Lösch, Anthony Morris III, Mark Sanderson, na David Splane. Ha nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik, Niu Yọk dị n’Amerịka na-eje ozi.

Olee otú e si hazie Òtù Na-achị Isi?

 Òtù Na-achị Isi nwere kọmitii isii na-elekọta akụkụ dị iche iche nke ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ. Onye nke ọ bụla só n’Òtù Na-achị Isi nwere otu komitii ma ọ bụ abụọ ọ nọ na ya.

  •   Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ: Ọ bụ kọmitii a na-eleba anya n’okwu ikpe Ndịàmà Jehova, na-ahazi maka ịgbatara ụmụnna anyị ndi ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, na ndị nke a na-emegide n’ihi ihe ha kweere. Ha na-ahụ maka ihe gbata gbata ọ bụla merenụ nke gbasara Ndịàmà Jehova.

  •   Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel: Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka Ndịàmà Jehova niile na-eje ozi na Betel.

  •   Kọmitii Mbipụta: Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-ahụkwa na e bugara ha n’ebe a chọrọ ha. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka ịrụ ụlọ niile Ndịàmà Jehova na-arụ, ma Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ma ọfis ndị nsụgharị, ma alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche.

  •   Kọmitii ije ozi: Ọ bụ kọmitii a na-elekọta ọrụ ikwusa ‘ozi ọma Alaeze Chineke’ anyị na-arụ.​—Matiu 24:14.

  •   Kọmitii Izi Ihe: Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ịkwadebe ihe ndị anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe anyị, ná mgbakọ anyị, na n’ụlọ akwụkwọ anyị dị iche iche. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka imepụta vidio na ihe ndị a na-egere egere e ji akụziri anyị ihe.

  •   Kọmitii Ide Ihe: Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ihe a na-ede n’akwụkwọ anyị dị iche iche, ma nke e biri ebi, ma ndị nke dị n’Ịntanet. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka ihe niile Ndịàmà Jehova na-asụgharị.

 E wezụga ọrụ a niile ndị só n’Òtù Na-achị Isi na-arụ na kọmitii ha dị iche iche, ha na-ezukọ kwa izu kwurịta mkpa ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ha zukọta, ha na-eleba anya n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ihe ha chọrọ ịkwurịta, ma kwe ka mmụọ nsọ Chineke duzie ha. Ha na-agbalịkwa ikwekọrịta n’otu ihe.​—Ọrụ Ndịozi 15:25.

Ole ndị na-enyere Òtù Na-achị Isi aka?

 Ndị na-enyere Òtù Na-achị Isi aka bụ ụmụnna ndị a tụkwasịrị obi. Ha na-enye aka na kọmitii Òtù Na-achị Isi dị iche iche. (1 Ndị Kọrịnt 4:2) Ha bụ ụmụnna ma nke a na-akọ n’ọrụ ha na-arụ na kọmitii ha nọ na ya. Ha na-esokwa kọmitii ha enwe nnọkọ kwa izu. Ha anaghị eso eme mkpebi, ma ha na-atụ aro ma ọ bụ kwuo ihe ga-enye aka ime mkpebi. Ha na-eme ihe kọmitii ha kpebiri, na-elerukwa anya ka ha mara ma ihe ndị ahụ e kpebiri hà na-abakwa uru. Òtù Na-achị Isi nwekwara ike iziga ha ka ha gaa leta ụmụnna anyị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa, ma ọ bụ nye ha okwu ha ga-ekwu ná nnọkọ ndị dị ka nnọkọ a na-enwe kwa afọ ma ọ bụ ememme ngụcha akwụkwọ Gilied.

AHA NDỊ NA-ENYERE ÒTÙ NA-ACHỊ ISI AKA

Kọmitii

Aha

Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ

  • Ekrann, John

Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel

  • Grizzle, Gerald

  • LaFranca, Patrick

  • Molchan, Daniel

  • Walls, Ralph

Kọmitii Mbipụta

  • Adams, Don

  • Butler, Robert

  • Corkern, Harold

  • Glockentin, Gajus

  • Gordon, Donald

  • Luccioni, Robert

  • Reinmueller, Alex

  • Sinclair, David

Kọmitii Ije Ozi

  • Breaux, Gary

  • Dellinger, Joel

  • Hyatt, Seth

  • Mavor, Christopher

  • Perla, Baltasar, Jr.

  • Turner, William, Jr.

  • Weaver, Leon, Jr.

Kọmitii Izi Ihe

  • Curzan, Ronald

  • Flodin, Kenneth

  • Malenfant, William

  • Noumair, Mark

  • Schafer, David

Kọmitii Ide Ihe

  • Ciranko, Robert

  • Mantz, James

  • Marais, Izak

  • Smalley, Gene

  • van Selm, Hermanus