Gaa n'Isiokwu

Ndị Estonia Enye Onyinye Maka “Ezigbo Mbọ A Gbara”

Ndị Estonia Enye Onyinye Maka “Ezigbo Mbọ A Gbara”

N’afọ 2014, e tinyere Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’akwụkwọ ndị a gbara mbọ wepụta n’asụsụ Estonian. A na-enye ndị gbara mbọ bipụta akwụkwọ dị́ mma onyinye maka ike ha kpara. Ọ bụkwa ihe a na-eme n’afọ ọ bụla n’Estonia. N’ime akwụkwọ iri na asatọ e wepụtara n’afọ 2014, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ gbara nke atọ.

E wepụtara Baịbụl ọhụrụ a n’abalị asatọ n’ọnwa Ọgọst, afọ 2014. Ọ bụ otu nwaanyị aha ya bụ Kristiina Ross tinyere ya ka o soro n’akwụkwọ ndị a ga-enye ndị bipụtara ha onyinye n’afọ ahụ. Kristiina Ross na-arụ n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Asụsụ n’Estonia. O kwuru na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ “dị mfe ọgụgụ, na-atọkwa ụtọ ịgụ.” O kwukwara, sị: “Mbọ a gbara sụgharịa ya emeela ka otú e si asụgharị ihe n’asụsụ Estonian kakwuo mma.” Otu nwoke aha ya bụ Rein Veidemann, bụ́ ọkachamara ná nsụgharị asụsụ Estonian, kpọrọ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ “ezigbo mbọ a gbara.”

Mgbe mbụ e bipụtara Baịbụl zuru ezu n’asụsụ Estonian bụ n’afọ 1739. Kemgbe ahụkwa, e bipụtala Baịbụl ndị ọzọ n’asụsụ Estonian. Gịnị mere Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji bụrụ “ezigbo mbọ a gbara”?

A sụgharịtara ya. Baịbụl e bipụtara n’asụsụ Estonian n’afọ 1988, bụ́ nke a ma ama, kpọrọ Chineke aha ya bụ́ “Jehoova” (Jehova) ihe karịrị ugboro puku isii na narị asatọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru (Agba Ochie). a Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Estonian mekwara otú ahụ karịa. N’ebe aha Chineke kwesịrị ịgba n’akwụkwọ nsọ Grik nke ndị Kraịst, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ tinyere ya (Agba Ọhụrụ).

O doro anya. À sụgharịtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, ya adịkwa mfe ọgụgụ? Onye nsụgharị Baịbụl a ma ama aha ya bụ Toomas Paul kwuru n’otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’Estonia na a sụgharịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ “otú ndị Estonian si ekwu okwu.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ akwụkwọ mbụ e si otú ahụ sụgharịa.”

Ebe ndị mmadụ na-agụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Estonian

Ihe ndị Estonia kwurula banyere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ magburu onwe ya. Ụlọ ọrụ redio dị n’Estonia wepụtara nkeji iri anọ kwuo gbasara Baịbụl ọhụrụ a. Ndị ụkọchukwu na ndị chọọchị ha agwala Ndịàmà Jehova ka ha wetara ha ụfọdụ n’ime Baịbụl ọhụrụ a. Otu ụlọ akwụkwọ ndị oké ozu e nwere na Talin kwuru ka e wetara ha Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ iri abụọ ka ha jiri ya mụọ ihe na klas. Ọ na-atọ ndị Estonia ụtọ ịgụ akwụkwọ. Obi dịkwa Ndịàmà Jehova ụtọ iwepụtara ha Baịbụl a sụgharịrị nke ọma.

a Mgbe otu nwoke aha ya bụ Ain Riistan, bụ́ onyeisi na Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ọmụmụ Agba Ọhụrụ na mahadum dị́ na Tatu, kwuchara otú ndị Estonia si malite ịkpọ aha Chineke bụ́ “Jehoova,” ọ sịrị: ‘Echere m na aha ahụ bụ́ Jehoova dabara adaba taa. N’agbanyeghị otú e si malite ịkpọ ya, aha a nwere ezigbo ihe ọ pụtara kemgbe ọtụtụ ọgbọ gara aga. Jehoova bụ aha Chineke ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ.’