Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-agbatara Ndị Mmadụ Ọsọ Enyemaka Ma E Nwee Ọdachi?

Ndịàmà Jehova Hà Na-agbatara Ndị Mmadụ Ọsọ Enyemaka Ma E Nwee Ọdachi?

 Ee, Ndịàmà Jehova na-agbatakarị ọsọ enyemaka ma e nwee ọdachi. Anyị na-enyere ma Ndịàmà Jehova ibe anyị ma ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova aka, n’ihi na Baịbụl gwara anyị ná Ndị Galeshia 6:10 “ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” Anyị na-agbalịkwa akasi ndị ọdachi dakwasịrị obi, jirikwa Akwụkwọ Nsọ gbaa ha ume n’ihi na ọ bụ ya kacha ha mkpa n’oge ahụ.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

Otú e si ahazi ya

 E nwee ọdachi, ndị okenye ọgbakọ ndị nọ n’ebe ọdachi ahụ mere na-akpọtụrụ ndị niile nọ n’ọgbakọ ndị nọ n’ebe ahụ e nwere ọdachi ka ha mara otú ha mere, marakwa otú a ga-esi nyere ha aka. Ndị okenye ahụ na-agwazi alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ahụ otú ihe si kwụrụ na ihe ndị ha merela iji nyere ndị ọdachi ahụ dakwasịrị aka.

 Ọ bụrụ na ọgbakọ ndị dị ebe ahụ agaghị enyeliri ndị ahụ ọdachi dakwasịrị aka, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ahazizi ka e bugara ndị ahụ ọdachi dakwasịrị ihe ndị dị ha mkpa. Ọ bụ otú a ka Ndị Kraịst oge mbụ si nyere Ndị Kraịst ibe ha aka mgbe e nwere ụnwụ nri. (1 Ndị Kọrịnt 16:1-4) Alaka ụlọ ọrụ dị n’obodo ahụ na-ehiwe Kọmitii Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka ka ha na-ahazi otú a ga-esi na-enyere ndị ahụ ọdachi dakwasịrị aka. Ndịàmà Jehova si n’obodo ndị ọzọ na-ewetakwara ndị a ọdachi dakwasịrị ihe ndị dị ha mkpa, na-abịakwa n’onwe ha enye aka.—Ilu 17:17.

Ebe e si enweta ego e ji enye aka

 Otu n’ime ihe ndị e ji ego a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova eme bụ ịgbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. (Ọrụ Ndịozi 11:27-30; 2 Ndị Kọrịnt 8:13-15) Ebe ọ bụ na a naghị akwụ ndị bịara inye aka ụgwọ, ihe a na-eji ego ndị e wepụtara eme bụ naanị inyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. Anyị na-akpachapụ anya ka anyị ghara imefusị ego ndị a e nyere n’onyinye.—2 Ndị Kọrịnt 8:20.