Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 8:1-24

  • Onyinye a nakọtara maka ụmụnna nọ na Judia (1-15)

  • A ga-eziga Taịtọs Kọrịnt (16-24)

8  Ụmụnna anyị, anyị chọrọ ịgwa unu gbasara amara Chineke meere ọgbakọ ndị dị na Masedonia.+  Mgbe ha na-ata ahụhụ n’oge a na-akpagbu ha, ha nọ na-aṅụrị ezigbo ọṅụ, na-emesapụkwa nnọọ aka n’agbanyeghị na o nweghị ka ọ hà ha.  Ha nyere ihe otú ike kwere ha.+ M na-agba akaebe na ha nyedịrị karịa otú ike ha hà.+  Ha nọdị na-arịọ anyị ka anyị meere ha amara kwe ka ha na-enye onyinye, ka ha sorokwa na-enyere ndị nsọ aka.+  Ha mere karịa ihe anyị tụrụ anya ya. Ha bu ụzọ nyefee Onyenwe anyị onwe ha, nyekwara anyị aka otú Chineke chọrọ.  Ọ bụ ya mere anyị ji gbaa Taịtọs ume+ ka ọ nakọtachaa onyinye unu ji obi unu niile nye, ebe ọ bụ ya malitere ịnakọta ya.  Unu na-eme nke ọma n’ihe niile. Okwukwe unu siri ike. Unu ma otú e si ekwu okwu. Unu ma ọtụtụ ihe. Unu na-agba ezigbo mbọ n’ihe ọ bụla unu na-eme. Unu hụrụ ndị ọzọ n’anya n’eziokwu otú anyị hụrụ unu. Ma, na-agbakwanụ mbọ ka unu na-emesapụ aka.+  Ọ bụghị iwu ka m na-enye unu, kama achọrọ m ka unu mara otú ndị ọzọ si jiri obi ha niile na-arụsi ọrụ ike. Achọkwara m ịma ma ịhụnanya unu ọ̀ bụ nke ezigbo ya.  N’ihi na unu ma amara Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu. Ọ bụ eziokwu na ọ bara ọgaranya, ọ dara ogbenye n’ihi unu,+ ka unu wee baa ọgaranya n’ihi ogbenye ọ dara. 10  Ihe a ka m chere:+ Ime ihe a ga-abara unu uru, n’ihi na o meela otu afọ unu malitere inye onyinye, unu jikwa obi unu niile na-enye ya. 11  Ugbu a, otú ahụ unu ji obi unu niile malite inye onyinye a, na-enyenụ ya otú aka hà unu ruo mgbe unu nyezuru ihe unu chọrọ inye.* 12  Onyinye Chineke kacha anabata bụ onyinye si mmadụ n’obi, n’ihi na Chineke na-atụ anya ka mmadụ nye ihe ọ ga-enyeli,+ ọ bụghị ihe ọ na-agaghị enyeli. 13  N’ihi na achọghị m ka ihe dịrị ndị ọzọ mfe, ma siere unu ike. 14  Kama ka e jiri ihe mafọọrọ unu mejuo ihe kọrọ ndị ọzọ ugbu a, ka e jirikwa ihe mafọọrọ ha mejuo ihe kọrọ unu, ka ihe unu nwere na ihe ha nwere wee hara otu. 15  Otú ahụ ka e dere ya, sị: “E nweghị ihe mafọọrọ onye kpooro nnukwu. Nke onye kpooro ntakịrị zukwaara ya.”+ 16  Ekele dịrị Chineke na o mere ka Taịtọs na-eche gbasara unu otú anyị si eche gbasara unu.+ 17  N’ihi na ọ bụghị naanị na ọ nabatara ihe anyị gwara ya, kama, o ji obi ya niile nabata ya. Ọ bụ ya mere o ji kpebie na ọ ga-abịa hụ unu. 18  Ma, anyị na-ezitere unu ya na otu nwanna ọgbakọ niile na-aja mma n’ihi otú o si ezisa ozi ọma. 19  Ọgbakọ niile họpụtakwara ya ka o soro anyị na-aga ebunye ọgbakọ dị iche iche onyinye. Onyinye a anyị ga-ekesa ga-eme ka e too Onyenwe anyị, gosikwa na anyị chọrọ inyere ndị ọzọ aka. 20  N’ihi ya, anyị achọghị ikesa onyinye a otú ga-eme ka e nwee onye ga-ata anyị ụta.+ 21  N’ihi na anyị ‘na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile, ma n’anya Jehova,* ma n’anya ụmụ mmadụ.’+ 22  Anyị na-ezitekwara unu ha na otu nwanna anyị, onye anyị chọpụtarala ọtụtụ mgbe na ọ na-agba mbọ n’ihe niile ọ na-eme. Ugbu a kwa, ọ ga-agbakwu mbọ n’ihi na obi siri ya ike na unu ga-eme nke ọma. 23  Ma, e nwee onye chọrọ ịma onye Taịtọs bụ, gwanụ ya na ọ bụ onye òtù m na onye ọrụ ibe m maka ọdịmma unu. E nweekwa onye chọrọ ịma gbasara ụmụnna ndị a, ya mara na ha na-anọchite anya ọgbakọ, na-emekwa ka a na-eto Kraịst. 24  N’ihi ya, gosinụ ụmụnna ndị a na unu hụrụ ha n’anya,+ gosikwanụ ọgbakọ dị iche iche ihe mere anyị ji jiri unu na-anya isi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mgbe unu mechara ihe unu bidoro.”
Gụọ A5.