Ọrụ Ndịozi 11:1-30

  • Pita kọọrọ ndịozi ndị ọzọ ihe merenụ (1-18)

  • Banabas na Sọl gara Antiọk nke dị na Siria (19-26)

    • Mgbe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Ndị Kraịst (26)

  • Agabọs buru amụma na ụnwụ ga-ada (27-30)

11  Ndịozi na ụmụnna nọ na Judia nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke.  Ma, mgbe Pita gbagotere Jeruselem, ndị chọrọ ka ndị mba ọzọ na-ebi úgwù+ malitere ịkatọ ya,  na-asị: “Ị banyere n’ụlọ ndị a na-ebighị úgwù, sorokwa ha rie ihe.”  Pita wee bido ịkọwara ha ihe niile merenụ, sị:  “Anọ m na Jọpa na-ekpe ekpere, mechaakwa hụ ọhụụ. Ahụrụ m ka e ji ihe dị ka nnukwu ibé ákwà linin aka n’isi anọ ya, si n’eluigwe na-ewedata ya n’ụwa, ya erutekwa nnọọ n’ebe ahụ m nọ.+  Mgbe m lebara anya n’ime ya, ahụrụ m anụ ndị nwere ụkwụ anọ, anụ ọhịa, anụ ndị na-arị arị,* na nnụnụ.  Anụkwara m olu sịrị m: ‘Pita, bilie, gbuo otu n’ime anụ ndị a rie.’  Ma m sịrị: ‘Onyenwe anyị, mbanụ, n’ihi na ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha abatụbeghị m n’ọnụ.’  Olu ahụ nke si n’eluigwe sịrị nke ugboro abụọ: ‘Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.’ 10  Ihe a mere ugboro atọ, e buruzie ihe niile ahụ bugoo eluigwe. 11  N’otu oge ahụkwa, ụmụ nwoke atọ guzo n’ihu ụlọ ahụ anyị nọ. E si Sizaria zite ha ka ha bịa hụ m.+ 12  Chineke wee jiri mmụọ nsọ gwa m ka m soro ha gawa n’enweghị obi abụọ ọ bụla. Ụmụnna isii ndị a sokwa m gaa, anyị abanye n’ụlọ nwoke zitere ndị ahụ bịara hụ m. 13  “Ọ kọọrọ anyị otú o si hụ mmụọ ozi bịara guzoro n’ụlọ ya, sị ya: ‘Ziga ndị ozi Jọpa ka ha gaa kpọọ Saịmọn, onye a na-akpọ Pita.+ 14  Ọ ga-agwa gị otú a ga-esi zọpụta gị na ezinụlọ gị.’ 15  Ma mgbe m malitere ikwu okwu, mmụọ nsọ dakwasịrị ha otú ahụ ọ dakwasịrị anyị ná mmalite.+ 16  M wee cheta ihe Onyenwe anyị na-adị ekwu: ‘Jọn ji mmiri mee ndị mmadụ baptizim,+ ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.’+ 17  N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ ọ na-enye n’efu otú o nyekwara anyịnwa bụ́ ndị kweere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ònye ka m bụ igbochi Chineke ime ihe ọ chọrọ ime?”+ 18  Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha kwụsịrị ịkatọ ya,* wee nye Chineke otuto, sị: “Ọ bụrụ otú ahụ, Chineke chọkwara ka ndị mba ọzọ chegharịa, ka ha wee nweta ndụ.”+ 19  Mgbe e gbuchara Stivin, a malitekwara ịkpagbu ndị kwere ekwe ndị ọzọ. N’ihi ya, ha gbagara+ Finishia, Saịprọs, na Antiọk. Ma, ọ bụ naanị ndị Juu ka ha nọ na-ezi ozi ọma.+ 20  Ma, ụfọdụ n’ime ha ndị si Saịprọs na Saịrini gara Antiọk, malite izisara ndị na-asụ Grik ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs. 21  Jehova* nọnyekwaara ha. Ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe ma malite iso ụzọ Onyenwe anyị.+ 22  Ọgbakọ dị na Jeruselem nụrụ gbasara ha. Ha wee ziga Banabas+ Antiọk. 23  Mgbe o ruru wee hụ otú Chineke si na-emere ndị na-eso ụzọ Jizọs amara, ọ ṅụrịrị ọṅụ ma malite ịgba ha niile ume ka ha jiri obi ha niile na-eso ụzọ Onyenwe anyị.+ 24  Banabas bụ ezigbo mmadụ. O nwere okwukwe, jupụtakwa na mmụọ nsọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị bịara kwere n’Onyenwe anyị.+ 25  Ọ gawara Tasọs ịga chọọ Sọl.+ 26  Mgbe ọ hụrụ ya, ha abụọ sooro gaa Antiọk. Ruo otu afọ zuru ezu, ha nọ na-eso ọgbakọ dị ebe ahụ ezukọta, ha kụzikwaara ìgwè mmadụ ihe. Antiọk bụkwa ebe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Ndị Kraịst otú Chineke si chọọ.+ 27  N’oge ahụ, ụfọdụ ndị amụma+ si Jeruselem gaa Antiọk. 28  Otu n’ime ha bụ Agabọs.+ O si n’ike mmụọ nsọ kwuo na oké ụnwụ ga-ada n’ụwa niile.+ Ụnwụ a mechara daa n’oge Klọdiọs. 29  N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs kpebiri izigara ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka+ otú aka onye nke ọ bụla n’ime ha hà.+ 30  Ha mekwara ihe a ha kpebiri, si n’aka Banabas na Sọl zigara ndị okenye ihe ndị ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “anụ ndị na-akpụ akpụ.”
Na Grik, “ha gbachiri nkịtị.”
Gụọ A5.