Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Ezinụlọ Ka Ha Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Udo?

Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Ezinụlọ Ka Ha Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Udo?

 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike ka udo dị n’ezinụlọ anyị nakwa n’ezinụlọ ndị ọzọ. Anyị na-erubere Chineke isi n’ihi na ọ bụ ya malitere ezinụlọ. (Jenesis 2:​21-24; Ndị Efesọs 3:​14, 15) Ihe ndị o kwuru na Baịbụl na-enyere ezinụlọ dị iche iche n’ụwa aka ịna-ebi n’udo ma na-enwe obi ụtọ.

Otú Ndịàmà Jehova Si Enyere Ezinụlọ Dị Iche Iche Aka Ịna-ebi n’Udo

 Anyị na-agba mbọ ka anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru n’ihi na ime otú a na-enyere anyị aka ịbụ ezigbo di, ezigbo nwunye, ma ọ bụ ezigbo nne na nna. (Ilu 31:​10-31; Ndị Efesọs 5:22–6:4; 1 Timoti 5:8) Ihe Baịbụl kwuru na-enyedịrị ezinụlọ aka ịna-ebi n’udo, ọ bụrụgodị na ha anaghị ekpe otu okpukpe. (1 Pita 3:​1, 2) E nwere ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, mana di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ. Legodị ihe ụfọdụ n’ime ha kwuru:

  •   “N’afọ isii mbụ anyị lụrụ, anyị na-esekarị okwu, ike ụwa ana-agwụkwa anyị. Ma, mgbe Ivete nwunye m ghọrọ Onyeàmà Jehova, ọ bịara hụkwuo m n’anya, na-enwekwukwa ndidi. Otú o si gbanwee mere ka anyị ghara itisa.”​—Clauir, onye Brazil.

  •   “Mgbe Chansa di m na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, m nwara igbochi ya n’ihi na echere m na ha na-etisa ezinụlọ. Mana kemgbe ahụ, achọpụtala m na Baịbụl na-enyere ezinụlọ anyị aka.”​—Agness, onye Zambia.

 Anyị gaa ozi ọma, anyị na-agwa ndị mmadụ otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere ha aka

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye abụrụ Onyeàmà Jehova, ọ̀ na-ebute nsogbu n’ezinụlọ?

 Ee. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akpata nsogbu. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1998 otu ụlọ ọrụ na-eme nchọpụta aha ya bụ Sofres chọpụtara na otu di na nwunye n’ime ndị di na nwunye iri abụọ ọ bụla otu onye n’ime ha bụ Onyeàmà Jehova na-enwekarị nsogbu n’alụmdi na nwunye ha.

 Jizọs kwuru na mmadụ na ndị ezinụlọ ya nwere ike ịghọ ndị iro n’ihi na ọ malitere iso ụzọ ya. (Matiu 10:​32-36) Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Will Durant kwuru na n’ebe dị iche iche ndị Rom chịrị, “e boro Ndị Kraịst ebubo na ha na-etisa ezinụlọ.” a Taakwa, a na-ebo Ndịàmà Jehova otu ebubo a. Ọ̀ pụtara na ọ bụ onye nke bụ́ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ na-akpata nsogbu n’ezinụlọ ha?

Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop

 Mgbe Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop nọ na-acha ikpe banyere ebubo e boro Ndịàmà Jehova na ha na-etisa ezinụlọ, o kwuru na n’ezinụlọ mmadụ niile na-abụghị Ndịàmà Jehova, ndị nke na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ebutekarị nsogbu n’ezinụlọ n’ihi na ha “anaghị ahapụ ndị ezinụlọ ha bụ́ Ndịàmà Jehova ka ha nwere onwe ha ikpe okpukpe ha.” Ụlọikpe ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụghị naanị Ndịàmà Jehova ka ihe a na-eme. Ihe a na-emekarị n’ezinụlọ ma ọ bụrụ na di na nwunye anaghị ekpe otu okpukpe.” b Ma, ọ bụrụgodị na a na-emegide Ndịàmà Jehova, ha na-agbalị eme ihe a Baịbụl kwuru: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”​—Ndị Rom 12:​17, 18.

Ihe mere Ndịàmà Jehova ji kweta na ha kwesịrị ịlụ naanị Ndịàmà Jehova ibe ha

 Ndịàmà Jehova na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ha ‘na-alụ naanị ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị,’ ya bụ, ndị ha na ha kweere otu ihe. (1 Ndị Kọrịnt 7:39) Iwu a dị na Baịbụl, ọ bakwara uru. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2010, otu isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ Journal of Marriage and Family kwuru na “ndị di na nwunye ha na nwunye ha ma ọ bụ di ha na-ekpe otu okpukpe, kwere otu ihe ma na-eme otu ihe,” na-adị n’ezigbo mma. c

 Ma, Ndịàmà Jehova anaghị agwa ụmụnna ha ka ha hapụ di ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Onyeàmà Jehova. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwunye ya na-ekweghị n’Onyenwe anyị, ma nwunye ya ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ ya. . . . Ọ bụrụkwa na e nwere nwanna nwaanyị di ya na-ekweghị n’Onyenwe anyị, ma di ya ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya.” (1 Ndị Kọrịnt 7:​12, 13) Ndịàmà Jehova na-eme ihe a Baịbụl kwuru.

a Gụọ akwụkwọ aha ya bụ Caesar and Christ, peeji nke 647.

b Gụọ gbasara ikpe e kpere n’isiokwu bụ́ Jehovah’s Witnesses of Moscow and Others v. Russia, peeji nke 26-​27, paragraf nke 111.

c Gụọ akwụkwọ bụ́ Journal of Marriage and Family, Mpịakọta nke 72, Nọmba nke 4, (Ọgọst 2010), peeji nke 963.