Gaa n'Isiokwu

Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya

Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya

 Ong-li bụ Onyeàmà Jehova bi na Bọlgeria. Ọ na-amụrụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ́ Zlatka ihe. Di Zlatka esoghị ya amụ ihe. Ong-li kwuru, sị: “Mgbe anyị na-ekwurịta ihe gbasara ezinụlọ, m na-ekwusi ya ike na ọ dị mkpa ịgwa di anyị na ụmụ anyị na anyị hụrụ ha n’anya. O wutere Zlatka mgbe m kwuru ihe a. O kwuru na ya agwatụbeghị di ya na nwa ya nwaanyị dị afọ itoolu na ya hụrụ ha n’anya.”

 Zlatka kwuru, sị: “Adị m njikere imere ha ihe ọ bụla, mana agaghị m agwali ha na m hụrụ ha n’anya.” O kwukwara, sị: “O nweghị mgbe mama m gwatụrụ m na ya hụrụ m n’anya, o nweghịkwa mgbe mama nke ya gwara ya na ọ hụrụ ya n’anya.” Ong-li gosiri Zlatka na e nwere mgbe Jehova ji olu dara ụda kwuo na ya hụrụ Jizọs n’anya. (Matiu 3:​17) Ọ gwara Zlatka ka ọ rịọ Jehova n’ekpere gbasara ya ma kpebisie ike ịna-agwa di ya na nwa ya nwaanyị na ya hụrụ ha n’anya.

 Ong-li kwuru, sị: “Mgbe ụbọchị abụọ gachara, Zlatka ji obi ụtọ gwa m na ya rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nyere ya aka. Mgbe di ya lọtara, ọ gwara ya na ya amụtala na Baịbụl mkpa ọ dị ka nwunye na-akwanyere di ya ùgwù ma hụkwa ya n’anya. Ọ gwaziri ya na ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Mgbe nwa ya nwaanyị lọtara, Zlatka makụrụ ya ma gwa ya na ya hụrụ ya n’anya. Zlatka gwara m na ahụ́ eruola ya ala ugbu a. Kemgbe ọtụtụ afọ, m bu ihe ndị a naanị n’obi ma ghara ịna-ekwupụta ya ekwupụta. Mana, Jehova enyerela m aka mụ enwee ike ịgwa ndị ezinụlọ m na m hụrụ ha n’anya.’

Ong-li ka na-aga amụrụ ndị agbata obi ya Baịbụl

 Ong-li kwuru, sị: “Mgbe otu izu gachara, m hụrụ di Zlatka, ya asị m: ‘Ọtụtụ ndị agwala m ka m ghara ikwe ka gị na Zlatka na-amụ Baịbụl. Ma, o doro anya na Baịbụl ọ na-amụ na-abara ezinụlọ anyị uru. Anyị adịkwuola ná mma ugbu a, na-enwekwukwa obi ụtọ.’”