Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“M Ji Aka M Na-egwu Ili M”

“M Ji Aka M Na-egwu Ili M”
  • AFỌ A MỤRỤ M: 1978

  • EBE M SI: El Salvadọ

  • NDỤ M BIRI: M Na-emebu Ihe Ike, Nọrọkwa n’Òtù Ọjọọ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 E nwere onye gwara m, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ n’eziokwu ịmụta banyere Chineke, ahapụkwala Ndịàmà Jehova.” Mgbe ọ gwara m ihe a, ọ tụrụ m n’anya. Mgbe ahụ, mụ na Ndịàmà Jehova ka bidoro ịmụ ihe. Ma, ka m kọtụgodị gbasara onwe m ka i nwee ike ịghọta ihe mere okwu ahụ ji tụọ m n’anya.

 A mụrụ m na Kwezaltepekiu, bụ́ otu obodo dị n’El Salvadọ. Abụ m nwa nke isii n’ime ụmụ iri na ise mama m na papa m mụrụ. Ndị mụrụ m kụziiri m ịna-akpa àgwà ọma ma na-erubere iwu isi. E nwekwara Ndịàmà Jehova na-abịa mgbe ụfọdụ amụrụ anyị Baịbụl. Aha otu n’ime ha bụ Leonardo. Ma, e nweghị ihe m ji ihe a kụziiri m kpọrọ. M mekwara ọtụtụ mkpebi na-adịghị mma. Mgbe m dị afọ iri na anọ, m malitere iso ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ na-aṅụ mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ike. Ha bịara jiri otu otu kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ma banye n’òtù ọjọọ. M mechakwara soro ha. Anyị na-agagharị n’okporo ámá na-amanye ndị mmadụ inye anyị ego, na-ezukwa ohi ka anyị nweta ego anyị ga-eji na-aṅụ mmanya na ọgwụ ike.

 M jizi ndị òtù m mere ndị ezinụlọ m. M ma na m kwesịrị ịna-eme ihe ndị gosiri na m kwụ ha n’azụ. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, otu onye òtù m ṅụrara ọgwụ ike anya gaa baa otu onye agbata obi m ọgụ. Mgbe ha na-alụ ọgụ, onye agbata obi m ahụ mechara jichie ya, ma kpọọ ndị uwe ojii. Ihe a were m ezigbo iwe, mụ eburu okpiri na-akụkasị ụgbọala onye agbata obi m ka o nwee ike ịhapụ enyi m. Mgbe m nọ na-akụwasị glas ndị dị n’ụgbọala ya, ọ nọ na-arịọ m ka m kwụsị imebisi ụgbọala ya, ma ekweghị m. 

 Mgbe m dị afọ iri na asatọ, ndị òtù m na ndị uwe ojii lụrụ ọgụ. Mgbe m chọrọ ịtụ ha bọmbụ anyị rụrụ, ọ gbawara n’aka m. Amaghị m otú ihe a si mee. Ihe m nwere ike icheta bụ na m hụrụ na aka m gbara righirighi, mụ atụbọọkwa. Ebe m tetaziri bụ n’ụlọ ọgwụ. Mgbe ahụ ka m matara na aka nri m adịghịzi, ejighịzi m ntị aka nri m anụ ihe, ọ fọkwara obere ka anya aka nri m kpọọ.

 N’agbanyeghị na m merụrụ ezigbo ahụ́, mgbe m pụtara n’ụlọ ọgwụ, m laghachikwuuru ndị òtù m. O teghị aka, ndị uwe ojii anwụchie m, a tụọkwa m mkpọrọ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka adị ná mma mụ na ndị òtù m bịara sikwuo ike. Anyị na-emekọ ihe niile ọnụ, si na mgbe anyị na-eri nri ụtụtụ ma ṅụọ ìgbó ruo mgbe anyị na-alaba ụra n’abalị.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, Leonardo bịara leta m. Mgbe mụ na ya nọ na-akparịta, ọ tụrụ aka n’egbugbu m gburu n’aka nri m ma jụọ m, sị: “Ị̀ ma ihe akara atọ ndị a dị n’egbugbu a i gburu pụtara?” Mụ asị ya: “Ehenụ. Ọ pụtara mmekọahụ, ọgwụ ike na egwú.” Ma Leonardo gwara m, sị: “Ihe mụnwa ga-agwa gị bụ na ha pụtara ụlọ ọgwụ, ụlọ mkpọrọ na ọnwụ. Ị gaala ụlọ ọgwụ, ugbu a ị nọzị n’ụlọ mkpọrọ. Ị mazi ihe ọ fọrọ.”

 Ihe ahụ Leonardo kwuru metụrụ m n’ahụ́. O kwuru eziokwu. M ji aka m na-egwu ili m. Leonardo gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl, mụ ekweta. Ihe ndị m mụtara na Baịbụl mere ka m gbanwee ndụ m. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ihe mbụ m kwesịrị ime bụ ịchọta ndị enyi ọhụrụ. Ọ bụ ya mere m ji kwụsị ịga nnọkọ ndị òtù m na-enwe ma gawazie ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enwe n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe m gara ọmụmụ ihe ahụ, m hụrụ otu onye mkpọrọ aha ya bụ Andrés. E mere ya baptizim n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. Ọ gwara m ka mụ na ya soro na-eri nri ụtụtụ. Kemgbe ahụ, anaghịzi m eji ìgbó asa ezé ụtụtụ. Kama, mụ na Andrés na-ekwurịta otu amaokwu Baịbụl kwa ụtụtụ.

 Ndị òtù m chọpụtara ozugbo na mụ agbanwewela. N’ihi ya, otu n’ime ndị isi n’òtù anyị gwara m na e nwere ihe ọ chọrọ ka mụ na ya kwuo. Obi wụnyere m n’afọ. Amaghị m ihe ọ ga-eme m ma ọ mata ihe m chọrọ ime, n’ihi na ọ naghị adị mfe mmadụ isi n’òtù ọjọọ pụta. Ọ gwara m, sị: “Anyị achọpụtala na ị naghịzi abịa nnọkọ anyị, kama, ị na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Olee ihe ị chọrọ ime?” M gwara ya na m chọrọ ịna-amụ Baịbụl, nakwa na m chọrọ ịgbanwe ndụ m. O juru m anya na ọ gwara m na ha agaghị enye m nsogbu ma ha hụ n’eziokwu na m chọrọ ịghọ Onyeàmà Jehova. Ya agwazie m, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ n’eziokwu ịmụta banyere Chineke, ahapụkwala Ndịàmà Jehova. Anyị na-atụnụ anya na ị ga-akwụsị ihe ọjọọ. Obi di m ụtọ maka ihe a ị chọrọ ime. Ihe a ị chọrọ ime dị mma. Ndịàmà Jehova ga-enyeliri gị aka. Mụ na ha mụrụ Baịbụl mgbe m nọ n’Amerịka. Ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ụjọ atụkwala gị. Elela anya n’azụ.” Ụjọ ka ji m mgbe ọ na-ekwu ihe a, ma obi tọkwara m ezigbo ụtọ. M kelere Jehova Chineke n’ime obi m. M dịzi ka onye a tọpụrụ n’agbụ. Mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara. Ọ sịrị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:32.

 E nwere oge ndị mụ na ha na-akpabu ji ọgwụ ike nwaa m. Ma, ịgwa gị eziokwu, o nwekwara mgbe ụfọdụ ha nwatara m. Ma, ka oge na-aga, mgbe m kpesiri ekpere ike, m kwụsịrị ihe ọjọọ niile m na-emebu.—Abụ Ọma 51:10, 11.

 Mgbe a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ, ọtụtụ ndị chere na m ga-alaghachi ná ndụ ọjọọ m na-ebibu, ma emeghị m otú ahụ. Kama, m na-agakarị n’ụlọ mkpọrọ ahụ ọtụtụ oge ịgwa ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ihe m mụtara na Baịbụl. N’ikpeazụ, ndị enyi m mbụ kwetara na mụ agbanweela. Ma, ndị òtù ọzọ anyị na ha na-adịghị ná mma ekwetaghị.

 Otu ụbọchị anyị gara ozi ọma, ndị òtù ọzọ ahụ anyị na ha na-adịghị ná mma, bụ́ ndị chọburu igbu m, ji ngwá ọgụ gbaa mụ na onye mụ na ya so gburugburu. Onye mụ na ya so katara obi ma jiri nwayọọ gwa ha na mụ anọghịzi n’òtù. Mgbe ihe a nọ na-eme, m gbalịrị jide onwe m. Mgbe ha kụchara m ihe ma gwa m ka m ghara ịbịa ebe ahụ ọzọ, ha hapụrụ anyị. Baịbụl gbanwere ndụ m n’eziokwu. Ọ bụrụ mgbe mbụ, m gaara agbalị megwara ha ihe ha mere m. Ma ugbu a, m na-eme ihe Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:15. Ebe ahụ sịrị: “Hụnụ na ọ dịghị onye ji ihe ọjọọ na-akwụ onye ọ bụla ọzọ ụgwọ ihe ọjọọ, kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.”

 Kemgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova, m na-agba mbọ ịkwụwa aka ọtọ. Ọ dịcharaghị m mfe. Ma, Jehova Chineke, ihe ndị m mụtara na Baịbụl nakwa ndị enyi m, enyerela m aka ịna-akwụwa aka ọtọ. Achọtụghị m ịlaghachị n’ụdị ndụ m biri na mbụ.—2 Pita 2:22.

URU NDỊ M RITERELA

 Na mbụ, m na-eme ihe ike, na-ewekwa iwe ọkụ. O doro m anya na agaraghị m adị ndụ taa ma a sị na m ka na-ebi ụdị ndụ ahụ m biri na mbụ. Ihe ndị m mụtara na Baịbụl emeela ka m gbanwee. M kwụsịrị ibi ndụ ọjọọ m na-ebibu. M mụtala otú mụ na ndị bụbu ndị iro m ga-esi na-adị n’udo. (Luk 6:27) Ndị mụ na ha na-akpakwa ugbu a na-enyere m aka ịkpa àgwà ọma. (Ilu 13:20) Obi na-atọ m ụtọ ugbu a, ndụ m enweekwala isi n’ihi na m na-efe Chineke onye dị njikere ịgbaghara m ihe ọjọọ niile m mere n’oge gara aga.—Aịzaya 1:18.

 N’afọ 2006, m gara ụlọ akwụkwọ pụrụ iche maka Ndị Kraịst na-alụbeghị nwaanyị na-ezisa ozi ọma. Mgbe afọ ole na ole gachara, m lụrụ nwunye m m hụrụ n’anya. Mụ na ya na-azụ nwa anyị nwaanyị. Ugbu a, m na-eji oge buru ibu akụziri ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru nyeere m aka. Abụkwa m okenye n’ọgbakọ m nọ na ya. M na-agbakwa mbọ inyere ndị na-eto eto aka izere ime ihe ọjọọ ndị m mere mgbe m hà ka ha. Kama iji aka m na-egwu ili m, m na-emezi ihe ga-eme ka m dịrị ndụ ebighị ebi Chineke kwere nkwa ya na Baịbụl.