Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Abụbu M Onye Iwe Ọkụ”

“Abụbu M Onye Iwe Ọkụ”
  • A Mụrụ M n’Afọ: 1975

  • Abụ M Onye: Meksiko

  • Ndụ M Biri: Ana m ewe iwe ọkụ, a tụrụ m mkpọrọ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 A mụrụ m na San Juan Chankalaito, bụ́ obere obodo dị na Chiapas, nke dị na Meksiko. Ezinụlọ anyị bụ ndị agbụrụ Chol bụ́ ndị Maya. Nne na nna m mụrụ ụmụ iri na abụọ. Mụnwa bụ nke ise. Mgbe m ka na-eto eto, Ndịàmà Jehova na-amụrụ mụ na ụmụnne m Baịbụl. Ma, ọ dị mwute na e nweghị ihe m ji ihe Baịbụl na-akụzi kpọrọ n’oge ahụ.

 Mgbe m dị afọ iri na atọ, m na-aṅụ ọgwụ ike, na-ezukwa ohi. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka m hapụrụ ụlọ, na-agagharị ebe dị iche iche. Mgbe m dị afọ iri na isii, m malitere ịrụ ọrụ n’ugbo a na-akọ ìgbó. M rụrụ ọrụ ebe ahụ ihe dị ka otu afọ. Otu abalị, ka anyị ji ụgbọ mmiri buru ìgbó buru ibu na-aga, ụmụ nwoke ji égbè lụsowere anyị ọgụ. Hanwa bụkwa ndị na-atụ mgbere ìgbó. Ha agbataghị m égbè n’ihi na m mabara n’ime mmiri, pụtazie n’ofe nke ọzọ. M mechaziri gbaga Amerịka.

 M malitekwara ibu ọgwụ ike n’Amerịka ebe ahụ, o mekwara ka m na-abakwu ná nsogbu. Mgbe m dị afọ iri na itoolu, a nwụchiri m ma tụọ m mkpọrọ. Ihe mere e ji tụọ m kpọrọ bụ na m zuru ohi, fọkwa obere ka m gbuo mmadụ. N’ụlọ mkpọrọ, m banyere n’òtù ndị na-eme ihe ike, na-emekwukwa ihe ike. Ihe a mere ka e tinye m n’otu ụlọ mkpọrọ a rụkpọrọ arụkpọ nke dị na Lewisburg, dị na Pensụlvenịa.

 Àgwà m bịara kakwuo njọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Lewisburg. Ebe ọ bụ na m gburu egbugbu ndị òtù anyị n’ahụ́, o sighiri m ike ịbanyekwa n’òtù ahụ. M bịara na-emekwu ihe ike karịa na mbụ, na-alụ ọgụ mgbe niile. E nwere otu mgbe ndị òtù anyị na ndị òtù ọzọ lụrụ ezigbo ọgụ n’ụlọ mkpọro. Anyị ji osisi na mkpirikpi ígwè lụọ ọgụ ahụ. Ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ gbara tịa gas ebe ahụ anyị na-alụ ọgụ iji mee ka anyị kwụsị ọgụ ahụ. Mgbe ihe ahụ mechara, ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ tinyeziri m n’ime ụlọ mkpọrọ a na-etinye ndị mkpọrọ obi fere azụ. Abụ m onye iwe ọkụ, m na-akparịkwa mmadụ. Ọ naghị esiri m ike ịkụ mmadụ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-amasị m ịkụ mmadụ ihe. Ihe ndị a m na-eme anaghịkwanụ ewute m.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 N’ụlọ mkpọrọ ikpeazụ ahụ e tinyere m, a naghị ekwekarị m pụta èzí. N’ihi ya, m malitere ịgụ Baịbụl ka m were ya na-egbu oge. E mechara otu onye nche enye m otu akwụkwọ aha ya bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. a Ka m na-agụ akwụkwọ ahụ, m nọ na-echeta ihe ndị m mụtara na Baịbụl mgbe mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ka oge na-aga, m chebaara onwe m echiche ma hụ otú àgwà m jọruru ná njọ na ihe àgwà ọjọọ m kpataarala m. M chetakwara ndị ezinụlọ anyị. Ebe ọ bụ na ụmụnne m ndị nwaanyị abụọ aghọọla Ndịàmà Jehova, m gwara onwe m sị: ‘Ha ga-adị ndụ ebighị ebi.’ M jụziri onwe m sị, ‘Gịnịdị ji m?’ Ọ bụ mgbe ahụ ka m bịaziri kpebie na m ga-agbanwe.

 Ma, ama m na agaghị m agbanweli àgwà ọjọọ ndị ahụ n’onwe m. Ọ bụ ya mere m ji kpee ekpere, rịọ Chineke ka o nyere m aka. Ihe ọzọ m mere bụ idegara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Amerịka akwụkwọ ozi, gwa ha na m chọrọ ka mmadụ bịa na-amụrụ m Baịbụl. Alaka ụlọ ọrụ ahụ haziri ka ọgbakọ dị nso ebe ahụ m nọ kpọtụrụ m. N’oge ahụ, anaghị ekwe ka onye ọzọ bịa leta m ma ọ́ bụghị ndị ezinụlọ anyị. N’ihi ya, otu nwanna si n’ọgbakọ ahụ malitere izitere m ma akwụkwọ ozi ma akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ihe ndị a ọ na-ezitere m gbara m ume ma mee ka m kpebisikwuo ike ịgbanwe.

 Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ m mere bụ ikpebi ịhapụ òtù ọjọọ ahụ m nọrọla na ya kemgbe ọtụtụ afọ. Ebe ọ bụ na onyeisi ndị òtù anyị nọkwa n’ụlọ mkpọrọ ahụ m nọ, m gakwuuru ya mgbe anyị gara imega ahụ́ ma gwa ya na m chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova. O juru m anya mgbe ọ gwara m, sị: “Ọ bụrụ eziokwu na ọ bụ ihe ị chọrọ ime, mewe ya. Agaghị m egbochi gị ife Chineke. Ma, ọ bụrụ na ihe mere iji eme ya bụ naanị na ị chọrọ ịhapụ òtù anyị, ị ma ihe ọ ga-akpatara gị.”

 N’ime afọ abụọ m malitere mụwa Baịbụl, ndị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ chọpụtara na agbanwewela m. O meziri ka ha metụwara m ebere. Dị ka ihe atụ, ndị nche kwụsịrị ịtụ m ịga ma ha si n’ọnụ ụlọ mkpọrọ m nọ na ya duru m gawa ka m gaa saa ahụ́. Otu n’ime ha bịakwutere m, gwa m na m jide nke m ji ná mgbanwe ndị m na-eme. Ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụtadịrị m n’ụlọ mkpọrọ ahụ a na-etinye ndị mkpọrọ obi fere azụ n’afọ ikpeazụ m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, tinyezie m n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. N’afọ 2004, mgbe m nọrọla n’ụlọ mkpọrọ afọ iri, a tọhapụrụ m ma gbaara m ụgbo nwa mkpi, jiri ụgbọala ndị mkpọrọ bulata m Meksiko.

 Ozugbo m lọtara Meksiko, m chọtara Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Uwe m yi gaa ọmụmụ ihe mbụ m bụ ụwe ndị mkpọrọ n’ihi na ọ bụ naanị ya bụ uwe dị mma m nwere. N’agbanyeghị otú m dị, Ndịàmà Jehova nabatara m nke ọma. Otú ha si jiri obiọma nabata m mere ka m mara na ha bụ ezigbo Ndị Kraịst. (Jọn 13:35) N’ụbọchị ahụ, ndị okenye haziri ka e nwee onye ga na-amụrụ m Baịbụl. Mgbe otu afọ gachara, ya bụ, na abalị atọ n’ọnwa Septemba afọ 2005, m mere baptizim, ghọzie Onyeàmà Jehova.

 Na Jenụwarị afọ 2007, m malitere ozi oge niile, na-eji awa iri asaa na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl kwa ọnwa. N’afọ 2011, m gara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị (ihe a na-akpọzi ya ugbu a bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze). Ụlọ akwụkwọ ahụ nyeere m ezigbo aka ịrụ ọrụ ndị m na-arụ n’ọgbakọ nke ọma.

M na-enwezi obi ụtọ ugbu a n’ihi na m na-akụziri ndị mmadụ otú ha na ibe ha ga-esi na-adị n’udo

 N’afọ 2013, m lụrụ nwunye ọma m aha ya bụ Pilar. Ọ na-eji egwuregwu ekwu na ọ na-esiri ya ike ikweta na m biri ụdị ndụ m gwara ya na m biri na mbụ. Agaghachighị m biwe ụdị ndụ ahụ m biri na mbụ. Ma mụnwa ma nwunye m kwetara na ụdị ndụ m na-ebizi ugbu a gosiri n’eziokwu na Baịbụl na-agbanwe ndụ mmadụ.​—Ndị Rom 12:2.

URU NDỊ M RITERELA

 M kwetara na m so ná ndị Jizọs kwuru gbasara ha na Luk 19:10. N’ebe ahụ, ọ sịrị: “[M] bịara ịchọ na ịzọpụta ihe furu efu.” Ọ naghịzi adị m ka ndụ m enweghị isi. Anaghịzikwanụ m akụ mmadụ ihe. Obi dị m ụtọ na Baịbụl emeela ka m mara ihe kacha mma m ga-eji ndụ m na-eme, otú mụ na ndị mmadụ ga-esi na-adị n’udo, nakwa nke ka nke, otú mụ na Jehova, bụ́ onye kere m, ga-esi adị ná mma.

[IHE E DERE N’ALA ALA PEEJI]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a naghịzi ebipụta ya. Akwụkwọ bụ́ isi ha ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl ugbu a bụ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?