Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Anaghịzi M Agbara Tigbuo Zọgbuo Ohu”

“Anaghịzi M Agbara Tigbuo Zọgbuo Ohu”
  • A mụrụ m n’afọ: 1956

  • Abụ m onye: Kanada

  • Ndụ m biri: Ike ụwa gwụrụ m, mụ ana-akwa iko aghara aghara, na-emekwa tigbuo zọgbuo

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 A mụrụ m n’obodo Calgary, na steeti Albeta dị na Kanada. Papa m na mama m gbara alụkwaghịm mgbe m dị obere, n’ihi ya, mụ na mama m gaziri biri na nke papa ya na mama ya. N’eziokwu, ha hụrụ mụ na mama m n’anya, obi na-adịkwa m ụtọ mgbe niile. M cheta otú obi si eru m ala oge ahụ m dị obere, obi na-atọ m ụtọ.

 Mgbe m dị afọ asaa, anyị malitere inwe nsogbu mgbe mama m na papa m lụrụ ọzọ, anyị akwaga n’obodo Sent Luwis, na Steeti Mizuri dị n’Amerịka. O teghị aka, mụ achọpụta na obi fere papa m azụ. Dị ka ihe atụ, mgbe m si ụlọ akwụkwọ lọta ụbọchị mbụ m gara akwụkwọ n’obodo ahụ, ọ chọpụtara na ụmụ akwụkwọ ibe m kụrụ m ihe, ma akụgwaraghị m ha. Ezigbo iwe were ya, ya akụọ m ihe karịrị nke ha kụrụ m. M matara na o ji ya kụziere m ịna-emegwara ndị ọzọ ihe ha mere m. N’ihi ya, m lụrụ ọgụ nke mbụ ná ndụ m mgbe m dị naanị afọ asaa.

 Obi anaghị adị mama m mma maka na papa m na-ewe iwe ọkụ, ha na-esekwa okwu mgbe niile. Mgbe m dị afọ iri na otu, m malitere ịṅụ ọgwụ ike, na-aṅụkwa oké mmanya. Ka chi na-abọ, àgwà m na-akakwu njọ, mụ na ndị mmadụ na-alụkarịkwa ọgụ. Tupu m gụchaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ihe e jizi mara m bụ tigbuo zọgbuo.

 Mgbe m dị afọ iri na asatọ, m bara amị ma soro ndị agha ụgbọ mmiri Amerịka. Ihe ha kụziiri m mere ka m mara ụzọ dị iche iche e si egbu mmadụ. Mgbe afọ ise gachara, m kwụsịrị ọrụ amị ma gaa ka m gụọ banyere akparamàgwà ụmụ mmadụ. M bu n’obi na m gụchaa, m ga-enweta ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Etiti nke Na-eme Nchọpụta Maka Mpụ. Ọ bụ n’Amerịka ka m nọ malite ịgụ akwụkwọ na mahadum, ma m mechara kwaga Kanada nọrọ ebe ahụ gụchaa.

 Mgbe m nọ na mahadum, otú ndị mmadụ si akpa àgwà mere ka ike ụwa gwụ m. Ndị mmadụ na-echekarị gbasara onwe ha. Ọ dị m ka e nweghị uru ihe niile dị n’ụwa a bara, dịkwa m ka nsogbu ụmụ mmadụ enweghị mmekwata. M ghọtara na ụmụ mmadụ agaghị emeli ka ihe dị mma n’ụwa a.

 Ebe ọ bụ na amaghị m ihe m dị ndụ eme, m malitere ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ oké mmanya, ịchụ ego ọnwụ ọnwụ, na ịkwa iko aghara aghara. M na-esi n’otu oriri na nkwari gaa n’ọzọ, na-agbanwekwa ụmụ nwaanyị ka uwe. Ihe ndị m mụtara mgbe ahụ m bụ onye amị mere ka obi sie m ike ịna-alụ ọgụ mgbe niile. E nwere ihe ndị m chere bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, m na-alụsokwa onye ọ bụla na-eme ihe m chere na ọ dịghị mma ọgụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na otú ahụ m si ebi ndụ mere ka m na-agbara tigbuo zọgbuo ohu.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 Otu ụbọchị, ka mụ na otu enyi m nwoke nọ na veranda ụlọ m na-aṅụ ọgwụ ike ma na-ahazi otú anyị ga-esi ebugara ndị ahịa anyị ìgbó ha ga-azụ, ọ jụrụ m ma m̀ kwetara na Chineke dị. M sịrị ya, “Ọ bụrụ na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa, achọghị m ịma gbasara ya.” N’echi ya, bụ́ ụbọchị mbụ m gara ọrụ ebe ọhụrụ m nwetara ọrụ, otu Onyeàmà Jehova mụ na ya na-arụkọ ọrụ jụrụ m, sị, “Ì chere na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa?” Ihe a ọ jụrụ m juru m anya maka na mụ na enyi m ka kwupụrụ gbasara ya, o mekwara ka m chọọ ịmata ihe bụ́ azịza ya. Otu a ka mụ na ya si malite ikwurịta ọtụtụ ihe gbasara Baịbụl ruo ọnwa isii, o jikwa Baịbụl zaa m ajụjụ ndị tara akpụ m jụrụ ya gbasara ndụ.

 Mụ na onye m chọrọ ịlụ bi mgbe ahụ, ọ chọghịkwa ka m na-agwa ya gbasara ihe ndị ahụ m na-amụta. Ma otu ụbọchị Sọnde, m gwara ya na mụ agwala Ndịàmà Jehova ka ha bịa n’ụlọ anyị na-amụrụ anyị Baịbụl. Mgbe m lọtara ọrụ echi ya, m hụrụ na ọ kwakọrọla ihe niile dị n’ụlọ anyị laa. M pụrụ n’èzí ma bewe ákwá. M kpekwara ekpere rịọ Chineke ka o nyere m aka. Ekpere a bụ ekpere mbụ m nọ na-ekpe kpọọ Chineke aha ya bụ́ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

 Ka ụbọchị abụọ gara, di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ m Baịbụl. Ọ bụ ya bụ nke mbụ mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Mgbe ha lawara, m gụwara akwụkwọ anyị ji amụ ihe. Aha akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. M gụchakwara ya n’abalị ahụ. a Ihe m mụtara gbasara Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ruru m n’obi. Ọ bịara doo m anya na Jehova nwere ọmịiko nakwa na ahụhụ anyị na-ata na-ewute ya. (Aịzaya 63:9) Ihe kacha metụ m n’ahụ́ bụ otú Chineke si hụ m n’anya nakwa otú Ọkpara ya si jiri ndụ ya chụọ àjà n’ihi m. (1 Jọn 4:10) Aghọtaziri m na Jehova nọ na-enwere m ndidi kemgbe “n’ihi na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Ọ dị m ka Jehova chọrọ ka mụ na ya bụrụ enyi.​—Jọn 6:44.

 Ọ bụ n’izu ahụ ka m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị na m bu ogologo ntutu, yiri iyeri ntị, jiekwa ejiji na-emenye mmadụ ụjọ, ha nabatara m ka à ga-asị na m bụ nwanne ha ha na-ahụbeghị kemgbe ọtụtụ afọ. Ha kpara àgwà e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Ha mere nnọọ ka obi ruo m ala otú ahụ ọ na-eru m mgbe mụ na nne na nna mama m bi, ma, ha medịrị ka obi ruo m ala karịa.

 N’egbughị oge, ihe ndị m na-amụta na Baịbụl malitere ịgbanwe ndụ m. M kpụrụ isi m, kwụsị ịkwa iko, kwụsịkwa ịṅụ ọgwụ ike na ịṅụ oké mmanya. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; 11:14) Ọ na-agụ m agụụ ime ihe dị Jehova mma. N’ihi ya, m mụta na e nwere ihe m na-eme na-adịghị ya mma, anaghị m achọ ihe m ga-akudo aka na-eme ihe ahụ. Kama, ọ na-ewuteru m n’ọkpụkpụ na m na-eme ihe na-adịghị ya mma. M na-agwa onwe m, sị, ‘Agaghịzi m eme ụdị ihe a ọzọ.’ M na-agbakwa mbọ ozugbo gbanwee otú m si eche echiche na otú m si akpa àgwà. N’ihi ya, o teghị aka, mụ ebido hụwa uru ime ihe dị Jehova mma na-abara m. Ọnwa isii m malitere ịmụ Baịbụl, ya bụ, n’abalị iri abụọ n’itoolu n’ọnwa Julaị afọ 1989, m mere baptizim bụrụzie Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA

 Baịbụl enyerela m aka ịgbanwe otú m sibu akpa àgwà. N’oge gara aga, mmadụ kpasuo m iwe, m na-alụso ya ọgụ. Ma ugbu a, m na-agbasi mbọ ike ka mụ na “mmadụ niile dịrị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Ama m na ọ bụghị n’ike m, kama m na-ekele Jehova maka otú Okwu ya na mmụọ nsọ ya si na-akpa ike ná ndụ m.​—Ndị Galeshia 5:22, 23; Ndị Hibru 4:12.

 Ugbu a, kama ịna-agbara ọgwụ ike, tigbuo zọgbuo, na agụụ ịkwa iko ohu, m na-agbazi mbọ ime ihe dị Jehova Chineke mma, na-enyekwa ya ihe ndị kacha mma m nwere. Otu ụzọ m si eme ya bụ ịkụziri ndị ọzọ banyere ya. Afọ ole na ole m mechara baptizim, m kwagara mba ọzọ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ka m soro na-ekwusa ozi ọma ebe ahụ. Kemgbe ọtụtụ afọ, m kụzierela ọtụtụ ndị ihe dị na Baịbụl ma hụ otú Baịbụl si gbanwee ndụ ha. Ọ na-emekwa ka m na-enwe ọṅụ. Obi dịkwa m ụtọ na mama m bụzi Onyeàmà Jehova ugbu a. Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ọ hụrụ otú m si gbanwee, na-akpazi àgwà ọma.

 N’afọ 1999, m so ná ndị gụchara akwụkwọ n’El Salvadọ n’ụlọ akwụkwọ a na-akpọzi Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. N’ụlọ akwụkwọ ahụ, m mụtara na m kwesịrị ịna-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, mụtakwa otú m ga-esi na-akụzi ihe ma na-elekọta ndị nọ n’ọgbakọ nke ọma. Mgbe obere oge gachara n’afọ ahụ, m lụrụ ọmarịcha nwunye m bụ́ Eugenia. Mụ na ya na-ekwusa ozi oma oge niile ugbu a na Gụatemala.

 Ugbu a, ihe ndị na-eme ná ndụ anyị anaghịzi eme ka ike ụwa gwụ m, kama m na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ime ihe Baịbụl kwuru emeela ka m gharazie ịna-agbara ịkwa iko na tigbuo zọgbuo ohu. O meekwala ka obi na-eru m ala, ndị mụ na ha na-akpa abụrụkwa ndị hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu.

a Akwụkwọ Ndịàmà Jehova na ndị mmadụ na-ejikarị amụ Baịbụl ugbu a bụ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi