Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe a bụ nkume e dere aha Tatanu na ya

Ihe Ọzọ Gosiri na Ihe Ndị A Kọrọ na Baịbụl Bụ Eziokwu

Ihe Ọzọ Gosiri na Ihe Ndị A Kọrọ na Baịbụl Bụ Eziokwu

È nwere ihe ndị mgbe ochie a chọpụtarala nke gosiri na ihe ndị a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu? N’afọ 2014, otu isiokwu gbara n’akwụkwọ aha ya bụ Biblical Archaeology Review jụrụ, sị: “Mmadụ ole a kpọrọ aha ha n’Agba Ochie ka a hụrụla aha ha n’ihe ndị oge ochie e gwupụtara n’ala?” Akwụkwọ a kwuru na “e nwere, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mmadụ iri ise.” Otu nwoke aha ya na-adịghị n’akwụkwọ ahụ bụ Tatenaị. Ma, ònye bụ Tatenaị? Ka anyị leba anya n’ihe ole na ole Baịbụl kwuru banyere ya.

E nwere oge Jeruselem so n’otu n’ime obodo ndị Peshia na-achị. Ọ dị n’ebe ndị Peshia kpọrọ n’Ofe Osimiri, nke dị n’ebe ndịda Yufretis. Mgbe ndị Peshia merichara ndị Babịlon, ha hapụrụ ndị Juu ndị Babịlọn dọọrọ n’agha ka ha laa. Ha nyere ha ikike iwughachi ụlọ nsọ Jehova na Jeruselem. (Ezra 1:1-4) Ma, mgbe ndị Juu malitere iwughachi ụlọ nsọ ahụ, ndị iro ha nyewara ha nsogbu. Ha kwuru na ihe a ndị Juu na-eme bụ ịgba ọchịchị ndị Peshia mgba okpuru. (Ezra 4:4-16) N’oge Darayọs nke Mbụ na-achị (afọ 522 ruo afọ 486 Tupu Oge Ndị Kraịst.), otu onye ọnụ na-eru n’okwu na Peshia aha ya bụ Tatenaị, bịara ka ọ chọpụta ihe na-emenụ. Baịbụl kpọrọ ya “gọvanọ ofe Osimiri Yufretis.”—Ezra 5:3-7.

E nwere ọtụtụ ihe ndị e dere na nkume n’oge ochie a chọpụtara na aha a bụ́ Tatenaị dị na ha. Nkume ndị ahụ nwere ike iso n’arịa ezinụlọ ha nwere n’oge ochie. E nwere nke e dere nkwa mmadụ kwere ịkwụ ụgwọ o ji na ya. E ji ihe ahụ mata na Tatenaị a na-ekwu okwu ya bụ nke ahụ Baịbụl kwuru okwu ya. E dere ya n’afọ 502 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ, n’afọ nke iri abụọ Darayọs nke Mbụ na-achị. A kpọrọ otu onye akaebe aha ya dị ná nkwa ahụ ohu “Tatanu bụ́ gọvanọ ofe Osimiri.” Tatanu a bụ Tatenaị ahụ a kpọrọ aha n’akwụkwọ Ezra.

Gịnị bụ ọrụ nwoke a? N’afọ 535 Tupu Oge Ndị Kraịst, Saịrọs Onye Ukwu haziri obodo dị iche iche ọ na-achị n’ógbè n’ógbè. A kpọrọ otu n’ime ha Babịlọn na Ofe Osimiri. E mechara kewaa ógbè ahụ ụzọ abụọ ma kpọọ otu n’ime ha Ofe Osimiri. Obodo ndị so n’ógbè a bụ Sameria, Juda, Finishia, na Kole Siria. Ọ ga-abụ na Tatenaị nọ na Damaskọs na-achị ha. Ọ chịrị ha malite n’afọ 520 ruo n’afọ 502 Tupu Oge Ndị Kraịst.

Mgbe Tatenaị gachara Jeruselem ka o leba anya n’ebubo ahụ e boro ndị Juu na ha na-agba ọchịchị ndị Peshia mgba okpuru, ọ gwara Darayọs na ha sịrị na ọ bụ Saịrọs nyere ha ikike iwughachi ụlọ nsọ Jehova. Darayọs nyere iwu ka e mee nchọpụta n’ụlọ a na-edebe ihe ndekọ n’obí eze. Ha chọpụtara na ihe ahụ ndị Juu kwuru bụ eziokwu. (Ezra 5:6, 7, 11-13; 6:1-3) N’ihi ya, Darayọs nyere Tatenaị iwu ka ọ ghara inye ndị Juu nsogbu, o mekwara ihe eze kwuru.—Ezra 6:6, 7, 13.

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị oké ihe “Tatenaị, bụ́ gọvanọ ofe Osimiri Yufretis,” mere nke mere a ga-eji hụ aha ya n’ọtụtụ ihe ndị oge ochie. Ma, ị̀ hụrụ na a kpọrọ aha ya na Baịbụl, kpọọkwa ya gọvanọ, bụ́ ihe ọ bụ n’oge ahụ? Ihe a bụ ihe ọzọ gosiri na ihe ndị mgbe ochie e gwupụtara n’ala na-egosi na ihe ndị a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu.