Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Àgwà M Jọgburu Onwe Ya”

“Àgwà M Jọgburu Onwe Ya”
  • A mụrụ m n’afọ: 1960

  • ABỤ M ONYE: FINLAND

  • NDỤ M BIRI: ANA M AGỤ EGWÚ RỌK

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

M toro n’otu obodo a na-akpọ Tọọku. Obodo a nwere ọdụ ụgbọ mmiri, ndị bi na ya abaghịkwa ọgaranya. Papa m bụ ọkaibe n’ịkụ ọkpọ. Ma mụ ma nwanne m nwoke m tọrọ na-akụkwa ọkpọ. N’ụlọ akwụkwọ, ndị mmadụ na-abakarị m ọgụ. M na-akụkwa onye ọ bụla bara m ọgụ isi aba okpu. N’oge m na-eto, m sonyeere òtù ọjọọ. Òtù ọjọọ ahụ mere ka mụ na ndị mmadụ na-alụkarị ọgụ. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka m matara egwú a na-akpọ egwú rọk, ya amalite ịgụ m agụụ ka m kụwa egwú a.

M zụrụ ngwá egwú ụfọdụ ma kpọta ndị mụ na ha ga na-akụ egwú. Obere oge anyị malitere, m ghọrọ onyeisi ndị na-agụ egwu n’òtù egwú a. Ọ na-atọ m ụtọ ime ara ara mgbe ọ bụla anyị na-akụ egwú. Ebe ọ bụ na òtù egwú anyị na-ejikarị ejiji ọjọọ ma na-akpa aghara ma anyị kụwa egwú, ndị mmadụ bịara mara anyị amara. Anyị malitekwara ịkụ egwú n’ihu ọtụtụ mmadụ. A kpọnyere ụfọdụ n’ime ha na teepụ. Ma nke ikpeazụ n’ime ha bịara na-ewu ewu. Tupu afọ 1990, anyị gara mba Amerịka kụọ egwú. Anyị kụrụ egwú ugboro ole na ole n’obodo Niu Yọk nakwa na Lọs Anjelis. Tupu anyị alaghachi Finland, anyị gakwara hụ ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịkụ egwú n’Amerịka.

Ọ bụ eziokwu na obi na-atọ m ụtọ na m nọ n’òtù egwú anyị a, ma ọ na-adị m ka ndụ m abachaghị uru. Otú òtù egwú dị iche iche si amarịta aka n’ịkụ egwú mere ka ike ịkụ egwú gwụ m, ndụ iberiibe m na-ebi gwụkwara m ike. Ọ bịara dị m ka m̀ bụ onye ọjọọ, m bịakwara na-atụ egwú na m ga-aga ọkụ ala mmụọ. M gụwara ụdị akwụkwọ okpukpe dị iche iche ka m mara ma m̀ ga-amata azịza nke ajụjụ ụfọdụ na-agbagwoju m anya. M kpesikwara ekpere ike ka Chineke nyere m aka n’agbanyeghị na ọ na-adị m ka agaghị m emeli ihe dị ya mma.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

M bidoziri ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-ezipụ akwụkwọ ozi ka m nwee ike na-akpa afọ m. Otu ụbọchị, m chọpụtara na otu n’ime ndị mụ na ha na-arụ ọrụ bụ Onyeàmà Jehova. M jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ. Otú o si jiri Akwụkwọ Nsọ zaa m ajụjụ ndị ahụ nke ọma masịrị m. Nke a mere ka m kweta ka ọ kụziwere m Baịbụl. Mgbe izu ole na ole gafere,  a kpọrọ òtù egwú anyị ka anyị bịa kụọ egwú nke e nwere ike iwepụta ná mba Amerịka. Ọ bịara dị ka ihe a ọ̀ bụ ohere ọma m na-ekwesịghị ikwe ka ọ kwaa m.

M gwara Onyeàmà Jehova ahụ na-akụziri m Baịbụl na m chọrọ ịkụpụta egwú ọhụrụ, na m kụchahaala ya, m ga-amalite ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ gwaghị m ihe yanwa chere. Naanị ihe o mere bụ na ọ gwara m ka m gụọ ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:24. Ebe ahụ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ.” Mgbe m ghọtara ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara, o nyeghị m ọnụ okwu. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gafere, m gwara onye ahụ na-akụziri m Baịbụl ihe tụrụ ya n’anya. M gwara ya na mụ ahapụla otú egwú ahụ maka na m chọrọ ime ihe Jizọs kwuru.

Baịbụl dị ka enyo nke nyeere m aka ịhụ ebe m na-anaghị emete nke ọma. (Jems 1:22-25) O mere ka m hụ na àgwà m jọgburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, m dị mpako ma nwee oké ọchịchọ. Okwu ọjọọ na-apụtakarị m n’ọnụ, m na-alụ ọgụ, na-aṅụ sịga, ma na-aṅụ oké mmanya. Mgbe m chọpụtara otú àgwà m si dị iche n’ihe Baịbụl chọrọ ka anyị na-eme, ike onwe m gwụrụ m. N’agbanyeghị na ịgbanwe àgwà m siiri m ike, m kpebiri na m ga-agbanwerịrị ya.—Ndị Efesọs 4:22-24.

“Nna anyị nke eluigwe bụ Nna na-eme ebere, ọ na-enyekwara ndị chegharịrị echegharị aka ka ha kwụsị ichegbu onwe ha n’ihi mmehie ndị ha mere n’oge gara aga”

Ndụ ọjọọ m biri bịara na-ewutesi m ike, karịchaa, ná mmalite. Ma Onyeàmà Jehova ahụ na-akụziri m Baịbụl nyeere m ezigbo aka. Ọ gwara m ihe Baịbụl kwuru n’Aịzaya 1:18. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.” Ihe a na ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru mere ka obi sie m ike na Nna anyị nke eluigwe bụ Nna na-eme ebere, ọ na-enyekwara ndị chegharịrị echegharị aka ka ha kwụsị ichegbu onwe ha n’ihi mmehie ndị ha mere n’oge gara aga.

Mgbe m bịara mata onye Jehova bụ ma hụ ya n’anya, m kpebiri na m ga-enyefe ya onwe m. (Abụ Ọma 40:8) E mere m baptizim n’afọ 1992 ná mgbakọ mba niile nke Ndịàmà Jehova mere n’obodo Sent Pitasbọg nke dị na Rọshịa.

URU NDỊ M RITERELA:

Enwetala m ọtụtụ ndị enyi bụ́ ndị na-efe Jehova. Ọtụtụ mgbe, anyị na-anọrị kụọ egwú dị ụtọ n’ihi na egwú bụ onyinye si n’aka Chineke. (Jems 1:17) Ihe ọma pụrụ iche Chineke meere m bụ nwunye ọma o nyere m. Aha ya bụ Kristina. Mụ na ya dị n’ezigbo mma. M na-akọrọ ya ihe niile dị m n’obi, ma ihe ndị na-eme m obi ụtọ ma nsogbu ọ bụla m nwere.

A sị na mụ abụbeghị Onyeàmà Jehova, o nwere ike ịbụ na mụ anwụọla. N’oge gara aga, m na-abanyekarị ná nsogbu. Ugbu a, ndụ m enweela isi, ihe niile adịla otú ha kwesịrị ịdị.