Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Aka Ndị Amụma Gbasara Chineke

Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Aka Ndị Amụma Gbasara Chineke

N’oge ochie, Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya gwa ndị mmadụ okwu ndị dị mkpa. Olee ihe okwu ndị ahụ Chineke gwara ha na-akụziri anyị gbasara Chineke? Ka anyị hụ ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị amụma atọ ji obi ha niile jeere Chineke ozi.

EBREHAM

Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ chọkwara ịgọzi mmadụ niile.

Chineke kwere Ebreham onye amụma nkwa na ‘ezinụlọ niile nke ala ga-agọzi onwe ha site na ya.’​—Jenesis 12:3.

Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ọ chọkwara ịgọzi ezinụlọ niile na-erubere ya isi, ma ndị nwoke, ma ndị nwaanyị ma ụmụntakịrị.

MOZIS

Chineke na-eme ebere, ọ na-agọzikwa ndị na-achọsi ike ịmata ya.

Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nyere Mozis onye amụma ike ịrụ nnukwu ọrụ ebube. N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis kpere ekpere, sị: “Mee ka m mara ụzọ gị, ka m wee mara gị, ka ihe m wee masị gị.” (Ọpụpụ 33:13) Obi tọrọ Chineke ụtọ n’ihi ihe a Mozis riọrọ ya, o mekwara ka Mozis matakwuo ụzọ ya na àgwà ya. Dị ka ihe atụ, Mozis mụtara na Onye kere anyị bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara.”​—Ọpụpụ 34:​6, 7.

Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Chineke chọrọ ịgọzi anyị, ma ndị nwoke, ma ndị nwaanyị ma ụmụntakịrị, ma ọ bụrụ na anyị agbalịa mata ya nke ọma. O kwuru n’Akwụkwọ Nsọ otú anyị ga-esi na-efe ya. O kwukwara na ya dị njikere ịgozi anyị.

JIZỌS

Ọ bụ ọmịiko Jizọs nweere ndị mmadụ mere ka ọ gwọọ ha ọrịa ha na-arịa

Chineke ga-agọzi anyị ruo mgbe ebighị ebi ma anyị mụọ gbasara Jizọs, ihe ndị o mere na ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ.

Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe na Baịbụl gbasara ndụ Jizọs na ihe ndị ọ kuziiri ndị mmadụ. Chineke nyere Jizọs ike o ji rụọ ọtụtụ ọrụ ebube. Ụfọdụ n’ime ha bụ na Jizọs mere ka ndị ìsì hụwa ụzọ, mee ka ndị ogbi kwuwe okwu, meekwa ka ndị ngwọrọ gawa ije. Jịzọs kpọlitedịrị ndị nwụrụ anwụ. Jizọs ji ọrụ ebube ndị ahụ gosi otú Chineke ga-esi agọzi ndị mmadụ n’ọdịnihu. O kwuru ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme iji nweta ngọzi ndị ahụ. O kwuru, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”​—Jọn 17:3.

Jizọs na-eme amara, nwee ọmịiko, na-emekwa ebere. Ọ gwara ndị mmadụ sị: ‘Mụtanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.’ (Matiu 11:29) Ihe a ọ gwara ha mere ka ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, ndị agadi na ụmụaka bịakwute ya. Jizọs emesighị ụmụ nwaanyị ike ka ndị ọzọ dịrị ndụ n’oge ya. O ji obiọma meso ha ihe ma kwanyere ha ùgwù.

Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Jizọs mere ihe ndị gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. O ji ihe ndị ahụ kụziere anyị otú anyị kwesịrị isi na-akpaso ibe anyị àgwà.

JIZỌS ABỤGHỊ CHINEKE

Akwụkwọ Nsọ kwuru na “n’ebe anyị nọ, otu Chineke dị,” kwuokwa na Jizọs Kraịst bụ onye ozi Chineke dị umeala n’obi. (1 Ndị Kọrịnt 8:6) Jizọs kwuru hoo haa na Chineke ka ya ukwuu, kwuokwa na ọ bụ Chineke zitere ya n’ụwa.​—Jọn 11:​41, 42; 14:28. *

^ par. 17 Iji mụtakwuo banyere Jizọs Kraịst, lee nkebi nke asatọ na nke itoolu na broshọ bụ́ Real Faith​—Your Key to a Happy Life. Ọ dị na www.pr418.com.