Ọpụpụ 3:1-22

  • Mosis na osisi ogwu ọkụ na-enwu na ya (1-12)

  • Jehova kọwara aha ya (13-15)

  • Jehova gwara Mosis ihe ọ chọrọ ka o mee (16-22)

3  Mosis bidoro ịzụrụ Jetro nna nwunye ya,+ bụ́ onye nchụàjà Midian, ìgwè ewu na atụrụ. Mgbe o du ìgwè ewu na atụrụ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’ala ịkpa, o rutere Horeb, bụ́ ugwu ezi Chineke.+  Mmụọ ozi Jehova wee pụta n’ihu ya n’ọkụ na-enwu n’otu osisi ogwu.+ Ka ọ nọ na-ele anya, ọ hụrụ ọkụ na-enwu n’osisi ogwu ahụ. Ma ọkụ ahụ erepịaghị osisi ogwu ahụ.  Mosis wee sị: “Ka m gaa leruo ihe a dị ịtụnanya anya mara ihe mere na ọkụ anaghị erepịa osisi ogwu ahụ.”  Mgbe Jehova hụrụ na ọ gara ile ihe na-emenụ, o si n’osisi ogwu ahụ kpọọ ya òkù, sị: “Mosis! Mosis!” O wee sị: “Lee m.”  O wee sị Mosis: “Abịakwula nso. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”  O kwukwara, sị: “Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke Ebreham,+ Chineke Aịzik,+ na Chineke Jekọb.”+ Mosis wee kpuchie ihu ya, n’ihi na egwu na-atụ ya ile ezi Chineke anya.  Jehova kwukwara, sị: “N’eziokwu, ahụla m otú e si na-emekpa ndị m nọ n’Ijipt ahụ́, anụkwala m ákwá ha na-ebe n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ. Ama m nnọọ ahụhụ ha na-ata.+  M ga-aga ịnapụta ha n’aka ndị Ijipt+ na ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma ma dị obosara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,*+ bụ́ ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+  N’eziokwu, ákwá ndị Izrel na-ebe eruola m ntị, ahụkwala m otú ndị Ijipt si jiri aka ike na-emegbu ha.+ 10  Ugbu a, bịa ka m ziga gị ka ị gakwuru Fero, ị ga-akpọpụtakwa ndị m bụ́ ndị Izrel n’Ijipt.”+ 11  Ma Mosis gwara ezi Chineke, sị: “Ònye ka m bụ na m ga-agakwuru Fero ma kpọpụta ndị Izrel n’Ijipt?” 12  O wee sị: “M ga-anọnyere gị.+ Ihe a ga-abụkwara gị ihe àmà na ọ bụ m zigara gị: Mgbe ị kpọpụtachara ndị m n’Ijipt, unu ga-efe ezi Chineke* n’ugwu a.”+ 13  Ma Mosis gwara ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụ na mụ agakwuru ndị Izrel sị ha, ‘Chineke nna nna unu hà zitere m ka m bịakwute unu,’ ha asị m, ‘Gịnị bụ aha ya?’+ Gịnị ka m ga-agwa ha?” 14  Chineke gwara Mosis, sị: “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ* Ịbụ.”*+ Ọ sịkwara: “Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘M Ga-abụ zitere m ka m bịakwute unu.’”+ 15  Chineke wee gwa Mosis ọzọ, sị: “Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà, Chineke Ebreham,+ Chineke Aịzik,+ na Chineke Jekọb,+ zitere m ka m bịakwute unu.’ Ọ bụ ya bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi,+ ọ bụkwa ihe a ga-eji na-echeta m si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. 16  Ugbu a gawa, kpọkọta ndị okenye Izrel ma gwa ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà pụtara n’ihu m, Chineke Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ọ sịkwara: “N’eziokwu, ahụla m unu,+ hụkwa ihe a na-eme unu n’Ijipt. 17  N’ihi ya, ana m asị unu na m ga-anapụta unu n’aka ndị Ijipt na-emekpa unu ahụ́+ ma kpọga unu n’ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt,+ ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”’*+ 18  “Ha ga-ege gị ntị.+ Gị na ndị okenye Izrel ga-agakwuru eze Ijipt, unu ga-agwakwa ya, sị: ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru+ gwara anyị okwu. N’ihi ya, biko, hapụ anyị ka anyị gaa n’ala ịkpa, n’ebe ga-ewe anyị ụbọchị atọ iru, ka anyị chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà.’+ 19  Ma ama m na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa ọ gwụla ma è mere ya n’ike.+ 20  N’ihi ya, m ga-eweli aka m tie Ijipt ihe ma mee ihe niile dị ịtụnanya m ga-eme na ya. E mechaa, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.+ 21  M ga-emekwa ka ihe ndị m masị ndị Ijipt, unu agaghịkwa agba aka mgbe unu na-ala.+ 22  Nwaanyị ọ bụla ga-arịọ onye agbata obi ya, rịọkwa nwaanyị bi n’ụlọ ya ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee nakwa ákwà. Unu ga-eyiwe ha ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị. Unu ga-agbawa ndị Ijipt aka.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “ga-ejere ezi Chineke ozi.”
Gụọ A4.
Ma ọ bụ “Họọrọ.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.