Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere

Mgbe Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Mere

Mgbe nnukwu idei mmiri na ala mbize mere ka pọtọpọtọ ju ebe niile mechara na Siera Lion, otu nwoke aha ya bụ Andrew kwuru, sị: “Idei mmiri na ala mbize mebiri ihe niile anyị nwere. Na mbụ, ọ dị anyị ka nke anyị ọ̀ gwụla.”

Mgbe otu ajọ ifufe kpachara mkpamkpa n’Agwaetiti Vejin, otu nwoke aha ya bụ David kwuru, sị: “Mgbe ajọ ifufe ahụ fechara, anyị lọtara hụ na o mebiela ihe niile anyị nwere. O nyeghị anyị ọnụ okwu. Nwa m nwaanyị dara n’ala malite ibe ákwá.”

Ọ BỤRỤ na e nwetụla mgbe ọdachi na-emere onwe ya kpara gị aka, ị ga-aghọta otú ọ na-adị ndị o mere. Ọ na-eri ha ọnụ, dị ha ka ọ̀ bụ ná nrọ. Ha na-anọ ná mgbagwoju anya, na-echegbu onwe ha, ụjọ ana-atụkwa ha. Ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ndị o merela nke na ọ na-adị ha ka ọnwụ bịa gburu ha.

Ọ bụrụ na ọdachi na-emere onwe ya bibiri ihe niile i nwere, o nwekwara ike ịdị gị ka ị gaghị edili ya. O nwedịrị ike ime ka ị malite iche na ndụ ị dị enweghịzi isi. Ma, Baịbụl na-egosi na nke gị agwụbeghị, nakwa na e nwere ezigbo ihe mere obi ji kwesị isi gị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI NA-EME KA NDỤ MMADỤ NWEE ISI

Ekliziastis 7:8 kwuru, sị: “Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya.” Ọ bụrụ na ọdachi na-emere onwe ya akpaa gị aka ọjọọ, o nwere ike ịdị gị mgbe ahụ o mere ọhụrụ ka olileanya adịghịzi. Ma, ọ bụrụ na i jisie ike die ya ma na-eme ihe ndị i kwesịrị ime, ihe ga-aka mma.

Baịbụl kwuru na e nwere oge ‘a na-agakwaghị anụ mkpu ákwá ma ọ bụ mkpu arịrị.’ (Aịzaya 65:19) Ihe a ga-emezu n’Alaeze Chineke, mgbe a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. (Abụ Ọma 37:​11, 29) Ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịkwa eme ọzọ. Obi mgbawa na nsogbu niile ọ kpataara ndị mmadụ agaghịzi adị n’ihi na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile kwere nkwa na “a gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”​—Aịzaya 65:17.

Chegodị ihe a: Onye kere ihe niile ahaziela ‘ime ka anyị nwee ọdịnihu na olileanya,’ ya bụ, ka anyị biri n’Alaeze Chineke mgbe nsogbu na-agaghịzi adị. (Jeremaya 29:11) Ịmata ihe a ò nwere ike inyere gị aka? Sally, nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’isiokwu nke mbụ kwuru, sị: “Ichetara onwe gị ihe ndị mara ezigbo mma Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu ga-enyere gị aka ichefu ihe ndị merela eme na idi nsogbu ndị gị na ha na-alụ ugbu a.”

Gbalịa mụtakwuo ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya. Ime otú ahụ ga-eme ka obi sie gị ike na n’agbanyeghị ihe ọdachi ndị na-emere onwe ha kpataarala gị, ndụ ị dị ka nwere isi. Ọ ga-emekwa ka ị na-atụsi anya ike mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha na-agaghịzi adị. Ma, ka ọ dị ugbu a, ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka idi ihe ọdachi na-emere onwe ha kpataara gị. Lee ụfọdụ amaokwu Baịbụl nwere ike inyere gị aka.