Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Ego na Ịgụ Oké Akwụkwọ Hà Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Inwe Ego na Ịgụ Oké Akwụkwọ Hà Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Ọtụtụ ndị chere na mmadụ nwee ego ma ọ bụ gụọ oké akwụkwọ, na ọ gaghị enwe nsogbu n’ọdịnihu. Ha chere na mmadụ gaa mahadum na ọ ga-ama ọrụ nke ọma, ya abụrụ ezigbo nne, ezigbo nna, ma ọ bụ ezigbo nwa, baakwara obodo ya uru. Ha chekwara na mmadụ ịgụ oké akwụkwọ ga-eme ka o nweta ọrụ a ga na-akwụpụta ya ụgwọ, nakwa na ndị nwere ezigbo ego ga na-enwe obi ụtọ.

IHE ỌTỤTỤ NDỊ CHERE

Legodị ihe Zhang Chen bi na Chaịna kwuru. Ọ sịrị: “M chere na m ga-agarịrị mahadum ka m nwee ike ịba ọgaranya, nakwa na m nwetahaala ọrụ a ga na-akwụ m ezigbo ụgwọ, obi ga na-atọ m ụtọ, ndụ m enweekwa isi.”

Ọtụtụ ndị dịdị njikere ịga gụọ akwụkwọ na mahadum ndị na-ewu ewu ná mba ọzọ ka ihe nwee ike ịdịrị ha ná mma n’ọdịnihu. Ihe a na-ewuru ọtụtụ ndị ruo mgbe ọrịa koronavaịrọs bịara mee ka o siere ndị mmadụ ike isi n’obodo ha gaa obodo ọzọ. Otu akụkọ e nwetara n’afọ 2012 n’aka otu ụlọ ọrụ kwuru, sị: “Mmadụ iri ise na abụọ n’ime otu narị ụmụ akwụkwọ ọ bụla na-agụ akwụkwọ ná mba ọzọ bụ ndị Eshia.”

Ọ na-efu ndị nne na nna ọtụtụ ihe iji zụọ ụmụ ha na mahadum ná mba ọzọ. Otu nwoke aha ya bụ Qixiang, si Taịwan kwuru, sị: “Mma m na mpa m abụghị aka ji akụ̀, ma ha zigara mụ na ụmụnne m atọ Amerịka ka anyị gaa gụọ akwụkwọ.” Ezinụlọ ha kooro ụgwọ ka ha nwee ike iziga ha mahadum, ọ bụkwa ihe ọtụtụ ezinụlọ na-eme.

ỊGỤ OKÉ AKWỤKWỌ NA INWE EGO, HÀ GA-EME KA IHE DỊRỊ MMADỤ NÁ MMA?

Ọtụtụ ndị gụrụ oké akwụkwọ na ndị nwere ego anaghị enwe obi ụtọ

Ịgụ akwụkwọ nwere ike ime ka ihe dịtụrụ mmadụ ná mma, ma ụmụ akwụkwọ na-achọpụta na ọ bụghị mgbe niile ka ha na-enweta ihe ha bu n’obi gụọ akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị ahụhụ ọtụtụ ndị tara ọtụtụ afọ, nakwa nnukwu ego ha gbaziiri gụọ akwụkwọ, ha enwetaghị ụdị ọrụ ha chọrọ mgbe ha gụchara. Otu nwaanyị aha ya bụ Rachel Mui dere n’otu akwụkwọ a na-ebipụta na Sịngapọ, sị: “Ọ na-esikwuru ọtụtụ ndị gara mahadum ike inweta ọrụ.” Otu nwoke gụrụ oké akwụkwọ na Taịwan aha ya bụ Jianjie kwuru, sị: “E nweghị ihe ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ na mahadum ga-eme ma ọ́ bụghị ịnara ọrụ ndị na-enweghị otú ha si gbasa ihe ha gụrụ.”

Ndị nke nwetara ọrụ ihe ha gụrụ na mahadum nwere ike ịchọpụta na ihe anaghị agaziri ha otú ha tụrụ anya ya. Mgbe otu nwoke si Taịland aha ya bụ Niran gụchara akwụkwọ na Yurop lọta, o nwetara ọrụ ihe ọ gụrụ na mahadum. O kwuru, sị: “Asambodo mahadum m ji mere ka m nweta ọrụ a na-akwụ m ezigbo ụgwọ n’otu ụlọ ọrụ, otú m tụrụ anya ya. Ma, ezigbo ụgwọ a na-akwụ m mere ka m na-arụgbu onwe m n’ọrụ. Ụlọ ọrụ ahụ mechara chụọ ọtụtụ ndị ọrụ ha, ma mụnwa. Ihe a mere ka m mata na e nweghị ọrụ ọ bụla mmadụ ga-arụwa, ya asị na ya agaghị enwe nsogbu n’ọdịnihu.”

Ndị nwere ego ma ọ bụ ndị a na-ele anya ka ndị ụwa zuuru, na-enwe nsogbu ezinụlọ, na-arịa ọrịa, na-echegbukwa onwe ha gbasara ego. Otu nwoke onye Japan aha ya bụ Katsutoshi kwuru, sị: “Enwere m ezigbo ego, ma obi adịghị m mma n’ihi na ndị mmadụ na-emere m anyaụfụ, na-emesikwa m ike.” Otu nwaanyị bi na Vietnam aha ya bụ Lam kwuru, sị: “M na-ahụ ka ọtụtụ ndị na-agbasi mbọ ike ka ha nweta ọrụ a na-akwụ ha ezigbo ụgwọ, ka ego ghara ịbụrụ ha nsogbu. Ma, ha mechagodị nweta ego, ha na-echegbukwu onwe ha, na-arịa ọrịa, obi ana-ajọkwa ha njọ.”

Dị ka Franklin, ọtụtụ ndị achọpụtala na e nwere ihe ndị ka mkpa karịa ịgụ oké akwụkwọ na inwe ego. Ma, ihe ụfọdụ ndị na-eme ka ihe nwee ike dịrị ha ná mma n’ọdịnihu abụghị ịchụ ego ọnwụ ọnwụ, kama, ha na-agbalị ka ha bụrụ ezigbo mmadụ, na-emekwara ndị ọzọ ihe ọma. Ma, ọ̀ bụ ya ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’ọdịnihu? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.