Maịka 5:1-15

  • Otu onye ọchịchị ga-abụ onye ukwu n’ụwa niile (1-6)

    • Onye ọchịchị ga-esi na Betlehem pụta (2)

  • Ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb ga-adị ka igirigi, dịkwa ka ọdụm (7-9)

  • A ga-eme ka ala Izrel dị ọcha (10-15)

5  “Ugbu a, unu ndị bi n’obodo a nọchibidoro anọchibido,Unu na-ebekasị onwe unu ahụ́. A nọchibidola anyị.+ Ha ga-akụ onyeikpe Izrel mkpara na ntì.+   Ma gịnwa, Betlehem Efrata,+Obodo kacha obere n’obodo ndị dị na Juda, Ọ bụ na gị ka onye m ga-eme eze Izrel ga-esi pụta,+Onye dịwara kemgbe oge ochie, kemgbe ọtụtụ afọ.   N’ihi ya, Chineke ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha Ruo mgbe nwaanyị ime na-eme ga-amụ nwa. Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị fọdụrụ ga-alọghachikwute ndị Izrel.   Ọ ga-ebili ma jiri ike Jehova zụọ ha ka atụrụ,+Jirikwa ebube nke aha Jehova bụ́ Chineke ya zụọ ha. Ha ga-ebi ebe ahụ, ahụ́ eruokwa ha ala.+ Ọ ga-abụ onye ukwu n’ebe niile n’ụwa.+   Ọ ga-eme ka udo dị.+ Ọ bụrụ na onye Asiria abata n’ala anyị zọda ụlọ elu anyị,+Anyị ga-esi n’ụmụ mmadụ họpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi* asatọ ga-alụso ya ọgụ.   Ha ga-eji mma agha lụso Asiria ọgụ,+Lụsokwa Nimrọd+ ọgụ n’ebe ndị e si abanye ya. Onye Asiria+ ahụ bata n’ala anyị ma zọọ ụkwụ na ya ịlụso anyị ọgụ,Onye na-achị anyị ga-anapụta anyị n’aka ya.   N’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ JekọbGa-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ. Ha ga-adịkwa ka mmiri nke na-ezo n’elu ahịhịa,Nke na-anaghị eche ka mmadụ gwa ya ihe ọ ga-eme,Nke na-anaghịkwa echere ụmụ mmadụ.   N’anya mba dị iche icheNakwa n’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ JekọbGa-adị ka ọdụm nke nọ ebe anụ ọhịa ndị ọzọ nọ. Ha ga-adịkwa ka ọdụm nọ ebe ìgwè atụrụ nọ,Nke ọ na-abụ ọ na-agafe, ya ana-azọpịa ma na-adọri anụ ndị ọzọ. E nweghịkwa onye na-anapụta ha.   Unu ga-emeri ndị iro unu. A ga-ebibikwa ndị iro unu niile.” 10  Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,M ga-ebibi ịnyịnya unu na ụgbọ ịnyịnya unu. 11  M ga-ebibi obodo ndị dị n’ala unu,Kwatuokwa ebe niile unu rụsiri ike. 12  M ga-eme ka unu kwụsị ịgba afa,*A gaghịkwa enwe onye ọ bụla n’ime unu nke na-eme anwansi.*+ 13  M ga-ebibi arụsị unu a pịrị apị na ogidi unu. Unu agaghịzi akpọrọ ihe unu ji aka unu rụọ isiala.+ 14  M ga-efopụ ogwe osisi arụsị*+ niile unu,Laakwa obodo unu niile n’iyi. 15  M ga-eji iwe na ọnụma kwụọ Mba ndị na-erubereghị m isi ụgwọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị ndú.”
Na Hibru, “ka ịgba afa dị n’aka gị kwụsị.”
Ma ọ bụ “majik.”