Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ninive bụ obodo nwere ụlọ ndị buru ezigbo ibu na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere Ninive mgbe oge Jona gachara?

N’IHE dị ka n’afọ 670 Tupu Oge Ndị Kraịst, Asiria ghọrọ alaeze ukwu kachanụ n’ụwa niile. Ụlọ ọrụ a na-akpọ The British Museum dere n’ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet na “alaeze ukwu Asiria malitere na Saịprọs dị n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’Ịran dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. E nwekwara mgbe Ijipt so n’ebe ndị ha na-achị.” Isi obodo Asiria bụ́ Ninive bụ obodo kachanụ n’ụwa n’oge ahụ. E nwere ọtụtụ ogige ndị mara mma, obí eze ndị buru ezigbo ibu, nakwa ọ́bá akwụkwọ ndị buru ezigbo ibu na ya. Ihe ndị e dere n’ahụ́ ájá n’obodo Ninive oge ochie gosiri na Eze Ashurbanipal kpọrọ onwe ya “eze nke ụwa” dị ka eze ndị ọzọ chịkwara Asiria mere. N’oge ahụ ọ na-achị, o yiri ka o nweghị obodo ọ bụla ga-emerili Asiria n’agha.

Alaeze ukwu Asiria bụ alaeze kacha ike n’ụwa niile n’oge ahụ

Ma, ọ bụ n’oge Asiria kacha akpa ike n’ụwa ka onye amụma Jehova bụ́ Zefanaya buru amụma, sị: “Chineke ga-esetị aka ya . . . bibie Asiria. Ọ ga-emekwa ka Ninive tọgbọrọ chakoo, kpọọkwa nkụ ka ala ịkpa.” Nehọm onye amụma kwukwara, sị: “Bukọrọnụ ọlaọcha, bukọrọkwanụ ọlaedo. . . . Obodo tọgbọ nkịtị, tọgbọrọkwa chakoo, e bibiekwala ya. . . . Onye ọ bụla hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ, sịkwa, ‘E bibiela Ninive!’ ” (Zef. 2:13; Nehọ. 2:9, 10; 3:7) Mgbe ndị mmadụ nụrụ amụma ahụ, ha nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Ihe a ọ̀ ga-ekwe omume? È nwere onye ga-emerili Asiria?’ O nwere ike ịdị ha ka ihe na-agaghị ekwe omume.

Ninive mechara ghọọ mkpọmkpọ ebe

N’agbanyeghị nke ahụ, ihe di egwu mere. Obere oge tupu afọ 600 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Babịlọn na ndị Midia meriri Asiria. Mgbe e mechakwara, Ninive tọgbọọrọ n’efu, e mechaakwa chefuo ya. Otu akwụkwọ ndị The Metropolitan Museum of Art dị na Niu Yọk dere sịrị: “Ebe a kpọrọ Ninive mechara ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu. Ọ gwụla naanị na Baịbụl ka a na-ekwute okwu ya.” Otu òtù a kpọrọ Biblical Archaeology Society kwuru na “o nweghị onye ọ bụla nwere ike ikwu ma isi obodo alaeze ukwu Asiria ọ̀ dị adị n’eziokwu.” Ma n’afọ 1845, otu ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie aha ya bụ Austen Henry Layard malitere igwukasị ebe obodo Ninive dịbu. Ihe ndị o gwupụtara n’ebe ahụ gosiri n’eziokwu na Ninive bụ obodo na-ewu ewu n’oge ochie.

Otú amụma Baịbụl buru gbasara Ninive si mezuo mere ka obi sie anyị ike na amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara otú a ga-esi ebibi ọchịchị ụwa a ga-emezukwa.—Dan. 2:44; Mkpu. 19:15, 19-21.