Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

È kwesịrị ịkpọ ndị ahụ na-ere anụmanụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem “ndị na-apụnara mmadụ ihe”?

OZIỌMA MATIU kwuru, sị: “Jizọs wee banye n’ime ụlọ nsọ ma chụpụ ndị niile na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o kpukwara tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu. O wee sị ha: ‘E dere, sị, “A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere,” ma unu na-eme ya ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.’”—Mat. 21:12, 13.

Ihe akwụkwọ ndị kọrọ gbasara ndị Juu oge ochie kwuru gosiri na ndị na-ere ihe n’ụlọ nsọ ahụ na-erigbu ndị ha na-eresị ihe, na-ana ha ego karịrị akarị. Dị ka ihe atụ, otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ kwuru na n’oge ndịozi Jizọs, e nwere mgbe e rere kpalakwukwu abụọ e ji achụ àjà otu mkpụrụ ego ọlaedo a na-akpọ dina. Mmadụ nwere ike ịrụ ọrụ iri ụbọchị abụọ na ise tupu ya arụta ego há otú ahụ. Kpalakwukwu ma ọ bụ nduru bụ ihe ndị ogbenye na-eji achụ àjà. Ma, ihe e jizi azụta ya rịrị elu ọjị. (Lev. 1:14; 5:7; 12:6-8) Ihe a were otu onye rabaị aha ya bụ Simiọn ben Gameliel iwe, ya egbubilata àjà ole ndị Juu kwesịrị ịna-achụ. Ego ole a na-ere nduru abụọ adaa ozugbo. Ọ bụzi ihe mmadụ ga-arụta naanị n’awa atọ ka e ji azụta ya.

N’ihi ya, ọ dabara adaba na Jizọs kpọrọ ndị ahụ na-ere ihe n’ụlọ nsọ “ndị na-apụnara mmadụ ihe” n’ihi anyaukwu ha na otú ha si erigbu ndị mmadụ.