Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

E wezụga Baịbụl, olee ihe ọzọ gosiri na o nwere mgbe ndị Izrel bụ ndị ohu n’Ijipt?

Baịbụl kwuru na mgbe ndị Midian kpọgachara Josef Ijipt, nna ya Jekọb na ndị ezinụlọ ya si Kenan kwaga Ijipt. Ha gara biri ná mpaghara ala Ijipt a na-akpọ Goshen, nke dị n’ebe Osimiri Naịl sọbara n’Osimiri Mediterenian. (Jen. 47:​1, 6) Ndị Izrel “nọkwa na-amụba ma na-adịwanye nnọọ ike nke ukwuu.” N’ihi ya, ụjọ ndị Izrel bịara ndị Ijipt, ha amanyezie ha ịgbawa ohu.​—Ọpụ. 1:​7-14.

Ụfọdụ ndị na-akatọ Baịbụl n’oge anyị a sịrị na ihe a Baịbụl kwuru bụ akụkọ ifo. Ma, e nwere ihe gosiri na ndị si n’agbụrụ Shem * gbara ohu n’Ijipt oge ochie.

Dị ka ihe atụ, ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie ahụla mkpọmkpọ ebe ndị oge ochie biri n’ebe ugwu Ijipt. Otu ọkà mmụta Baịbụl aha ya bụ John Bimson kwuru na e nwere ihe gosiri na ndị si n’agbụrụ Shem biri n’ihe dị ka obodo iri abụọ n’ebe ugwu Ijipt ahụ. Ihe ọzọ bụ na otu ọkachamara n’ihe gbasara Ijipt oge ochie aha ya bụ James K. Hoffmeier sịrị: “Malite n’ihe dị ka afọ 1800 ruo n’afọ 1540 Tupu Oge Ndị Kraịst, Ijipt bụ ebe ndị bi n’ebe ndịda Eshia, ndị na-asụ asụsụ ndị si n’agbụrụ Shem, na-achọkarị ịkwaga.” Ọ sịkwara: “Ọ bụ oge ahụ bụ oge Ebreham, Aịzik, na Jekọb, bụrụkwa oge ihe a kọrọ na Jenesis mere.”

E nwekwara ihe ọzọ si n’ebe ndịda Ijipt gosiri na ihe a bụ eziokwu. Otu papaịrọs e dere n’ihe dị ka n’agbata afọ 2000 na afọ 1600 Tupu Oge Ndị Kraịst bu aha ndị gbara ohu n’otu ezinụlọ dị n’ebe ndịda Ijipt. Ihe karịrị iri anọ n’aha ndị ahụ bụ aha ndị si n’agbụrụ Shem. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-esi nri, ndị na-akpa ákwà, na ndị na-arụ ọrụ ike. Hoffmeier sịrị: ‘Ebe ọ bụ na ihe karịrị mmadụ iri anọ si n’agbụrụ Shem gbara ohu n’otu ezinụlọ dị n’ebe ndịda Ijipt, ọ ga-abụ na ndị si n’agbụrụ Shem, bụ́ ndị gbara ohu n’Ijipt niile, dị ọtụtụ, karịchaa n’ebe Osimiri Naịl sọbara n’Osimiri Mediterenian.’

Otu ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie aha ya bụ David Rohl dere na ụfọdụ n’ime aha ndị dị n’iberibe akwụkwọ ahụ “dara ka aha ndị a na-agụta na Baịbụl.” Dị ka ihe atụ, aha ndị dị ka Ịsaka, Asha, na Shifra dị n’iberibe akwụkwọ ahụ. (Ọpụ. 1:​3, 4, 15) O kwuziri, sị: “Ihe a mere ka o doo ezigbo anya na e nwere mgbe ndị Izrel bụ ohu n’Ijipt.”

John Bimson sịrị: “E nwere ezigbo ihe gosiri na ihe ahụ Baịbụl kọrọ gbasara ohu ndị Izrel gbara n’Ijipt nakwa otú ha si si ebe ahụ pụta mere eme.”

^ par. 4 Shem bụ otu n’ime ụmụ nwoke atọ Noa mụtara. Ụfọdụ ndị si n’agbụrụ ya nwere ike ịbụ ndị Ilam, ndị Asiria, ndị Kaldia oge ochie, ndị Hibru, ndị Siria, na agbụrụ dị iche iche nke ndị Arab.