Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Ị Gafere Mara Gị Ahụ́

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Ị Gafere Mara Gị Ahụ́

Ị̀ GAFETỤLA n’ọgbakọ ọhụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ikweta ihe Nwanna Jean-Charles kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na gị na ezinụlọ gị agafee n’ọgbakọ ọhụrụ, ọ ga-esitụ ike tupu ọgbakọ ọhụrụ ahụ amara unu ahụ́. O nwekwara ike isiri gị ike ịhụ na ndị ezinụlọ gị niile na Jehova dị n’ezigbo mma.” Unu kwafee ebe ọhụrụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị chọta ọrụ ọhụrụ na ụlọ ọhụrụ, ma ọ bụkwanụ chọtara ụmụ gị ụlọ akwụkwọ ọhụrụ. Unu ga-emekwa ka otú ihu ígwé ebe ahụ dị mara unu ahụ́, nabata omenala dị iche na nke unu nakwa ebe ọhụrụ unu ga na-ekwusa ozi ọma.

Nsogbu Nwanna Nicolas na nwunye ya Céline dị iche. Alaka ụlọ ọrụ dị na Frans gwara ha ka ha gafee n’ọgbakọ ọhụrụ. Ha sịrị: “Obi tọrọ anyị ụtọ ná mmalite. Mana, ọ dịghị anya ya ebido iwute anyị na anyị hapụrụ ndị enyi anyị. Anyị na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ anyị amatachabeghị.” a N’ihi ihe ndị a nwere ike isiri gị ike, olee otú i nwere ike isi na-enwe obi ụtọ ma na-eme nke ọma ma ị gafee n’ọgbakọ ọhụrụ? Olee ihe ndị ọzọ nwere ike ime iji nye aka? Olee otú ị ga-esi agba ndị ọzọ ume, hanwa agbaakwa gị ume n’ọgbakọ ọhụrụ ị gafere?

IHE ANỌ GA-ENYERE GỊ AKA

Tụkwasị Jehova obi

1. Tụkwasị Jehova obi. (Ọma 37:5) E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Japan aha ya bụ Kazumi. Ọ hapụrụ ọgbakọ ọ nọ kemgbe afọ iri abụọ mgbe e zigara di ya ka ọ gaa ebe ọzọ rụwa ọrụ. Olee otú o si “kwe ka Jehova na-edu” ya? Ọ sịrị: “M gwara Jehova ọtụtụ ugboro gbasara ụjọ m, otú owu si ama m, nakwa ihe ndị na-echegbu m. Mgbe ọ bụla m mere otú ahụ, ọ na-enye m ike dị m mkpa.”

Olee ihe ị ga-eme ka ị tụkwasịkwuo Jehova obi? Mmiri na nri ala dị osisi mkpa ka o nwee ike ịna-eto. Otú ahụkwa ka e nwere ihe ndị dị mkpa ga-eme ka okwukwe anyị na-esi ike. Nwanna Nicolas anyị kwuburu okwu ya chebaara ihe Ebreham, Jizọs, na Pọl mere echiche. Ha niile hapụrụ ọtụtụ ihe ka ha nwee ike ime uche Chineke. Ihe a mere ka obi sikwuo ya ike na Jehova ga-enyere ya aka. Ịmụchi Baịbụl anya ga-enyere gị aka ma ihe gbanwee ná ndụ gị. Ọ ga-eme ka ị mụta ọtụtụ ihe ị ga-eji gbaa ndị ọzọ ume n’ọgbakọ ọhụrụ gị.

Ejila ọgbakọ ị nọbu na-atụnyere ọgbakọ ị nọ ugbu a

2. Ejila ọgbakọ mbụ gị atụnyere nke ugbu a. (Ekli. 7:10) Mgbe Nwanna Jules si Bene Rịpọblik kwaga Amerịka, ọ chọpụtara na e nwere ezigbo ihe dị iche n’omenala ha na nke ndị obodo ahụ. Ọ sịrị: “Ọ na-adị m ka m̀ ga-akọrọ onye ọ bụla m hụrụ akụkọ ndụ m.” Ebe ọ bụ na ihe a dị iche n’otú e si eme n’ebe o toro, ọ malitere ịna-agbara ụmụnna ọsọ. Ma, mgbe ọ matakwuru ụmụnna ya, ọ gbanwere otú o si ele ihe anya. Ọ sịrị: “Ugbu a, achọpụtala m na ebe ọ bụla ị gara n’ụwa, mmadụ niile bụ otu. Ihe dị iche bụ naanị otú ha si ekwu okwu na otú ha si eme omume. Ịnabata ndị mmadụ otú ha dị dị ezigbo mkpa.” N’ihi ya, ejila ọgbakọ mbụ gị atụnyere nke ugbu a. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Anne-Lise sịrị: “Akwagaghị m ebe ọhụrụ ka ihe niile dị otú ha dị n’ebe m si. M kwagara ka m mụta ihe ndị ọhụrụ.”

Ndị okenye ekwesịghịkwa iji otú ihe si dịrị n’ọgbakọ mbụ ha na-atụnyere ọgbakọ ọhụrụ ha. Na otú e si eme ihe n’ọgbakọ ị nọ ugbu a dị iche n’otú e si eme n’ọgbakọ mbụ gị apụtaghị na ihe ha na-eme adịghị mma. Ọ ga-adị mma ma ị mụta otú ihe si dịrị n’ebe ọhụrụ ị kwafetara tupu gị atụwa aro ka a gbanwee ihe ụfọdụ. (Ekli. 3:1, 7b) Ọ ka mma ka i si n’àgwà ọma gị kụziere ụmụnna ihe kama ịgbalị ịmanye ha ka ha na-eche echiche otú i si eche.​—2 Kọr. 1:24.

Na-eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ

3. Na-eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. (Fil. 1:27) Ịkwafe ebe ọhụrụ na-ewe ezigbo oge, na-agwụkwa ezigbo ike. Ma, ọ dị mkpa ka ị na-agachi ọmụmụ ihe anya, o kwe omume ihu na ihu, malite mgbe ị kwafere ebe ahụ ọhụrụ. Ọ bụrụ na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọhụrụ gị ahụtụbeghị gị ma ọ bụkwanụ na ha anaghị ahụ gị mgbe niile, olee otú ha ga-esi enyere gị aka? Nwanna Nwaanyị Lucinda kwagara n’otu nnukwu obodo dị na Saụt Afrịka, ya na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ. Ọ sịrị: “Ndị enyi m gwara m ka m lekwasị anya n’ime ka mụ na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ m na-agafe dịrị n’ezigbo mma, ka m na-eso ndị ọzọ aga ozi ọma, nakwa ka m na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Anyị kwudịrị ka a nọrọ n’ụlọ anyị na-eme nzukọ ozi ubi.”

Anyị na ụmụnna anyị ‘ịna-arụkọ ọrụ ọnụ’ n’ihe ndị a na-eme n’ofufe Jehova n’ọgbakọ ọhụrụ anyị bụ otu ụzọ magburu onwe ya anyị si eme ka ibe anyị “na-enwe okwukwe n’ozi ọma.” Ndị okenye gbara Nwanna Nwaanyị Anne-Lise anyị kwuburu okwu ya ume ka ọ gbalịa ka ya na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ha soro gaa ozi ọma. Gịnị mechara mee? Ọ sịrị: “M chọpụtara ozugbo na ihe a bụ ụzọ dị ezigbo mma ahụ́ ga-esi eru m ala n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ.” Iwepụtakwa onwe gị na-ehicha Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya na-egosi na i werela ọgbakọ ọhụrụ a ka ọgbakọ gị. Ọ bụrụ na ị na-eso ụmụnna eme ihe ndị ha na-eme, ọ gaghị adị anya gị na ụmụnna adịrị n’ezigbo mma, gị ewerekwa ha ka ndị ezinụlọ gị.

Meta ndị enyi ọhụrụ

4. Meta ndị enyi ọhụrụ. (2 Kọr. 6:11-13) Igosi ndị mmadụ na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ bụ ụzọ kacha mma anyị ga-esi emeta ha enyi. N’ihi ya, na-ewepụta ezigbo oge tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe ọ gbasara na-agakwuru ndị mmadụ ka i nwee ike ịmata ha. Gbaa ezigbo mbọ ka ị mata aha ha. Icheta aha ndị mmadụ na imesapụrụ ha ihu nakwa ime ka ọ na-adịrị ha mfe ịgwa gị okwu ga-eme ka ndị mmadụ na-akpa gị nso. O dokwara anya na ọ ga-eme ka i nweta ọtụtụ ezigbo ndị enyi.

Kama ichegbuwe onwe gị gbasara ihe ị ga-eme ka ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọhụrụ gị nabata gị, mee ka ha mata ụdị onye ị bụ n’eziokwu. Mee ihe Nwanna Nwaanyị Lucinda kwuru. Ọ sịrị: “Ihe mere anyị na ọtụtụ ụmụnna ji bụrụ ezigbo enyi ugbu a bụ n’ihi na ọ bụ anyịnwa bu ụzọ malite ịkpọ ha ka ha bịa n’ụlọ anyị.”

“NA-ANABATANỤ IBE UNU”

Ụjọ nwere ike ịtụ mmadụ ma ọ banye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze e nwere ọtụtụ ihu ọ na-amaghị. N’ihi ya, olee otú i nwere ike isi eme ka ọ dịrị ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ unu mfe? Pọl onyeozi sịrị: “Na-anabatanụ ibe unu otú Kraịst nabatara unu.” (Rom 15:7) Ndị okenye nwere ike ime ka Kraịst, mee ka ahụ́ ruo ndị ọhụrụ ala. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ga-eme Ka Nkwaga Ị Na-akwaga Ebe Ọzọ Gaa Nke Ọma.”) Ma, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ, ma ụmụaka, ga-eso mee ka ahụ́ ruo ndị ọhụrụ gafetara n’ọgbakọ ha ala.

Ihe so n’ịnabata ndị ọzọ bụ ịkpọ ha ka ha bịa n’ụlọ gị. Ma, i nwekwara ike ịgwa ha ka i nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị wepụtara oge ya kpọrọ nwanna nwaanyị ọzọ bịara ọhụrụ n’ọgbakọ ha gagharịa n’obodo ahụ, kọwakwaara ya otú e si agba ụgbọala na ụgbọ okporo ígwè n’ebe ahụ. Ihe a nwanna nwaanyị a mere ruru nwanna nwaanyị o meere ya n’obi, nyekwara ya aka ka ahụ́ ruo ya ala n’ọgbakọ ahụ.

OHERE Ị GA-EJI NA-EMEKWU NKE ỌMA

Ka igurube na-eto, ọ na-ewe iwere ọtụtụ ugboro tupu nku akaa ya ife. Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ma ị gafee n’ọgbakọ ọhụrụ. I kwesịrị iwepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka o siere gị ike ịna-emekwu nke ọma n’ozi Jehova. Nwanna Nicolas na nwunye ya Céline sịrị: “Ịgafe ebe ọhụrụ bụ otu ụzọ magburu onwe ya e si azụ mmadụ. Anyị mụtara àgwà ọhụrụ ka anyị na ụdị ndị ọhụrụ nọ n’ebe ọhụrụ nwee ike ịna-emekọ ihe.” Nwanna Jean-Charles anyị kwuburu okwu ya kọrọ uru ya na ndị ezinụlọ ya ritere. Ọ sịrị: “Ọgbakọ ọhụrụ a anyị kwafetara enyerela ụmụ anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Ọnwa ole na ole anyị gafetara n’ọgbakọ a, nwa anyị nwaanyị malitere ime ihe omume n’ọmụmụ ihe etiti izu, nwa anyị nwoke aghọọkwa onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.”

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na otú ihe si dịrị gị agaghị ekwe ka ị kwafee ebe ọhụrụ, dị ka ịkwaga ebe a chọkwuru ndị nkwusa? Ọ ga-adị mma ka ị gbalịa mee ihe ụfọdụ e kwuru n’isiokwu a ka ọgbakọ ị nọ ugbu a dị gị ka ị̀ gafere n’ọgbakọ ọhụrụ. Tụkwasị Jehova obi, na-esokwa eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịhazi ka gị na ndị ọzọ na-arụ n’ozi ọma, imetakwu ndị enyi ọhụrụ, ma ọ bụkwanụ gị na ndị enyi i nwere ugbu a ịna-adịkwu ná mma. Ì nwere ike inyere ndị kwafetara ọhụrụ n’ọgbakọ unu ma ọ bụ ndị ihe na-esiri ike aka mee ihe ụfọdụ? Ebe ọ bụ na ihe e ji amata ezi Ndị Kraịst bụ ịhụnanya, inyere ndị ọzọ aka ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. (Jọn 13:35) Obi kwesịrị isi gị ike na “ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.”​—Hib. 13:16.

Ọtụtụ Ndị Kraịst enweela obi ụtọ ma na-eme nke ọma n’ọgbakọ ọhụrụ ha gafere n’agbanyeghị na ọ naghị adịrị ha mfe mgbe niile. Gịnwa nwekwara ike ime ka ha. Nwanna Nwaanyị Anne-Lise sịrị: “Ịgbanwe ọgbakọ nyeere m aka ịmatakwu ọtụtụ ndị.” Nwanna Nwaanyị Kazumi amatala ugbu a na ịgafe ebe ọhụrụ nwere ike ime ka mmadụ hụ otú Jehova si akwado ya otú ọ na-ahụtụbeghị. Oleekwanụ otú obi dị Nwanna Jules? Ọ sịrị: “Ndị enyi m metara mere ka ahụ́ ruo m ala. Mụ na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ anyị adịla n’ezigbo mma ugbu a nke na ọ ga-esiri m ike ịhapụ ha.”

a Ị chọọ ịma ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-agụsi gị agụụ ike ịhụ ndị ụlọ unu ị hapụrụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ịnagide Oké Ọchịchọ Ịla Ụlọ n’Ije Ozi Chineke” nke gbara n’Ụlọ Nche May 15, 1994.