Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Na-amụsi Ihe Ike Ka I Nwee Ike Ịnọ na Nche

Na-amụsi Ihe Ike Ka I Nwee Ike Ịnọ na Nche

Gụọ Daniel 9:1-19 ka ị mụta uru ịmụ ihe nke ọma ga-abara gị.

Chebara amaokwu ndị gbara ya gburugburu echiche. Olee ihe ndị mere tupu mgbe ahụ? Oleekwa otú ha mere ka obi dị Daniel? (Dan. 5:29–6:5) Olee otú obi gaara adị gị ma a sị na ị bụ Daniel?

Mekwuo nchọnchọ. Olee “Akwụkwọ Nsọ” ọ ga-abụ ya ka Daniel gụrụ? (Dan. 9:2, ihe e dere n’ala ala peeji ya; w11 1/1 22 ¶2) Gịnị mere Daniel ji kwupụta mmehie ya nakwa nke mba Izrel? (Lev. 26:39-42; 1 Eze 8:46-50; dp 182-184) Olee otú ekpere Daniel kpere si gosi na ọ na-amụsi Okwu Chineke ike?​—Dan. 9:11-13.

Chebara ihe ndị ị mụtara echiche. Jụọ onwe gị, sị:

  • ‘Gịnị ga-enyere m aka ka ihe ndị na-eme n’ụwa ghara imegharị m anya?’ (Maị. 7:7)

  • ‘Olee otú ịmụ ihe nke ọma ga-esi baara m uru otú ahụ ọ baara Daniel?’ (w04 8/1 12 ¶17)

  • ‘Olee isiokwu ndị m nwere ike ịmụ n’onwe m ga-enyere m aka ịna-eche nche?’ (Mat. 24:42, 44; w12 8/15 5 ¶7-8)