Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma I Chee na Ndị Enyi Gị Na-agbara Gị Ọsọ

Ihe Ị Ga-eme ma I Chee na Ndị Enyi Gị Na-agbara Gị Ọsọ

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nneka * kwuru, sị: “Enwere m ndị enyi abụọ. Ha na-akpapụ m iche ma ha chọọ ịga kporie ndụ. Ha kporichaa ndụ lọta, mụ anụ otú ha si gaa. E nwere ụbọchị m kpọrọ otu n’ime ha na fon mgbe onye nke ọzọ nọ n’ụlọ ha. Ọ bụ onye ọzọ zara fon ahụ. M nụrụ olu ha abụọ ka ha nọ ebe ahụ na-akọ, na-achị, ya emee ka ọ dịkwuo m ka hà na-agbara m ọsọ.”

Ọ̀ dị gị ka ndị enyi gị hà na-agbara gị ọsọ? Ọ bụrụ na ọ dị gị ka hà na-agbara gị ọsọ, ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma ma ọ dị gị otú ahụ.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ọtụtụ ndị na-eche na ndị enyi ha na-agbara ha ọsọ. Ụfọdụ ndị a ma ama na-echedị na ndị enyi ha na-agbara ha ọsọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ihe na-eme ka mmadụ chewe otú ahụ abụghị ndị enyi ole o nwere, kama ọ bụ ụdị ndị ndị enyi ya bụ. Onye a ma ama nwere ike inwe ọtụtụ ndị na-abịa ya nso ma o nweghị nke n’ime ha bụ ezigbo enyi ya, ya adịzie ya ka à na-agbara ya ọsọ.

Mmadụ ịnọkarị naanị ya na-akpata ọrịa. Mgbe e lere otu narị mmadụ na iri anọ na asatọ ahụ́, ndị ọkachamara chọpụtara na ndị na-anọkarị naanị ha nwere ike ịnwụ ngwa ngwa. Ha kwukwara na o nwere ike igbu mmadụ karịa ibu oké ibu. Ihe ọzọ ha kwuru bụ na o nweghị ihe dị iche n’ụdị onye ahụ na onye na-aṅụ mkpụrụ sịga iri na ise n’ụbọchị.

Ọ dị mmadụ ka à na-agbara ya ọsọ, o nwere ike ime ka o mete onye ọ bụla ọ hụrụ enyi. Ụdị onye ahụ na-ekwe ka onye ọ bụla ọ hụrụ bụrụ enyi ya. Nwa okorobịa aha ya bụ Emeka kwuru, sị: “Mmadụ chee na ndị enyi ya na-agbara ya ọsọ, ọ ga na-achọ onye ga na-akpa ya nso. O nwere ike ịna-eche na inwe onye na-ekwusara ya okwu ka ịna-anọ naanị ya mma. Ụdị ihe a nwere ike ime ka ọ daba ná nsogbu.”

Ịntanet ma ọ bụ ekwentị agaghị eme ka mmadụ chewe na ndị enyi ya anaghị agbara ya ọsọ. Nwa agbọghọ aha ya bụ Chinyere kwuru na ya nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ Ịntanet zigara ihe ruru otu narị mmadụ ozi n’ụbọchị, ya aka dị ya ka o nweghị onye na-akpa ya nso. Nwa okorobịa aha ya bụ Chibuike kwetara ihe a o kwuru. Ọ sịrị na e nwere ike iji izigara mmadụ ozi tụnyere mgbadume ma jiri ịgwa mmadụ okwu ihu na ihu tụnyere nri. O kwukwara na ọ bụ eziokwu na mgbadume na-egbo agụụ, mmadụ ga-erirịrị nri ka afọ ju ya.

IHE I NWERE IKE IME

Echela na ndị enyi gị na-agbara gị ọsọ. Ka e were ya na ị gara n’Ịntanet hụ foto ndị enyi gị sere n’oriri ha gara. E nwere ihe abụọ i nwere ike ime ma ụdị ihe a mee. Nke mbụ bụ na i nwere ike iche na ha na-agbara gị ọsọ. Nke abụọ abụrụ na i nwere ike ileghara ya anya. Ebe ọ bụ na ị maghị ihe niile merenụ, ọ gaghị adị mma ka i chewe na ha na-agbara gị ọsọ. Kama ichewe otú ahụ, ọ ga-aka mma ka i chewe ezigbo ihe mere na ha akpọghị gị. Ihe na-eme ka mmadụ na-eche na ndị enyi ya na-agbara ya ọsọ na-abụkarị otú o si ele ihe anya, ọ bụghị ihe e mere ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 15:15.

Ekwula ihe na-anaghị eme eme. Ọ bụrụ na ọ dị mmadụ ka ndị enyi ya hà na-agbara ya ọsọ, o nwere ike ịna-ekwu, sị, ‘O nwetụbeghị onye kpọrọ m oriri’ ma ọ bụkwanụ ‘O nweghị onye na-abịa m nso.’ Ikwu ụdị ihe a agaghị eme ka ihe ka mma, kama ọ ga-eme ka onye ahụ na-echekwu na a na-agbara ya ọsọ. Ọ ga-adị ya ka à jụrụ ya ajụ, nke ga-emezi ka ọ ghara ịna-akpa ndị ọzọ nso. Ya kwụsị ịna-akpa ndị ọzọ nso, ya adịzie ya ka à na-agbara ya ọsọ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 18:1.

Gbaa mbọ mete ndị tọrọ gị enyi. Baịbụl kọrọ gbasara Devid. Ọ ka na-eto eto mgbe ya na Jọnatan matara. Jọnatan ji iri afọ atọ tọọ ya. N’agbanyeghị na Jọnatan tọgburu ya atọgbu, ha abụọ ghọrọ ezigbo enyi. (1 Samuel 18:1) Gị na onye tọrọ gị nwere ike ịbụkwa enyi. Otu nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ na otu aha ya bụ Chidimma kwuru, sị: “Ọ dịbeghị anya m ghọtara na imete ndị tọrọ m enyi bara ezigbo uru. Ụfọdụ ezigbo ndị enyi m tọgburu m atọgbu. Ma, m na-amụta ihe n’otú ha si akpa àgwà nakwa n’otú ha si ele ihe anya.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Job 12:12.

I nwere ike ịnọ naanị gị mgbe ụfọdụ. Ọ na-abụ ụfọdụ ndị nọrọhaala naanị ha, ya adị ha ka à na-agbara ha ọsọ. Na mmadụ nọ naanị ya apụtaghị na a na-agbara ya ọsọ. Dị ka ihe atụ, Jizọs na ndị ọzọ na-anọkarị. Ma, e nwere oge ụfọdụ ọ na-anọ naanị ya. (Matiu 14:23; Mak 1:35) I nwere ike ịnọ naanị gị mgbe ụfọdụ. Echela na ịnọ naanị gị agaghị abara gị uru ọ bụla. Kama, jiri oge ọ bụla naanị gị nọ chebara ihe ọma Chineke meere gị echiche ma kelee ya. Ọ ga-eme ka gị na ndị ọzọ dịkwuo ná mma.—Ilu 13:20.

^ par. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.