Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Unu Ga-esi Na-ekpebi Ihe Ga-adị Unu Abụọ Mma

Otú Unu Ga-esi Na-ekpebi Ihe Ga-adị Unu Abụọ Mma

IHE BỤ́ NSOGBU

Ka e were ya na e nwere ihe gị na di * gị chọrọ ime, ma otú i si chọọ ime ya dị iche n’otú di gị si chọọ ime ya. I nwere ike ime otu n’ime ihe atọ a:

  1. Isi ọnwụ na unu ga-eme ya otú i si chọọ.

  2. Ikweta ime ya otú di gị kwuru.

  3. Unu ikweta ime ya otú ọzọ dị iche n’ihe unu abụọ chọrọ.

I nwere ike ikwu na ị chọghị ka e mee ya otú ọzọ n’ihi na otú a ga-esi eme ihe ahụ agaghịzi abụ ma otú ị chọrọ ma otú di gị chọrọ.

Ọ bụrụ na otú ọzọ ahụ unu chọrọ isi mee ihe ahụ dị mma, unu abụọ ga-enwe obi ụtọ. Ma, tupu anyị ekwuwe otú ị ga-esi na-ekweta ime ihe dị iche n’ihe unu chọrọ, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Unu kwesịrị ịgbakọ aka kpebie ihe unu ga-eme. Tupu ị lụọ di, ọ bụ gị na-ekpebiri onwe gị ihe ọ bụla ị ga-eme. Ma ugbu a, ihe agbanweela. Unu abụọ ga na-emezi ihe ga-eme ka unu ghara itisa. Kama ichewe na unu abụọ ịnọ kpawa ihe unu ga-eme bụ igbu oge, cheta na ọ ga-abara unu uru. Otu nwaanyị aha ya bụ Alexandra kwuru na ọ ka mma ka mmadụ abụọ tikọọ isi chọta otú a ga-esi dozie nsogbu kama otu onye ịchọwa ya naanị ya.

Unu kwesịrị iji obi ọcha kwurịta ihe unu ga-eme. Otu ọkachamara aha ya bụ John M. Gottman kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe ọ bụla di mmadụ ma ọ bụ nwunye ya kwuru ka ọ ga-ekweta, onye ahụ kwesịrị ikwu obi ya banyere okwu ha kpụ n’ọnụ. O kwukwara na ọ bụrụ na mmadụ anaghị etinye ọnụ n’ihe di ya ma ọ bụ nwunye ya na-ekwu ma ha chọọ ịkpa ihe dịịrị ha, e nweghị ezigbo ihe ha ga-akpata.

Unu kwesịrị ileghara ụfọdụ ihe anya. E nweghị onye obi na-adị ụtọ ma di ya ma ọ bụ nwunye ya na-esi ọnwụ na a ga-eme ihe ọ bụla o kwuru. Ọ na-aka mma ma ọ bụrụ na ha abụọ na-ekwe ka e megbuo ha mgbe ụfọdụ. Otu nwaanyị aha ya bụ June kwuru, sị: “Oge ụfọdụ, m na-eme ihe di m chọrọ ka obi wee dị ya mma, yanwa na-emekwara m otú ahụ. Otú ahụ ka di na nwunye kwesịrị isi na-ebi, nwoke meere nwunye ya, nwaanyị emeere di ya.”

IHE I NWERE IKE IME

Jirinụ olu ọma bido. Ọ bụrụ na i jiri iwe ma ọ bụ olu ike gwawa di gị ihe i chere banyere ihe unu chọrọ ime, unu nwere ike ịrụwa ụka, unu agaghịkwa ekwute ihe ga-enwe isi. N’ihi ya, jiri olu ọma kwuo ihe ị chọrọ ikwu, meekwa ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ihe ndị a Baịbụl kwuru ga-enyere gị na di gị aka ka unu ghara ịna-arụ ụka. Ha ga-eme ka unu wetuo obi kpebie ihe unu ga-eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 4:6.

Chọpụta ebe unu nwere otu olu. Ọ bụrụ na ọ na-abụ unu chọọ ikpebi ihe unu ga-eme unu amalite ise okwu, mara na o nwere ike ịbụ na onye ọ bụla n’ime unu na-achọ ka e mee ihe ọ chọrọ. Kama ịbụ ekwe ekwe, chọpụta ebe unu nwere otu olu. Ihe ndị a ga-enyere unu aka:

Onye ọ bụla n’ime unu dee ihe gbasara ihe unu na-akpa n’akwụkwọ. Depụta ihe ị na-achọghị banyere ihe ahụ n’aka ekpe. N’aka nri, dee ihe ndị i kwetara. Unu dechaa, kwurịtanụ ihe unu depụtara. I nwere ike chọpụta na unu nwere otu olu n’ime ọtụtụ ihe ndị unu dere unu ga-eme. Ọ gaghịkwa esiri unu ike ịgbanwe obi unu banyere ihe ndị unu na-ekwekọrịtaghị. Ọ bụrụgodị na unu agaghị ekwekọrịtacha n’ihe ahụ niile, ide ha n’akwụkwọ ga-enyere unu aka ịghọtakwu ihe ndị ahụ nke ọma.

Na-atụkọnụ aro ọnụ. O nwere ike ịdịrị otu onye mfe ịma ihe ọ ga-eme ma ihe ụfọdụ dapụta. Ma, e nwere ihe ụfọdụ nwere ike isiri di na nwunye ike ịma ihe ha ga-eme. Ụdị ihe a dapụta, ha kwesịrị ịgbakọ aka kpebie ihe ha ga-eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 4:9.

Abụla ekwe ekwe. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” (Ndị Efesọs 5:33) Ọ bụrụ na di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya, na-akwanyekwara ibe ha ùgwù, ha ga na-ekweta ihe ibe ha kwuru. Otu nwoke aha ya bụ Cameron kwuru, sị: “O nwere ihe mmadụ na-agaghị achọ ime, ma nwunye ya ma ọ bụ di ya nwere ike ime ka o mee ya. E mechaa, obi ga-adịkwa ya ụtọ na o mere ihe ahụ.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Jenesis 2:18.

^ para. 4 Ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ụmụ nwoke ndị lụrụ nwaanyị.