Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agbachi Ibe Ha Nkịtị

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agbachi Ibe Ha Nkịtị

IHE MERE NA Ọ DỊGHỊ MMA

N’ụbọchị nwoke na nwunye ya gbara akwụkwọ, ha kwere nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya. Ma, ụfọdụ na-akwụsị ighe ibe ha ọnụ ma ha see okwu. Ihe mere ha ji eme otú a bụ na ha chere na ọ ga-eme ka ha gbaara okwu na ụka ọsọ. Ma, ihe na-ebenụ ka ga na-ebe, o nweghịkwa onye n’ime ha obi ga-adị mma.

IHE MERE DI NA NWUNYE ỤFỌDỤ JI EME OTÚ AHỤ

Ha na-eji ya emegwara ibe ha ihe. Mgbe ụfọdụ, nwaanyị nwere ike gbachiwe di ya nkịtị n’ihi na ọ chọrọ imegwara ya ihe o mere ya. Dị ka ihe atụ, nwoke nwe ụlọ nwere ike kpebie ihe ha ga-eme n’ebughị ụzọ gwa nwunye ya. Ya gwazie nwunye ya ihe ahụ, o nwere ike iji iwe gwa ya na ọ kpọghị ya mmadụ. Nwoke ahụ nwekwara ike ikwu na nwunye ya bụ emete emete. Nwunye ya nwere ike ikwo ya kwusị ighe ya ọnụ ka o megwara ya ihe o mere ya.

Ha na-eji ya eme ka ibe ha mee ihe ha kwuru. Ọ na-abụ ụfọdụ chọọ ka di ha ma ọ bụ nwunye ha mee ihe ha kwuru, ha akwụsị ighe ya ọnụ. Dị ka ihe atụ, di na nwunye nwere ike chọọ ịpụ apụ. Nke nwaanyị agwa di ya na ya ga-achọ ka mama ya na papa ya soro ha. Ma, di ya ekweghị. Nke a nwere ike ime ka nwunye ya kwụsị ịtụpụrụ ya ọnụ ruo mgbe o kwetara ihe o kwuru.

Ma, o nwere mgbe ọ ga-adị mma ka ị gbachitụ di gị ma ọ bụ nwunye gị nkịtị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na iwe abịa gị, ọ ga-aka mma ka i mechie ọnụ, obi jụrụ gị, gị agwawa ya ihe ị chọrọ ịgwa ya. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị.” (Ekliziastis 3:7) Ma, ọ bụrụ na ihe mere na ị naghị eghe di gị ma ọ bụ nwunye gị ọnụ bụ ka i megwara ya ihe ma ọ bụkwanụ ka o mee ihe i kwuru, ọ ga-ara ahụ́ gị na ya ekpezie. Ọ ga-emekwa ka unu ghara ịna-akwanyere ibe unu ùgwù. Gịnị ka ị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ịna-eme?

IHE Ị GA-EME

Ihe mbụ ga-enyere gị aka bụ ịghọta na ịgbachi di gị ma ọ bụ nwunye gị nkịtị abụghị ịgbara okwu na ụka ọsọ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka o mee ihe i kwuru, ma ọ bụkwanụ gị esi otú ahụ megwara ya ihe o mere gị. Ọ̀ bụnụ otú ahụ ka i kwesịrị isi emeso onye ị hụrụ n’anya? Ịgbachi ya nkịtị abụghị otú unu ga-esi na-ekpezi ma unu see okwu, o nwere ihe ndị ọzọ unu nwere ike ime.

Aghọtahiela ihe ọ gwara gị. Baịbụl kwuru na a dịghị akpasu ịhụnanya iwe. (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5) Mgbe ụfọdụ, di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike iji iwe gwa gị na ị naghị ege ya ntị ma ọ bụkwanụ na ị naghị abịa ihe n’oge. Ya gwa gị ụdị ihe a, eburula ya iwe n’obi ma ọ bụkwanụ kwuo na ị gaghị eghe ya ọnụ. Gbalịa ghọta ihe mere o ji kwuo ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, ya gwa gị na ị naghị ege ya ntị, o nwere ike ịbụ na ihe o bu n’obi bụ na ị naghị anabata aro ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 14:29.

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị jiri otu obi na-eme ihe

Ejila olu ike agwa ya okwu. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga na-esekarị okwu ma ọ bụrụ na ị na-asa ya okwu. Ma, i nwere ike ime ka gị na ya ghara ịna-esekarị okwu. Olee otú ị ga-esi eme ya? Otu akwụkwọ kwuru ihe abụọ i nwere ike ime ma iwe bịa ya. Nke mbụ bụ iwetu olu ala mgbe ị na-agwa ya okwu. Nke abụọ abụrụ ịnabata aro ọ tụrụ. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, obi ga-ajụrụ ya. Ọ ga-arakwa ahụ́ gị na ya esewe okwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 26:20.

Achọla naanị ọdịmma onwe gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Ọ bụrụ gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eji otu obi eme ihe, ọ ga-esi ike ihe o kwuru ewee gị iwe. Gị na ya agaghịkwa na-esekarị okwu. Ọ gaghịkwa abụ unu setụ okwu, gị akwụsị ighe ya ọnụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 7:9.

Ọ bụrụ na ọ na-abụ mmadụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya see okwu, ya akwụsị ighe ya ọnụ, ya mara na ya anaghị eme ihe a Baịbụl kwuru ná Ndị Efesọs 5:33. Ebe ahụ sịrị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” Í cheghị na ọ ga-aka mma ma unu kpebie na o nweghị ihe ga-eme ka unu ghara ighe ibe unu ọnụ?