Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ichebe Ụmụ Nwaanyị—Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ya

Ichebe Ụmụ Nwaanyị—Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ya

 A na-emegbu ọtụtụ nde ụmụ nwaanyị n’ụwa niile. Ì so ná ndị a na-emegbu? Chọpụta ihe mere Chineke ejighị ihe gbasara ichebe ụmụ nwaanyị egwu egwu nakwa ihe ọ ga-eme gbasara mmegbu a na-emegbu ha.

 “Mgbe m dị obere, nwanne m nwoke na-akụtara m isi aba okpu, na-agwakwa m okwu ọjọọ kwa ụbọchị. Mgbe m lụrụ di, nne di m malitere ebe nwanne m nwoke kwụsịrị. Ya na nna di m nọ na-eme m ka m bụ ohu. E nwere oge ndị m chọrọ igbu onwe m.”​—Madhu, a onye India.

 Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na “Ịrụsa ụmụ nwaanyị arụrụala juru ebe niile n’ụwa.” Òtù a na-ekwu na ọ ga-abụ na e nwetụla mgbe a rụsara otu onye n’ime ụmụ nwaanyị atọ ọ bụla arụrụala ma ọ bụkwanụ dinaa ya n’ike.

 Ọ bụrụ na ụdị ihe a emetụla gị, o nwere ike na-adị gị ka mmadụ ọ̀ ga-agwa gị okwu ọjọọ ma ọ bụ rụsa gị arụrụala ma ọ bụkwanụ dinaa gị n’ike ebe ọ bụla ị gara. N’ihi ụdị arụrụala a a na-arụsa ụmụ nwaanyị ma ọ bụ ụdị mmegbu a a na-emegbu ha, o nwere ike ịdị gị ka ọtụtụ ndị ‘E jighị ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe.’ Ma, Chineke ò ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe?

Baịbụl gosiri na Chineke ejighị ihe gbasara ichebe ụmụ nwaanyị egwu egwu

Olee otú Chineke si were ụmụ nwaanyị?

 Amaokwu Baịbụl : “[Chineke] kere ha nwoke na nwaanyị.”​—Jenesis 1:27.

 Ihe amaokwu a pụtara: Ọ pụtara na Chineke kere ụmụ nwoke, keekwa ụmụ nwaanyị. Ọ chọrọ ka a na-akwanyere ndị nke ọ bụla ùgwù. Ihe ọzọkwa bụ na ọ chọrọ ka di “hụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya,” ma ghara ịna-agwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ jiri aka ike na-agwa ya ihe ọ ga-eme. (Ndị Efesọs 5:33; Ndị Kọlọsi 3:19) N’eziokwu, Chineke ejighị ihe gbasara ichebe ụmụ nwaanyị egwu egwu.

 “Mgbe m dị obere, ndị ikwu anyị na-edina m. Mgbe m dị afọ iri na asaa, onye m na-arụrụ ọrụ kwuru na ọ ga-achụ m n’ọrụ ma ọ bụrụ na mụ ekweghị ka mụ na ya nwee mmekọahụ. Ugbu a m torola, ma di m ma ndị mụrụ m ma ndị agbata obi anyị na-akparị m. Ma m mechara mụta gbasara Jehova, b bụ́ Onye kere ihe niile. Ọ na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù. Ihe a mere ka obi sie m ike na ọ hụrụ m n’anya nakwa na o ji m kpọrọ ihe.”​—Maria, onye Ajentina.

Ihe nwere ike inyere gị aka ka inweta onwe gị

 Amaokwu Baịbụl: “E nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya.”​—Ilu 18:24.

 Ihe amaokwu a pụtara: Ọ pụtara na ezigbo enyi ga-enyere gị aka. Kọọrọ onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị ma ọ bụrụ na i chere na ọ ga-enyere gị aka.

 E nweghị onye ọ bụla m gwara na e dinara m n’ike ruo afọ iri abụọ. N’ihi ya, anaghị m enwe obi ụtọ, obi anaghị eru m ala, ike ụwa gwụkwara m. Ma mgbe m mechara kọọrọ onye ga-aghọta otú obi dị m ihe ndị mere m, ọ dịzi m nnọọ ka è nwere ibu e si n’ubu m bupụ.”​—Elif, onye Türkiye.

 Amaokwu Baịbụl: “Na-akọrọnụ [Chineke], ihe niile na-echegbu unu, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​—1 Pita 5:7.

 Ihe amaokwu a pụtara: Chineke na-ege ntị n’ekpere gị. (Abụ Ọma 55:22; 65:2) Ọ ga-enyere gị aka ịghọta na ị bara uru n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.

 “Ịmụta gbasara Jehova nyeere m aka ịna-enweta onwe m n’ihe ndị mere m n’oge gara aga. M nweziri ike ikpe ekpere ugbu a kọọrọ Chineke otú obi dị m. Ọ dị ka enyi na-aghọta nnọọ otú obi dị m.”​—Ana, onye Beliiz.

È nwere mgbe Chineke ga-akwụsị mmegbu a na-emegbu ụmụ nwaanyị?

 Amaokwu Baịbụl: “Jehova . . . ga-ekpere ụmụ na-enweghị nna na ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, ka mmadụ efu ọ bụla nọ n’ụwa wee ghara ime ka ha tụọ egwu ọzọ.”​—Abụ Ọma 10:17, 18.

 Ihe amaokwu a pụtara: Chineke ga-akwụsị ụdị mmegbu niile n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-akwụsịkwa imekpọ ụmụ nwaanyị ọnụ na imeso ha ihe n’ike.

 Ịmụta na Jehova ga-akwụsị mmegbu niile a na-emegbu ụmụ nwaanyị n’oge na-adịghị anya dị m nnọọ ka ọgwụ na-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma. O meela ka obi ruo m ala.”​—Roberta, onye Meziko.

 Ị chọọ ịmatakwu otú Baịbụl si eme ka anyị nwee olileanya, ihe mere obi ga-eji sie gị ike na nkwa ndị dị na ya ga-emezu na otú Ndịàmà Jehova si eji Baịbụl enyere ndị mmadụ aka taa, gwa anyị ka anyị chọta gị.

 Were isiokwu a n’ụdị nke i nwere ike ibipụta ebipụta.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?