Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ilbusca/E+ via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Enweghị Ike Ime Ka Udo Dịrị n’Ụwa?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Enweghị Ike Ime Ka Udo Dịrị n’Ụwa?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Ndị ọchịchị ụwa na òtù dị iche iche zuru ụwa ọnụ enwebeghị ike ime ka udo dịrị n’ụwa. Kemgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, e nwetụbeghị mgbe ọzọ a na-alụ agha n’ebe dị iche iche n’ụwa otú a na-alụ ya taa. A gụkọta ndị niile bi n’ebe ndị a na-alụ agha, ha dị ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ, nke bụkwanụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa.

 Gịnị mere ndị mmadụ agaghị emeli ka udo dịrị n’ụwa? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ihe atọ mere na ndị mmadụ agaghị emeli ka udo dịrị n’ụwa

  1.  1. Ndị mmadụ na-akpa àgwà ndị na-anaghị ekwe ha ịgba mbọ ka udo dị. Baịbụl buru amụma na n’oge anyị a, “ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, . . . ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, . . . ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, . . . ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi.”​—2 Timoti 3:2-4.

  2.  2. E keghị ụmụ mmadụ otú ha ga-akwụsịli ihe ndị na-enye ha nsogbu n’onwe ha, Onye kere ha, bụ́ Jehova a Chineke, aghara inyere ha aka. Baịbụl kwuru na “mmadụ enweghịkwa ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.”​—Jeremaya 10:23.

  3.  3. Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu, onye dị ike, obi tara mmiri, na-achị ụwa a. Ọ bụkwa ya “na-eduhie ụwa niile.” (Mkpughe 12:9) Ebe ọ bụ na “ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ,” ọgba aghara ga-adị n’ụwa, a na-alụkwa agha.​—1 Jọn 5:19.

Ònye ga-eme ka udo dịrị n’ụwa?

 Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ọ bụ Chineke ga-eme ka udo dị, ọ bụghị ụmụ mmadụ.

  •   “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu. M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.’”​—Jeremaya 29:11.

 Olee otú Chineke ga-esi mezuo nkwa a o kwere? “Chineke, onye na-eme ka anyị nwee udo, ga-azọpịa Setan.” (Ndị Rom 16:20) Chineke ga-eji ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị mee ka udo dị ebe niile n’ụwa. Baịbụl kpọrọ ọchịchị ahụ “Alaeze Chineke.” (Luk 4:43) Jizọs Kraịst, bụ́ Eze nke Alaeze ahụ, chịwa, a ga-akụziri ndị mmadụ otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo.​—Aịzaya 9:6, 7.

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.