Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

CreativeDesignArt/DigitalVision Vectors via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Agbụrụ Niile Hà Ga-emecha Hara?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Agbụrụ Niile Hà Ga-emecha Hara?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Ọtụtụ ndị na-eche na e nweghị ihe ga-eme ka agbụrụ niile hara.

  •   Odeakwụkwọ Ukwu Òtù Mba Ụwa aha ya bụ António Guterres kwuru, sị: “N’ebe niile n’ụwa, ndị kpọrọ ndị ọzọ asị n’ihi agbụrụ ha na-akpatara ụlọ ọrụ dị iche iche, òtù dị iche iche, na ndị dị iche iche nsogbu. Àgwà a ha na-akpa na-eme ka a na-ele agbụrụ ụfọdụ anya ka hà ka ibe ha.”

 Agbụrụ niile hà ga-emecha hara? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Ihe bụ́ uche Chineke banyere agbụrụ niile ịha

 Baịbụl na-akụziri anyị otú Chineke si ele agbụrụ dị iche iche anya.

  •   [Chineke] sikwa n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị.”​—Ọrụ Ndịozi 17:26.

  •   “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”​—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

 Baịbụl na-egosi na mmadụ niile si n’otu ezinụlọ nakwa na Chineke na-anabata agbụrụ niile.

Otú agbụrụ niile ga-esi mechaa hara

 Alaeze Chineke, ya bụ, ọchịchị dị n’eluigwe ga-eme ka agbụrụ niile hara. Ọchịchị ahụ ga-akụziri ndị mmadụ otú dị mma ha ga-esi na-emeso ndị ọzọ. Ndị mmadụ ga-amụta otú ha ga-esi kwụsị ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ asị.

  •   “Ndị bi n’ụwa ga-amụta ime ezi omume.”​—Aịzaya 26:9.

  •   Ezi omume a ga na-eme ga-eme ka udo dị, meekwa ka ebe niile dị jụụ, obi eruokwa onye ọ bụla ala ruo mgbe ebighị ebi.”​—Aịzaya 32:17.

 Taa, Baịbụl na-akụziri nde kwuru nde mmadụ otú ha ga-esi na-asọpụrụ ndị ọzọ ma na-akwanyere ha ùgwù.