Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

O Kweghị Ka Ụjọ na Obi Abụọ Mee Ka Ọ Kwụsị Iso Kraịst

O Kweghị Ka Ụjọ na Obi Abụọ Mee Ka Ọ Kwụsị Iso Kraịst

1-3. Olee ihe ndị Pita hụrụ mere n’otu ụbọchị, oleekwa otú ihe si gaa n’abalị ya?

PITA jidesiri ụmara ụgbọ ya ike ma na-ele anya ka ọ hụ ihe na-eme n’ọchịchịrị ahụ. Ihe ahụ ọ na-ahụ n’ebe ọwụwa anyanwụ ọ̀ bụ ìhè na-egosi na chi emechaala bọwa? Azụ na ubu na-egbu ya mgbu n’ihi ụgbọ ọ kwọrọla ọtụtụ awa. Ikuku nke na-ekusasị ntutu isi ya emeela ka e nwee oké ebili mmiri n’Oké Osimiri Galili. Ebili mmiri nọ na-akụ n’ihu ụgbọ ahụ, na-efesa Pita mmiri oyi n’ahụ́. Ma, ọ nọgidere na-akwọ ụgbọ ya.

2 Pita na ndị ibe ya hapụrụ Jizọs n’ikpere mmiri. N’ụbọchị ahụ, ha ahụla ka Jizọs ji ogbe achịcha ole na ole na azụ̀ nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ. Nke ahụ mere ka ndị mmadụ chọọ ime Jizọs eze. Ma ọ chọghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ chọkwara ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara inwe mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe Jizọs hapụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ gawa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ, ya agawakwanụ n’elu ugwu ikpe ekpere.—Mak 6:35-45; gụọ Jọn 6:14-17.

3 Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs banyere n’ụgbọ ahụ, ọnwa ka na-eti. Ugbu a, ọnwa jizi nwayọọ nwayọọ na-alakpu n’ebe ọdịda anyanwụ. Ma, ọ ka bụ kilomita ole na ole ka ha kwọrọla ụgbọ. Otú ha si na-akwọsi ụgbọ ha ike na mkpọtụ ifufe na ebili mmiri nọ na-eme ekwechaghị ha kparịta ụka. O nwere ike ịbụ na Pita nọ na-atụgharị uche.

O nweela ọtụtụ ihe Pita mụtara n’ihe dị ka afọ abụọ ya na Jizọs nọrọla, ma ọ nwere ọtụtụ ihe ọ ka ga-amụta

4. Olee ihe Pita gbalịsiri ike ka o mee nke mere o ji bụrụ onye anyị kwesịrị iṅomi?

4 Pita nwere ọtụtụ ihe ọ ga-echebara echiche. O soola Jizọs onye Nazaret ihe dị ka afọ abụọ. Ọ mụtala ọtụtụ ihe, ma o nwere ọtụtụ ihe ọ ka ga-amụta. Ebe ọ bụ na Pita nwere mmasị ịmụta ihe ma na-agbalịsi ike ka ọ kwụsị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ, anyị kwesịrị iṅomi ya. Ka anyị hụ ihe mere anyị ji kwesị iṅomi ya.

“Anyị Ahụwo Mesaya Ahụ”

5, 6. Olee ụdị ọrụ Pita na-arụ?

5 Pita agaghị echefu ụbọchị mbụ ọ hụrụ Jizọs. Andru nwanne ya nwoke ziri ya ozi tụrụ ya n’anya. Ọ sịrị ya: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ.” Ihe a o kwuru mere ka ihe malite ịgbanwe ná ndụ Pita. Ọ ga-agbanwekwa ndụ ya kpamkpam.—Jọn 1:41.

6 Pita bi n’obodo Kapaniọm nke dị n’akụkụ ọdọ mmiri a na-akpọ Oké Osimiri Galili. A na-aṅụ mmiri osimiri a aṅụ. Ya na Andru, Jems na Jọn, bụ́ ụmụ Zebedi, gbakọrọ aka na-akụ azụ̀. Pita na nwunye ya na nne nwunye ya nakwa nwanne ya nwoke, bụ́ Andru, bi. Onye na-akụ azụ̀ ma nwee ezinụlọ buru ibu otú a ga-enwe ume, na-arụsi ọrụ ike ma mara ọrụ ịkụ azụ̀ nke ọma ma ọ bụrụ na ọ ga na-akpa afọ ezinụlọ ya. Weregodị ya na ị na-ahụ ndị ikom ahụ ka ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ọtụtụ abalị, na-awụba ụgbụ ha n’ọdọ mmiri ahụ n’agbata ụgbọ mmiri abụọ ha ji ma na-adọpụta ihe ọ bụla banyere n’ụgbụ ha. Werekwa ya na ị na-ahụ ha ebe ha na-arụsi ọrụ ike mgbe chi bọrọ, na-ahọsị azụ̀ ndị ha gbutere, na-ere ha, na-asacha ụgbụ ha ma na-edozi ebe ndị mebiri emebi.

7. Gịnị ka Pita nụrụ banyere Jizọs, gịnịkwa mere ozi ahụ ga-eji tọọ Pita ụtọ?

7 Baịbụl kwuru na Andru bụ onye na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim. O doro anya na Pita na-ege Andru ntị nke ọma mgbe ọ na-akọrọ ya banyere ozi Jọn na-ezisa. Otu ụbọchị, Andru hụrụ ka Jọn tụrụ Jizọs onye Nazaret aka ma kwuo, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke!” Andru ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs ozugbo ahụ ma mee ngwa ngwa gaa kọọrọ Pita ihe a ga-eme ya obi ụtọ. Ọ gwara ya na ya ahụla Mesaya ahụ. (Jọn 1:35-40) Ihe dị ka puku afọ anọ tupu oge Pita, mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova Chineke isi n’Iden, Jehova kwere nkwa na ya ga-ezite onye pụrụ iche nke ga-anapụta ụmụ mmadụ. (Jen. 3:15) Andru ahụla onye a ga-anapụta ụmụ mmadụ, bụ́ onye a na-akpọ Mesaya. Pita jikwa ọsọ gaa ka ọ hụ Jizọs.

8. Gịnị ka aha Jizọs gụrụ Pita pụtara, gịnịkwa mere ụfọdụ ndị ji ekwu na e kwesịghị ịgụ Pita aha ahụ?

8 Ihe a na-akpọ Pita n’oge ahụ bụ Saịmọn ma ọ bụ Simiọn. Ma Jizọs lere ya anya, sị: “‘Ị bụ Saịmọn nwa Jọn; a ga-akpọ gị Sifas’ (nke bụ́ Pita ma a sụgharịa ya).” (Jọn 1:42) Ihe “Sifas” pụtara bụ “okwute,” ma ọ bụ “nkume.” O doro anya na Jizọs na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ ma na Pita ga-adị ka nkume, ya bụ, na Pita ga-esi ike n’okwukwe ma bụrụ a kwaa akwụrụ. Ọ ga-enyekwara ndị ibe ya aka. Pita ò chere na okwukwe ya siri ike nke otú ahụ? Ọ ga-abụ na Pita echeghị otú ahụ. Ụfọdụ ndị na-agụ Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn n’oge a ahụdịghị ihe mere a ga-eji kpọọ Pita nkume. Ụfọdụ ndị ekwuola na ihe Baịbụl kwuru gbasara Pita dị ka ọ̀ na-egosi na ọ bụ onye na-akwụsighị ike n’ihe, onye na-anaghị emeli mkpebi n’onwe ya, na onye na-enwekarị obi abụọ.

9. Olee ihe Jehova na Jizọs na-achọ ịhụ, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị ha obi?

9 Pita nwere ebe ndị ọ na-anaghị eme nke ọma. Jizọs makwa. Ma, ihe Jizọs na-achọ ịhụ mgbe niile bụ ebe ndị anyị na-eme nke ọma. Otú ahụkwa ka ọ dị Nna ya bụ́ Jehova. Jizọs hụrụ na Pita nwere ọtụtụ àgwà ọma, ọ chọkwara inyere ya aka ka ọ na-akpa àgwà ọma ndị ahụ. Jehova na Ọkpara ya na-achọkwa ịhụ ebe anyị na-eme nke ọma. O nwere ike isiri anyị ike ikweta na anyị nwere ọtụtụ àgwà ọma ndị ha na-ahụ. Ma, anyị kwesịrị ịtụkwasị ha obi na ha ma onye nwere àgwà ọma. Anyị kwesịkwara ikwe ka ha na-akụziri anyị ihe ma mee ka àgwà anyị na-aka mma otú ha meere Pita.—Gụọ 1 Jọn 3:19, 20.

“Kwụsị Ịtụ Egwu”

10. Olee ihe ndị ọ ga-abụ na Pita nọ mgbe Jizọs mere ha, n’agbanyeghị ihe ndị ahụ, olee ihe Pita mere?

10 O nwere ike ịbụ na Pita so Jizọs gaa ebe ụfọdụ ọ gara kwusaa ozi ọma mgbe ọ ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs. Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ọ nọ mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya, nke bụ́ ime ka mmiri ghọọ mmanya n’oriri agbamakwụkwọ e nwere na Kena. Nke ka nke bụ na ọ nụrụ ozi ọma Jizọs kwusara banyere Alaeze Chineke. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ hapụrụ Jizọs ma laghachi n’ọrụ ịkụ azụ̀ ya. Ma, mgbe ọnwa ole na ole gachara, Pita na Jizọs hụrụ ọzọ. Na nke ugbu a, Jizọs gwara Pita ka ọ hapụ ọrụ ya ma sowezie ya.

11, 12. (a) Olee ihe mere Pita mgbe ọ gara ọrụ n’abalị? (b) Olee ihe ọ ga-abụ na Pita nọ na-eche mgbe ọ na-ege Jizọs ntị?

11 N’abalị bọtara ụbọchị a ya na Jizọs hụrụ ọzọ, Pita na ndị ibe ya gara ịkụ azụ̀, ma ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya. Ha wụnyere ụgbụ ha na mmiri ọtụtụ ugboro, ma ọ dịghị otu azụ̀ ha gbutere. O doro anya na Pita mere ihe niile ọ mụtarala kemgbe ọ kụwara azụ̀ ka ha nwee ike gbute azụ̀. Ọ wụnyere ụgbụ ya n’ebe dị iche iche ka ọ chọta ebe azụ̀ nọ na-akpa nri n’ọdọ mmiri ahụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ọtụtụ ndị na-akụ azụ̀ ka ya bụrụ na ha ga-enyonye anya na mmiri hụ ebe azụ̀ juru ma mee ka ha banyejuo n’ụgbụ ha. O doro anya na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Pita n’abalị ahụ. Ma, iche ụdị ihe ahụ ga-eme ka obi jọkwuo ya njọ. Pita abịaghị ebe ahụ igwuri egwu. O nwere ndị ọ ga-eji azụ̀ ọ ga-egbute kpaa afọ ha. Ma, o mechara gbara aka pụta na mmiri ahụ. N’agbanyeghị nke a, ọ ga-asacha ụgbụ ya. Ọ bụzi mgbe ọ nọ na-asacha ụgbụ ya ka Jizọs bịakwutere ya.

O nweghị mgbe ike gwụrụ Pita ige Jizọs ntị mgbe ọ na-akụziri ha banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ isiokwu ozi ọma ya

12 N’ụbọchị ahụ, ìgwè mmadụ nọ na-adagide Jizọs, na-ege ntị n’ihe niile ọ na-agwa ha. Ebe ọ bụ na ha karịrị akarị, Jizọs banyere n’ụgbọ Pita ma gwa ya ka o si n’elu ala kwọrọ ụgbọ ahụ banyetụ n’ime mmiri. Jizọs nọ ebe ahụ kụziere ìgwè mmadụ ahụ ihe n’ihi na mmiri ahụ mere ka ha na-anụ olu ya nke ọma. Pita na ndị ahụ nọ n’ikpere mmiri gere Jizọs ntị nke ọma. O nweghị mgbe ike gwụrụ Pita ige Jizọs ntị mgbe ọ na-akụziri ha banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ isiokwu ozi ọma ya. Pita alaferela ma ọ bụrụ na ọ ga-eso Kraịst kwusaara ndị mmadụ ozi ọma a ga-eme ka ha nwee olileanya. Ma ọ̀ ga-emelinụ ya? Olee otú ọ ga-esi na-akpa afọ ezinụlọ ya? O nwere ike ịbụ na Pita chere echiche ọzọ banyere abalị ahụ ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ n’efu.—Luk 5:1-3.

13, 14. Olee ọrụ ebube Jizọs rụrụ nke baara Pita uru, oleekwa ihe Pita mere?

13 Mgbe Jizọs kwuchara okwu, ọ gwara Pita, sị: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu wee gbute azụ̀.” Pita nwere obi abụọ. Ọ sịrị: “Onye ozizi, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla, ma ebe i kwuru ya, aga m awụnye ụgbụ.” Ọ dịbeghị anya Pita sachara ụgbụ ya. O doro anya na Pita achọghị ịwụnye ụgbụ ahụ ọzọ na mmiri. Ugbu a abụkwanụghị mgbe azụ̀ ji akpa nri. N’agbanyeghị nke ahụ, o mere ihe Jizọs gwara ya. Ọ ga-abụkwa na ọ gwara ndị ibe ya nọ n’ụgbọ nke ọzọ ka ha soro ha.—Luk 5:4, 5.

14 Ụgbụ ahụ nyịwara Pita arọ n’aka mgbe ọ malitere ịdọlite ya. O juru ya anya, ya adọsiwekwuo ya ike ma hụ ka ọtụtụ azụ̀ na-agba lịka lịka n’ụgbụ ahụ. O feere ndị ibe ya nọ n’ụgbọ nke ọzọ aka ozugbo ka ha bịa nyere ya aka. Mgbe ha bịara, ha chọpụtara na azụ̀ niile ahụ agaghị aba n’otu ụgbọ. Ha kpojuru ụgbọ abụọ ahụ, ma n’ihi otú azụ̀ ndị ahụ si karịa akarị, ụgbọ ndị ahụ malitere imi. Ihe a enyeghị Pita ọnụ okwu. Ọ hụla ebe Kraịst ji ike ya rụọ ọrụ ebube. Ma, ọ bụ ya ka nke ugbu a baara uru. Ọ hụla onye nwere ike ime ka azụ̀ banye n’ụgbụ. Ụjọ jidere Pita. O gbusara ikpere n’ala ma kwuo, sị: “Onyenwe anyị, si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.” O chere na ya erughị eru iso Onye a ji ike Chineke arụ oké ọrụ.—Gụọ Luk 5:6-9.

“Onyenwe anyị, . . . abụ m onye mmehie”

15. Olee otú Jizọs si mee ka Pita mata na obi abụọ ọ na-enwe na ụjọ ọ na-atụ abaghị uru?

15 Jizọs medara obi gwa ya, sị: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:10, 11) Ugbu a abụghị oge inwe obi abụọ ma ọ bụ ịtụ ụjọ. Pita kwesịrị ilekwasị anya n’ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere ya. O kwesịghị inwewa obi abụọ ma ọ̀ ga na-akụtalikwa azụ̀ ọ ga-eji kpaa afọ ezinụlọ ya, o kwesịghịkwa ichewe na ya agaghị arụli ọrụ a, ya bụ, ikwusa ozi ọma. Jizọs nwere nnukwu ọrụ ọ ga-arụ. Ọrụ a ga-abara ụmụ mmadụ uru n’ọdịnihu. Ọ bụ Chineke ka Jizọs na-ejere ozi. Chineke a ‘na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha n’ụzọ dị ukwuu.’ (Aịza. 55:7) Ọ ga-egboro Pita mkpa ya niile, nyekwara ya aka ikwusa ozi ọma.—Mat. 6:33.

16. Olee otú Pita, Jems, na Jọn si mee ihe Jizọs gwara ha, oleekwa ihe mere ihe a ha kpebiri ime ji dị mma?

16 Pita mere ihe Jizọs gwara ya ozugbo, otú ahụkwa ka Jems na Jọn mere. Baịbụl sịrị: “Ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala. Ha gbahapụkwara ihe niile ma soro ya.” (Luk 5:11) Pita nwere okwukwe na Jizọs nakwa n’Onye zitere ya. Ihe a o kpebiri ime amaka. E nwekwara Ndị Kraịst taa ndị kwụsịrị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ. Ihe a ha mere emeela ka ha nwee ike ịna-ejere Chineke ozi. O gosikwara na ha nwere okwukwe. Jehova agaghị ekwe ka ihere mee ndị tụkwasịrị ya obi.—Ọma 22:4, 5.

“Gịnị Mere I Ji Nwewe Obi Abụọ?”

17. Olee ihe ndị Pita chetara mere n’ihe dị ka afọ abụọ ya na Jizọs matara?

17 Ọ bụ ihe dị ka afọ abụọ Pita matachara Jizọs ka ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a mere. Pita kwọ ụgbọ na-aga n’Oké Osimiri Galili n’abalị ahụ oké ifufe na-efe. N’eziokwu, anyị amaghị ihe ndị o chere n’echiche n’abalị ahụ. O nwere ọtụtụ ihe o nwere ike iche. Jizọs agwọọla nne nwunye ya, nọrọ n’elu ugwu zie ìgwè mmadụ ihe. Jizọs ejirikwala ozizi ya na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosi na ya bụ Onye Jehova họpụtara, ya bụ, Mesaya ahụ. Mgbe ọtụtụ ọnwa gafere, o doro anya na ụjọ Pita na-atụ na obi abụọ ọ na-enwe akwusịlatala. Jizọs họdịịrị Pita ka ọ bụrụ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ya. Ma, n’oge na-adịghị anya, Pita ga-amata na ya akwụsịchabeghị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ.

18, 19. (a) Kọwaa ihe Pita hụrụ n’Oké Osimiri Galili. (b) Olee otú Jizọs si mee ihe Pita rịọrọ ya?

18 N’oge nche nke anọ n’abalị ahụ, ya bụ, ihe dị ka n’agbata elekere atọ nke isi ụtụtụ na mgbe anyanwụ malitere ịwa, Pita kwụsịrị ịkwọ ụgbọ na mberede ma nọrọ kwem n’ebe ọ nọ ọdụ. Ọ hụrụ na e nwere ihe na-agafenụ n’osimiri ahụ ebili mmiri na-enugharị. Ọ̀ ga-abụ ìhè ọnwa nke na-enwu n’ebili mmiri ahụ? Mbanụ! Ihe ọ na-ahụ guzo kwem, o kwekwaghị apụ apụ n’anya ya. Ọ bụ mmadụ, ọ na-ejekwa ije n’elu oké osimiri. Ka onye ahụ na-erute nso, o yiri ka ọ̀ na-abịa ịgafe ha. Ndị na-eso ụzọ Jizọs tụrụ ụjọ ma chee na ọ bụ onyinyo ụgha. Onye ahụ kwuru okwu, sị: “Nweenụ obi ike, ọ bụ m; unu atụla egwu.” Ọ bụ Jizọs.—Mat. 14:25-28.

19 Pita kwuru, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” Ihe mbụ gbatara Pita n’uche ime bụ ime ihe ga-egosi na o nwere obi ike. Ebe ọ bụ na ọrụ ebube a Pita hụrụ masịrị ya, ọ chọwara otú ọ ga-esi mee ka okwukwe ya sikwuo ike. Ọ chọrọ iso Jizọs jee ije n’elu mmiri. Jizọs sịrị ya bịa. Pita si n’akụkụ ụgbọ ahụ rịdata ma zọnye ụkwụ n’oké osimiri ahụ ebili mmiri na-enugharị. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Pita zọnyere ụkwụ na mmiri ahụ, ma ụkwụ ya emighị, ya eguzoro ọtọ n’elu mmiri ma gawa ije. Ọ ga-abụ na o juru ya anya na ya na-eje ije n’elu mmiri na-agakwuru Jizọs. Ma n’oge na-adịghị anya, ihe ọzọ batara ya n’obi.—Gụọ Matiu 14:29.

“Mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya”

20. (a) Olee ihe megharịrị Pita anya, oleekwa ihe ọ kpataara ya? (b) Olee ihe dị mkpa Jizọs ji ihe a merenụ kụziere Pita?

20 Pita kwesịrị ilegide Jizọs anya. Ọ bụ Jizọs ji ike Jehova nyere ya mee ka Pita na-eje ije n’elu mmiri. Ihe mekwaranụ Jizọs ji mee ya bụ na Pita nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Ma, uche Pita pụrụ n’ebe Jizọs nọ. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya.” Mgbe Pita lere anya hụ otú ebili mmiri ahụ si na-akụ n’ụgbọ ahụ ma na-awụli mmiri elu, na-agbọkwa ụfụfụ, ụjọ tụrụ ya. O nwere ike ịbụ na ọ bịaziri dị ya ka ọ̀ na-emikpu n’ime mmiri ahụ, mmiri erie ya. Ihe a mere ka ụjọ tụsiwe ya ike, okwukwe ya amalite ịnyụ ka ọkụ. Ebe ọ bụ na okwukwe ya esizighị ike, nwoke a a kpọrọ Nkume maka na ọ bụ a kwaa akwụrụ malitere imikpu n’ime mmiri ka okwute. Pita bụ aka ochie n’igwu mmiri. Ma na nke ugbu a, ọ sịghị ka ya gwupụtawa n’onwe ya. O tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” Jizọs jidere Pita aka ma dọpụta ya. Mgbe Jizọs na Pita ka nọ n’elu mmiri ahụ, ọ kụziiri Pita otu ihe dị mkpa. Ọ sịrị ya: “Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”—Mat. 14:30, 31.

21. Gịnị mere inwe obi abụọ ji jọgbuo onwe ya, gịnịkwa ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-enwe obi abụọ?

21 Ajụjụ ahụ ọ jụrụ Pita dabara adaba, ya bụ, “Gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?” Obi abụọ nwere ike imebiri mmadụ ihe. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe obi abụọ, o nwere ike ime ka okwukwe anyị gharazie isi ike, meekwa ka anyị na Chineke ghara ịdịkwa ná mma. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-enwe obi abụọ. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Otú anyị ga-esi eme ya bụ ime ka uche anyị dịrị n’ihe kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe na-emenye anyị ụjọ, ihe na-akụda anyị obi, na ihe ga-eme ka uche anyị pụọ n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ, anyị ga na-enwekwu obi abụọ. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere Jehova na Ọkpara ya, ihe ha meerela anyị, ihe ha na-emere anyị ugbu a, na ihe ha ka ga-emere ndị hụrụ ha n’anya, anyị ga-akwụsị inwe obi abụọ.

22. Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi okwukwe Pita?

22 Ka Pita so Jizọs banyeghachi n’ụgbọ ahụ, ọ hụrụ ka oké ifufe ahụ kwụsịrị. Oké Osimiri Galili dara jụụ. Pita na ndị na-eso ụzọ ibe ya gwaziri Jizọs, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.” (Mat. 14:33) O doro anya na obi ga na-atọ Pita ụtọ mgbe chi bọrọ n’ụbọchị ahụ. Ọ mụtala na ya ekwesịghị ikwe ka ụjọ mee ka o nwewe obi abụọ. N’eziokwu, ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-agbanwe ná ndụ ya tupu ya aghọọ Onye Kraịst nke yiri nkume ahụ Jizọs kpọrọ ya. Ma o kpebisiri ike na ya ga-agbalị na-emekwu nke ọma. Ì kpebiela ime ka ya? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-achọpụta na iṅomi okwukwe Pita bara uru.