Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 01

Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Gị Aka?

Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Gị Aka?

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ niile na-ajụ ajụjụ gbasara ndụ anyị dị, ahụhụ anyị na-ata, ọnwụ, na ihe echi ga-abụ. Ihe ọzọ na-echu anyị ụra bụ ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị, dị ka otú anyị ga-esi na-akpa afọ anyị na otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Ọtụtụ ndị achọpụtala na Baịbụl zara ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa gbasara ndụ nakwa na o kwuru ihe ndị ga-abara ha ezigbo uru gbasara ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. È nwere onye ị ma Baịbụl nwere ike inyere aka?

1. Olee ụfọdụ ajụjụ Baịbụl zara?

Baịbụl zara ajụjụ ndị a dị ezigbo mkpa: Olee otú ndụ si malite? Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? Gịnị mere ndị aka ha dị ọcha ji ata ahụhụ? Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ? Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ udo, gịnị mere e ji alụ agha ebe niile? Gịnị ga-eme ụwa n’ọdịnihu? Baịbụl gwara anyị ka anyị gbaa mbọ mata azịza ajụjụ ndị a. Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtakwala na ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ ndị a bụ eziokwu.

2. Olee otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ka ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị na-atọ anyị ụtọ?

Baịbụl na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Ọ na-agwakwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị nakwa ihe anyị ga-eme ka ọrụ anyị na-atọ anyị ụtọ. Ị ga-amata ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị a na ihe ndị ọzọ ka anyị na-amụ akwụkwọ a. Ọ ga-abịa doo gị anya na ‘ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ [ya bụ, na Baịbụl] bara uru.’2 Timoti 3:16.

Akwụkwọ a anọchighị Baịbụl. Kama, ọ ga-enyere gị aka ka ị mụọ Baịbụl n’onwe gị. N’ihi ya, gbalịa gụọ amaokwu Baịbụl ndị e depụtara n’akwụkwọ a. Ha ga-enyere gị aka ịna-echebara ihe ndị ị na-amụ echiche.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú Baịbụl sirila nyere ndị mmadụ aka na otú ọ ga-esi na-atọ gị ụtọ ma ị na-agụ ya. Chọpụtakwa ihe mere o ji dị mma ka ndị ọzọ nyere gị aka ịghọta ya.

3. Baịbụl ga-eduzili gị

Baịbụl yiri ìhè na-enwu gbaa. O nwere ike inyere anyị aka ịma ihe dị mma anyị ga-eme nakwa ịmata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

Gụọnụ Abụ Ọma 119:105. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú onye dere abụ ọma a si were Baịbụl?

  • Olee otú gịnwa si were Baịbụl?

4. Baịbụl ga-azali ajụjụ ndị anyị na-ajụ

E nwere otu nwaanyị Baịbụl zara ajụjụ ndị nọ na-echu ya ụra kemgbe ọtụtụ afọ. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ajụjụ ndị nwaanyị a anyị lere na vidio a nọ na-ajụ?

  • Olee otú ịmụ Baịbụl si nyere ya aka?

Baịbụl gwara anyị ka anyị na-ajụ ajụjụ. Gụọnụ Matiu 7:7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ajụjụ ndị ị na-amaghị azịza ha, ndị ọ ga-abụ na Baịbụl zara?

5. Ịgụ Baịbụl ga-atọli gị ụtọ

Ịgụ Baịbụl na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ. Ọ na-abakwara ha uru. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ịgụ ihe na-adịbu ndị na-eto eto anyị lere na vidio a?

  • Ma, gịnị mere ịgụ Baịbụl anaghịzi adị ha otú ahụ?

Baịbụl kwuru na ihe anyị ga-agụta na ya ga-akasi anyị obi, meekwa ka anyị nwee olileanya. Gụọnụ Ndị Rom 15:4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Obi ọ̀ dị gị ụtọ ná nkwa a Baịbụl kwere na ọ ga-akasi anyị obi ma mee ka anyị nwee olileanya?

6. Ndị ọzọ ga-enyeliri anyị aka ịghọta Baịbụl

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl n’onwe ha, ma, ha achọpụtala na ha na ndị ọzọ ikwurịta ya na-enyere ha aka ịghọta ya. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 8:26-31. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

Tupu otu nwoke Etiopia aghọta ihe ọ nọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ, mmadụ nyeere ya aka. Taakwa, ọtụtụ ndị na-amụta ihe na-abara ha uru na Baịbụl ma ha na ndị ọzọ mụkọọ ya ọnụ

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ịmụ Baịbụl bụ igbu oge.

  • Mmadụ kwuo ụdị ihe a, gịnị ka ị ga-agwa ya? Maka gịnị?

NCHỊKỌTA

Baịbụl gwara anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ kwa ụbọchị. Ọ zara ajụjụ ndị dị mkpa anyị na-ajụ. Ọ na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị nwee olileanya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee ụdị ndụmọdụ Baịbụl na-enye anyị?

  • Olee ụfọdụ ajụjụ Baịbụl zara?

  • Olee ihe ị ga-achọ ịmụta na Baịbụl?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta otú ihe Baịbụl kwuru si abara anyị uru n’oge a.

“Ihe Baịbụl Kwuru, Oge Ha Ọ̀ Gafeela” (Ụlọ Nche Nke 1 2018)

E nwere otu nwoke obi na-ajọ njọ malite mgbe ọ bụ nwata. Lee otú Baịbụl si nyere ya aka.

Otú M Si Malite Inwe Obi Ụtọ ná Ndụ (2:53)

Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na-abara ezinụlọ uru.

“Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ” (Teta! Nke 2 2018)

Ọtụtụ ndị amaghị onye ọ bụ ya n’eziokwu na-achị ụwa. Lee otú Baịbụl si mee ka onye na-achị ụwa doo anya.

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? (3:14)